Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú Ndịàmà Jehova si akụzi Baịbụl?

Olee otú Ndịàmà Jehova si akụzi Baịbụl?

Olee otú Ndịàmà Jehova si akụzi Baịbụl?

Ha na-akụzi ya n’isiokwu n’isiokwu, ọ na-abụkarịkwa akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ka ha na ndị mmadụ ji amụ Baịbụl. Isiokwu ndị e depụtara n’okpuru ebe a bụ ụfọdụ n’ime isiokwu iri na itoolu dị n’akwụkwọ ahụ:

“Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?”

“Ònye Bụ Jizọs Kraịst?”

“Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?”

“Ànyị Na-ebi ‘n’Ụbọchị Ikpeazụ’?”

“N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?”

“Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ”

Ha na-agba ndị ha na ha na-amụ Baịbụl ume ka ha na-ajụ ajụjụ, ha na-egosikwa ha ebe Baịbụl zara ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụzi ihe ndị ahụ mụtara na Baịbụl ga-enyere ha aka iji aka ha kpebie okpukpe ha ga-ekpewe.

Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ a e sere n’ebe a.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.