Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú mụ na ụmụnne m ga-esi na-ebi n’udo?

Olee otú mụ na ụmụnne m ga-esi na-ebi n’udo?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee otú mụ na ụmụnne m ga-esi na-ebi n’udo?

Olee otú gị na nwanne gị nke ọ bụla dịruru ná mma?

․․․․․ Anyị bụ ezigbo enyi

․․․․․ Anyị anaghị esekarị okwu

․․․․․ Anyị na-agbalị ka anyị ghara ịna-esekarị okwu

․․․․․ Anyị na-ese okwu mgbe ọ bụla

E NWERE ndị ha na ụmụnne ha dị n’ezigbo mma. Dị ka ihe atụ, Felicia, onye dị afọ iri na itoolu kwuru, sị: “Nwanne m nwaanyị aha ya bụ Irena, onye dị afọ iri na isii, bụ otu n’ime ezigbo ndị enyi m.” * Carly, onye dị afọ iri na asaa, kwuru banyere nwanne ya nwoke dị afọ iri abụọ, sị: “Mụ na ya na-adị n’ezigbo mma. Anyị esetụbeghị okwu.”

Ma, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ ha na ụmụnne ha na-eme ka Lauren na Marla. Lauren kwuru, sị: “O nweghị ihe na-anaghị esere mụ na Marla okwu, ma ihe na-enweghị ihe ọ bụ.” E nwekwara ndị ọ dị otú ọ dị Alice, onye dị afọ iri na abụọ. Alice kwuru banyere nwanne ya nwoke dị afọ iri na anọ, aha ya bụ Dennis, sị: “Ọ na-akpasukarị m iwe! Ọ na-abata n’ime ụlọ m were ihe ọ bụla masịrị ya n’agwaghị m agwa. Dennis na-emecha nnọọ ka nwatakịrị!”

Ò nwere nwanne gị na-emekarị ihe na-ewe gị iwe? N’eziokwu, ọ bụ ndị mụrụ gị kwesịrị ịhụ na udo dị n’ụlọ unu. Ma, mee elu mee ala, i kwesịrị ịmụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-emekọ ihe n’udo. I nwere ike ịmụta ya ugbu a ị ka nọ n’ụlọ unu.

Chetagodị oge ndị gị na nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwaanyị sere okwu. Gịnị kacha seere unu okwu? Legodị ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a, kanye ✔ na nke ọ bụla seere unu okwu, ma ọ bụkwanụ dee ihe ọ na-abụ nwanne gị mee gị, ya ewee gị ezigbo iwe!

Ihe ndị bụ́ nke m. Nwanne m na-ewere ihe m n’agwaghị m agwa.

Àgwà ya. Nwanne m na-achọ naanị ọdịmma nke onwe ya, ọ naghị echebara ndị ọzọ echiche, ma ọ bụkwanụ ọ na-adị ya ka ọ̀ bụ ya ga na-atụrụ m ihe ọ bụla m na-eme.

Ihe ndị o kwesịrị ịnata m ikike. Nwanne m anaghị akụ aka abata n’ime ụlọ m, ọ na-agụ ozi iimel mụ ma ọ bụ ozi e ziteere m n’ekwe ntị n’agwaghị m agwa.

Ihe ọzọ. ․․․․․

Ọ bụrụ na nwanne gị na-akpasukarị gị iwe, eleghị anya na-achọ ka ọ bụrụ ya na-atụrụ gị ihe ọ bụla ị na-eme ma ọ bụ na-ewere ihe gị n’agwaghị gị agwa, o nwere ike isiri gị ike ịghara iburu ya iwe n’obi. Ma otu ilu Baịbụl sịrị: “Ọ bụ ịpịsi aka ike n’imi na-akpata ọzọimi, ọ bụkwa iwe iwe na-akpata esemokwu.” (Ilu 30:33) Ọ bụrụ na i buru iwe n’obi, o nwere ike ime ka unu see okwu otu ụbọchị otú ahụ mmadụ ịpịsi aka ike n’imi ya nwere ike ịkpatara onye ahụ ọzọimi. Unu see okwu, nsogbu ahụ ga-aka njọ. (Ilu 26:21) Gịnị ka ị ga-eme ka iwe a kpasuru gị ghara ibutere unu esemokwu? Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịchọpụta ihe kpatara nsogbu unu.

Esemokwu ka ọ̀ bụ ihe kpatara ya?

Esemokwu nwanne na nwanne dị ka etuto. Etuto na-etopụta n’elu ahụ́ mmadụ, ma ihe na-akpata ya dị n’ime ahụ́. Otú ahụ ka ọ dịkwa esemokwu nwanne na nwanne. Ọtụtụ mgbe esemokwu dị otú ahụ na-egosi na e nwere nsogbu ndị ọzọ na-akpata ya.

Etuto nwere ike ịla ma a pịpụ ya abụ. Ma naanị abụ ahụ ị pịpụrụ agaghị eme ka etuto ahụ ghara ito ọzọ, kama o nwere ike ime ka i nwee àpà ebe ahụ ma ọ bụdị mee ka etuto ahụ ka njọ. Ihe ga-aka mma ime bụ ịmata ihe kpatara etuto ahụ ma gwọọ ya, si otú ahụ hụ na etuto ahụ apụtaghị ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe gị na nwanne gị na-ese okwu. Chọpụta ihe na-akpata ya, ị ga-ahụkwa na ọ bụghị naanị esemokwu ahụ ka ị ga-edozi kama ihe na-akpata ya. Ị ga-enwekwa ike ime ihe Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru, bụ́ onye sịrị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.”—Ilu 19:11.

Dị ka ihe atụ, Alice, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, kwuru na Dennis nwanne ya ‘na-abata n’ime ụlọ ya were ihe ọ bụla masịrị ya n’agwaghị ya agwa.’ Ọ bụ ihe ahụ seere ha okwu. Ma, a sị gị kwuo, gịnị kpatara esemokwu ahụ? O nwere ike ịbụ na nwanne ya anaghị akwanyere ya ùgwù ruuru ya. *

Alice nwere ike ịgwa Dennis nwanne ya ka ọ kwụsị ịbata n’ime ụlọ ya ma ọ bụ imetụ ihe ya ọ bụla aka. Ma ọ bụghị ya ga-ebi nsogbu ha na-enwe, o nwedịrị ike ime ka nsogbu ha ka njọ. Ma, ọ bụrụ na Alice ejiri obiọma kọwaara Dennis na otú ahụ o si abata n’ime ụlọ ya na otú ahụ ọ na-esi ewere ihe ya n’agwaghị ya agwa adịghị mma, o doro anya na ha abụọ agaghị na-esekarị okwu.

Mụta Ịna-edozi Esemokwu ma Ọ Bụ Ịna-ezere Ya

N’eziokwu, ịmata ihe na-akpatara gị na nwanne gị okwu abụghị naanị ihe ga-eme ka nsogbu unu bie. Gịnị ka i nwere ike ime iji dozie nsogbu unu na-enwe ma mee ka unu abụọ ghara ise okwu ụbọchị ọzọ? Gbalịa mee ụzọ ihe isii a anyị ga-atụle ugbu a.

1. Kwekọrịtanụ ihe unu ga na-eme. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.” (Ilu 15:22) Ka unu ghara ise okwu n’oge ọzọ, legodị anya n’ihe ahụ i dere na ọ bụ ya seere gị na nwanne gị okwu. Lee ma è nwere ihe unu abụọ ga-ekwekọrịta ịna-eme, bụ́ nke ga-eme ka nsogbu unu na-enwe bie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe seere unu okwu bụ iwere ihe gị n’agwaghị gị agwa, Ihe Mbụ unu ga-ekwekọrịta ịna-eme nwere ike ịbụ: “Mgbe ọ bụla onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ iwere ihe ibe ya, ọ ga-ebu ụzọ gwa onye nwe ya.” Nke Abụọ nwere ike ịbụ: “Ọ bụrụ na onye nwe ya asị, ‘Mba, ewekwala ya,’ onye nke ọzọ agaghị esi ọnwụ were ya.” Mgbe unu na-ekwekọrịta ihe unu ga na-eme, chetanụ ihe a Jizọs kwuru: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Unu buru ihe a Jizọs kwuru n’obi, ọ ga-eme ka ihe gị na nwanne gị ga-ekwekọrịta bụrụ ihe unu abụọ ga-emeli. Gwazienụ ndị mụrụ unu ihe unu kwekọrịtara, iji mara ma hà ga-ekwe.—Ndị Efesọs 6:1.

2. Hụ na gịnwa na-eme ihe ahụ unu kwekọrịtara. Pọl onyeozi dere, sị: “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi?” (Ndị Rom 2:21) Olee otú ị ga-esi na-eme ihe a Baịbụl kwuru? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ka nwanne gị na-ebu ụzọ akụ aka tupu ya abata n’ime ụlọ gị ma ọ bụ ka ọ ghara ịgụ ozi e ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụ ozi iimel gị n’agwaghị gị agwa, gịnwa kwesịkwara ịna-eme otú ahụ.

3. Ekwela ka obere ihe na-ewe gị iwe. Gịnị mere ndụmọdụ a ji baa uru? Ọ bụ n’ihi na otu ilu Baịbụl kwuru na “iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Ekliziastis 7:9) Ọ bụrụ na obere ihe na-ewekarị gị iwe, obi ga na-ajọ gị njọ mgbe ọ bụla. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwanne gị ga na-eme ihe ndị na-akpasu gị iwe. Ma ihe ị ga-ajụ onwe gị bụ, ‘Èmetụla m ya ụdị ihe ahụ mbụ?’ (Matiu 7:1-5) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jenny, kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na atọ, ana m eche na ihe ọ bụla m kwuru bụ nke kacha mkpa nakwa na ọ bụ ya ka a ga-emerịrị. Ugbu a, nwanne m nwaanyị nke obere emewakwala otu ihe ahụ. N’ihi ya, m na-agbalị ịghara iwe iwe ma o kwuo ihe ga-ewe m iwe.”

4. Gbaghara ma chefuo. Ọ bụrụ na e nwere ezigbo ihe na-esere gị na nwanne gị okwu, unu kwesịrị ikwurịta ya ma dozie ya. Ma ì kwesịrị ịgwa nwanne gị okwu maka ihe ọ bụla o mere gị? Obi na-atọ Jehova Chineke ụtọ ma ị ‘na-eleghara mmejọ anya.’ (Ilu 19:11) Alison, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Mụ na Rachel nwanne m nwaanyị see okwu, anyị na-edozi ya. O nweghị onye n’ime anyị ọ na-esiri ike ịsị ibe ya ‘ewela iwe.’ Anyị na-ekwurịtazi ihe anyị chere kpatara esemokwu ahụ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụghị ụbọchị ahụ ka m na-ekwulite okwu iwe ahụ ọ kpasuru m. Achọpụtala m na ọtụtụ mgbe, chi bọọ, iwe ihe ahụ na-apụ m n’obi, anaghịzi m enwe mmasị ikwulite ya.”

5. Gwa ndị mụrụ gị ka ha kpeziere unu. Ọ bụrụ na gị na nwanne gị enweghị ike idozi otu ihe dị mkpa na-esere unu, ndị mụrụ unu nwere ike ikpeziri unu. (Ndị Rom 14:19) Ma cheta na ọ bụrụ na unu enwee ike idozi nsogbu unu n’agaghị kpọwa ndị mụrụ unu, ọ na-egosi na unu aghọwala dimkpa.

6. Jiri àgwà ọma ụmụnne gị nwere kpọrọ ihe. Ụmụnne gị nwere ike inwe àgwà na-amasị gị. Dee otu àgwà ọma na-amasị gị ị ma onye nke ọ bụla n’ime ha nwere.

Aha ha Àgwà na-amasị m

․․․․․ ․․․․․

Kama ịna-agwakarị ụmụnne gị ebe ndị ha na-anaghị emeta, í cheghị na ọ ga-adị mma ma i wepụta ohere jaa ha mma maka àgwà ha ndị na-amasị gị?—Abụ Ọma 130:3; Ilu 15:23.

Eziokwu doro anya: Mgbe ị ga-ebiri nke onwe gị, a ga-enwe mgbe ndị gị na ha nọ ga na-akpasu gị iwe. O nwere ike ịbụ ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-akparị mmadụ, ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ma na-agwa mmadụ okwu ọjọọ. Ọ bụ ugbu a i bi n’ụlọ ndị mụrụ gị ka ị ga-amụta otú gị na ụdị ndị ahụ ga-esi na-emekọ ihe n’udo. Ọ bụrụ na i nwere nwanne nwoke ma ọ bụ nwanne nwaanyị ihe na-anaghị adabachara gị na ya, elela ya anya ka onye ọjọọ. Were ya na nwanne gị ahụ na-enyere gị aka ịmụta àgwà ga-emecha baara gị uru ná ndụ.

Baịbụl kwuru na o nwere ike ọ gaghị abụ nwanne mmadụ ka ya na ya ga-akacha dịrị ná mma. (Ilu 18:24) Ma i nwere ike ime ka gị na ụmụnne gị na-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị ‘na-ediri ha ihe,’ ọ sọgodị ya ya bụrụ mgbe e nwere ezigbo ‘ihe mere ị ga-eji mee mkpesa.’ (Ndị Kọlọsi 3:13) Ọ bụrụ na ị na-ediri ha ihe, ihe ọ bụla ụmụnne gị na-eme agaghị na-agbakasị gị ahụ́. O nwekwara ike gịnwa agaghị na-akpasukarị ha iwe!

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 20 Ị chọọ ịma ihe ndị ọzọ ị ga-eme, gụọ  igbe dị n’okpuru ebe a.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Gịnị mere o ji dị mkpa ịma ọdịiche dị n’okwu gị na nwanne gị sere na ihe kpatara esemokwu ahụ?

● N’ime ụzọ ihe isii a e kwuru n’isiokwu a, olee nke i kwesịrị ịrụkwu ọrụ na ya?

[Igbe dị na peeji nke 19]

 CHỌPỤTA IHE KPATARA ESEMOKWU AHỤ

Ị̀ chọrọ ịmụtakwu otú ị ga-esi na-achọpụta ihe na-akpatara gị na nwanne gị okwu? Ọ bụrụ na ị chọrọ, gụọ akụkọ ahụ Jizọs kọrọ banyere nwa mmefu ahụ gara mefusịa ihe niile nna ya kenyere ya.—Luk 15:11-32.

Gụgharịa ebe ahụ e kwuru ihe nwanne nwa mmefu ahụ mere mgbe nwa mmefu ahụ lọtara. Zazie ajụjụ ndị a.

Gịnị kpasuru nwanne nwa mmefu ahụ iwe?

Olee ihe i chere bụ́ nsogbu ya?

Olee otú nna ha si gbalịa idozi okwu ahụ?

Gịnị ka ọ dị mkpa ka nwanne nwa mmefu ahụ mee iji dozie nsogbu ahụ?

Ugbu a, cheta otu esemokwu gị na nwanne gị nwere na nso nso a. Detuzie azịza gị n’akụkụ ajụjụ ndị a na-esonụ.

Gịnị seere unu okwu?

Olee ihe i chere kpatara esemokwu ahụ?

Gịnị ka unu abụọ ga-ekwekọrịta ịna-eme nke ga-enyere unu aka ikpezi, meekwa ka ihe ahụ ghara isere unu okwu n’oge ọzọ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Enwere m ụmụnne nwaanyị abụọ, achọkwara m ka mụ na ha bụrụ enyi ná ndụ m niile. Echere m na ọ bụ ugbu a ka mụ na ha kwesịrị ibido bụrụ enyi.”

“Anyị na-emekọ ihe ọnụ n’ezinụlọ anyị, nke ahụ na-emekwa ka anyị na-adị n’udo. Anyị anaghị esekarịzi okwu otú anyị na-ese na mbụ.”

“Enwere m ike ịsị na mụ na nwanne m nwaanyị dị ka mmiri na mmanụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị onye m ga-eji tụnyere ya. Eji m ya eme ọnụ!”

“E wezụga ụmụnne m, a gaaraghị enwe ihe ndị ọ na-abụ m cheta ha ugbu a, obi adị m ụtọ. Ihe m na-agwa ndị nwere ụmụnne bụ, ‘Ejila ha egwu egwu!’”

[Foto]

Tia

Bianca

Samantha

Marilyn

[Foto dị na peeji nke 19]

Esemokwu nwanne na nwanne yiri etuto. Ị chọọ idozi ya, kama ilebara naanị okwu ahụ unu sere anya, lebara ihe kpatara ya anya