Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

Olee Ndị Rụrụ Ọrụ A?

1. Olee ndị ọkụ azụ̀ abụọ bụ́ ụmụ Zebedi, bụrụkwa ndịozi Jizọs?

Dee azịza ya n’okpuru ebe a.

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 4:21, 22.

․․․․․

2. Gịnị bụ aha ndịozi abụọ ọzọ bụ́kwa ndị ọkụ azụ̀?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 4:18.

․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ “ndị na-akụta mmadụ”? (Matiu 4:19) Olee otú ịkụ azụ̀ na ịkụta mmadụ si yie, oleekwa ihe dị iche na ha abụọ?

GỊNỊ KA Ị MA BANYERE ANDRU ONYEOZI?

3. Tupu Andru aghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ònye ka ọ bụ onye na-eso ụzọ ya?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Mak 1:4; Jọn 1:35-40.

․․․․․

4. Ònye ka Andru kọọrọ banyere Jizọs, gịnịkwa mechara mee?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Jọn 1:40-42.

․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere o ji dị mma ịkọrọ ndị ikwu gị ihe ị ma banyere Jizọs? Ma, olee otú ụfọdụ ndị ikwu gị nwere ike isi were ihe ị kọọrọ ha?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 10:32-37.

SITE NA MAGAZIN A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ya.

PEEJI NKE 3 Gịnị ka onye nwere uche na-eme? Ilu 14:․․․

PEEJI NKE 8 Olee aha Chineke nyere onwe ya? Aịzaya 42:․․․

PEEJI NKE 18 Gịnị ka “iwe iwe na-akpata”? Ilu 30:․․․

PEEJI NKE 22 Gịnị ka e mere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi? Jud:․․․

AZỊZA

1. Jems na Jọn.

2. Pita na Andru.

3. Jọn onye na-eme Baptizim.

4. Nwanne ya bụ́ Pita, o mechakwara ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.