Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ọkàiwu Eleba Anya n’Ihe Ndịàmà Jehova Kweere

Otu Ọkàiwu Eleba Anya n’Ihe Ndịàmà Jehova Kweere

Otu Ọkàiwu Eleba Anya n’Ihe Ndịàmà Jehova Kweere

OTU ọkàiwu, aha ya bụ Les Civin, onye nwere ọfịs ndị ọkàiwu na Saụt Afrịka, kwuru, sị: “O nwere oge m na-amachaghị ndị Ndịàmà Jehova bụ.” Gịnị mere o ji leba anya n’ihe Ndịàmà kweere? Gịnị ka ọ chọpụtara banyere ihe ndị ha kweere? Lekwa ihe ọ gwara Teta!

Olee okpukpe ị na-ekpebu?

Ndị mụrụ m bụ ndị Juu, ma ná mbido afọ ndị 1970, alụrụ m Carol, onye ndị mụrụ ya na-aga chọọchị Anglịkan. O nweghị mmasị n’okpukpe, o nweghịkwa ihe mụ na ya ji okpukpe kpọrọ n’oge ahụ. Ma, mgbe nwa anyị nwoke bụ́ Andrew gbara afọ asatọ, Carol bịara na-ekwu na anyị kwesịrị ime ka o nwee okpukpe ọ ga na-ekpe. Otu onye rabaị gwara m na ọ bụrụ na Carol ekpewe okpukpe ndị Juu, Andrew ga-aghọzi onye Juu. Ọ bụrụkwa na ọ gbaa afọ iri na atọ, a ga-emere ya ememme a na-akpọ Bar Mitzvah, bụ́ ememme ndị Juu na-eme iji gosi na mmadụ eruola ogo ikpebiri onwe ya ihe. N’ihi ya, anyị malitere ịga klas ebe a na-akụziri ndị chọrọ ikpe okpukpe ndị Juu ihe kwa izu n’ụlọ nzukọ ndị Juu.

Olee otú gị na Ndịàmà Jehova si mata?

Mgbe ọ bụla Ndịàmà bịara n’ụlọ anyị, anaghị m ekwe ka ha zie anyị ozi ọma. Ihe m na-agwa ha bụ, “Abụ m onye Juu, ekweghịkwa m n’Agba Ọhụrụ.” Ma otu ụbọchị, Carol gwara m na e nwere otu enyi ya bụ́ Onyeàmà nakwa na ọ ma Baịbụl nke ọma. Carol kwuru na ọ ga-adị mma ma anyị mụtụkwuo Baịbụl. N’ihi ya, ekwetara m ka mụ na Ndịàmà mụwa Baịbụl n’agbanyeghị na o sichaghị m n’obi.

Olee ihe i mere mgbe unu na-amụ Baịbụl?

Ana m eleda ndị ọzọ anya. N’ihi klas ahụ m na-aga n’ebe a na-akụziri anyị ihe ndị Juu kweere, abịara m lewe onwe m anya ka onye si n’agbụrụ Chineke ji aka ya họrọ. Ihe m chere n’obi m bụ, ‘Gịnị ka ndị a ma ha ga-akụziri m?’ N’oge mbụ anyị kwere ka Onyeàmà bịara n’ụlọ anyị zie anyị ozi ọma, agwara m ya, sị: “Abụ m onye Juu. Ekpebiri m na m ga na-ekpe okpukpe ndị Juu, m ga-anwụkwa na ya. O nweghị ihe ị ga-agwa m ga-eme ka m gbanwee okpukpe m.” Ọ gwara m na nsogbu adịghị. N’ihi ya, n’abalị Fraịdee na Mọnde ọ bụla, anyị na-aga klas a na-akụziri anyị ihe ndị Juu kweere, ma n’ụtụtụ Sọnde ọ bụla, anyị na Ndịàmà na-amụ ihe (ma ọ bụrụ na achọtalighị m ihe m ga-eji sị ha na enweghị m ohere). Ọ dabara na ha anaghị ana ndị mmadụ ego maka ịmụrụ ha Baịbụl otú e si ana anyị ego na klas ndị Juu.

Mgbe ọ bụla anyị na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, m na-eji Baịbụl ndị Juu n’ihi na echere m na Ndịàmà nwere Baịbụl nke ha. Ma, o juru m anya ịhụ na Baịbụl nke ha na nke m na-ekwu otu ihe. Nke a medịrị ka m kpebisikwuo ike igosi Ndịàmà na ha amaghị ihe ha na-akọ.

Mgbe anyị gara klas ndị Juu ahụ ugboro ole na ole, Carol gwara m na ya echeghị na onye rabaị na-akụziri anyị ihe maara Baịbụl nke ọma. Ọ gwara m na ya ga-akwụsị ịga klas ahụ, nakwa na ya ka kweere na Jizọs bụ Kraịst. Ihe ahụ o kwuru were m ezigbo iwe nke na m chewere echiche ịgba ya alụkwaghịm. Ma, mgbe iwe ahụ pụrụ m n’obi, echepụtara m ihe ọzọ m ga-eme. Ekpebiri m iji amamihe onye ọkàiwu mee ka Carol ghọta na ihe ‘òtù iberiibe’ a na-akụzi abụghị eziokwu.

Ì meliri ya?

Otu onye rabaị nyere m akwụkwọ na-ekwu na amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ emezughị n’isi Jizọs. Mụ na Carol mụrụ akwụkwọ ahụ ruo otu afọ na ọnwa isii. Anyị na Ndịàmà nọgidekwara na-amụ Baịbụl kwa izu. Ma, ka anyị na-amụ akwụkwọ ahụ onye rabaị nyere m, obi anaghị eru m ala. Abịara m na-achọpụta na ihe ndị akwụkwọ ahụ kwuru iji gosi na Jizọs abụghị Mesaya ahụ abụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na amụma niile kwuru banyere Mesaya ahụ na-atụ otu onye aka, ya bụ, Jizọs Kraịst. Ihe niile bịara doo m anya mgbe anyị gụrụ amụma ahụ dị na Daniel 9:24-27, bụ́ nke kwuru na Mesaya ahụ ga-apụta n’afọ 29 Oge Anyị. * Onyeàmà na-amụrụ anyị ihe wetara Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru, nke e dekwara ihe okwu niile dị na ya pụtara n’asụsụ Bekee. Ebe ọ bụ na m ma agụ asụsụ abụọ ahụ, eji m aka m lebara okwu niile dị na ya anya, ma gbakọọ oge ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị ahụ. N’ikpeazụzi ihe m kwuru bụ: “O doola m anya na amụma ahụ na-atụ aka n’afọ 29 Oge Anyị. Oleezi otú nke ahụ si gbasa Jizọs?”

Onyeàmà ahụ kwuru, sị, “Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere Jizọs baptizim.”

O nyeghị m ọnụ okwu! O jukwara m anya otú amụma Baịbụl niile si bụrụ eziokwu nakwa otú ha na ibe ha si ekwekọ.

Gịnị ka ndị enyi gị mere mgbe ha matara na gị na Ndịàmà na-akpa?

Ụfọdụ n’ime ha meteweere mụ na nwunye m ebere ma gwa anyị na ha ga-akpọga anyị na nke ndị ga-egosi anyị na e duhiela anyị. Ma o nweghị onye duhiere anyị n’ihi na nnyocha anyị mere n’onwe anyị mere ka anyị kwenyesie ike na ihe Ndịàmà na-ekwu bụ eziokwu.

Gịnị mere i ji kpebie ịghọ Onyeàmà Jehova?

Ebu m ụzọ sowe nwunye m, onye ghọrọla Onyeàmà Jehova, na-aga ọmụmụ ihe ụfọdụ Ndịàmà na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. * Ihe masịrị m bụ otú Ndịàmà si anabata onye ọ bụla na otú ha si hụ ibe ha n’anya n’agbanyeghị agbụrụ onye si. Ụdị ịhụnanya a adịghị n’okpukpe m na-ekpe. N’ihi ya, mgbe mụ na Ndịàmà mụkwuru Baịbụl ruo afọ atọ, e mere m baptizim.

Olee otú obi dị gị ugbu a ị ghọrọla Onyeàmà Jehova?

Ọ bụ ihe ùgwù na m bụ Onyeàmà Jehova. Ma m cheta otú m si kpọọ eziokwu dị na Baịbụl asị, ọ na-adị m ka erughị m eru inweta ọtụtụ ngọzi Jehova nyere m. O nweghị ihe ga-eme ka m kwaa mmakwaara na m ghọrọ Onyeàmà Jehova.

Olee ngọzi ndị i nwetarala?

Ha dị ọtụtụ. Otu n’ime ha bụ na enwere m ihe ùgwù ịbụ okenye, ma ọ bụ onye na-azụ atụrụ Chineke nakwa onye na-akụzi ihe, n’ọgbakọ anyị. Ihe ọzọkwa bụ na m na-enyere Ngalaba Okwu Iwu nke dị n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Saụt Afrịka aka. Ma o doro m anya na ngọzi kachanụ m nwetarala bụ ịmata onye Jehova na Ọkpara ya bụ nakwa ịghọta ihe ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-egosi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 N’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 197, a kọwara amụma Daniel buru banyere Mesaya ahụ.

^ par. 18 Carol nwụrụ n’afọ 1994, ọ dịkwala anya Les Civin lụrụ nwaanyị ọzọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

O juru m anya otú amụma Baịbụl niile si bụrụ eziokwu nakwa otú ha na ibe ha si ekwekọ