Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta

Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta

Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta

Otu nwaanyị nke gaferela afọ iri atọ, onye ya na di ya na ụmụ ya atọ bi n’obodo Kentọki, nke dị n’Amerịka dere, sị, “Mụ na ndị ezinụlọ m eritela nnukwu uru n’akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova nyere anyị.” Ọ sịrị: “Nke kacha atọ m ụtọ iji kụziere ụmụ m ihe bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Ana m amụta ihe mgbe ọ bụla m ji ya akụziri ha ihe.”

E sere ọtụtụ ihe ndị mara mma n’akwụkwọ a, a kọkwara akụkọ Baịbụl ndị a kọrọ na ya otú ha si mee. Dị ka ihe atụ, ná nkebi nke 2, akụkọ ndị so na ya bụ: “Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt,” “Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis,” “Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ,” “Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero,” “Ihe Otiti Iri Ahụ,” na “Ịgafe Oké Osimiri Uhie.”

Ná nkebi nke 6 n’akwụkwọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya,” e nwere ọtụtụ akụkọ ndị a kọrọ banyere ndụ Jizọs, malite mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndị dị na ya bụ, “A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ” na “Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri.” Isiokwu nke ikpeazụ a kwuru na ndị na-akọwa kpakpando, ndị a na-akpọkwa “ndị amamihe,” letara Jizọs mgbe ọ nọ “n’ime ụlọ” ọ bụghị mgbe ọ nọ n’ụlọ anụ ebe a nọ mụọ ya. Mgbe ha batara n’ụlọ ahụ, ha “hụrụ nwata ahụ ka ya na nne ya Marịa nọ.” Chineke gwaziri ụmụ nwoke a ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd, n’ihi na ọ chọrọ igbu Jizọs. Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere onye mere ka kpakpando ahụ pụta?—Matiu 2:1, 11, 12, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

I nwekwara ike iso ụmụ gị mụta ihe mgbe ị na-agụ akwụkwọ ahụ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Akụkọ dị na ya dị otu narị na iri na isii. Ha bụkwa akụkọ banyere ndị mmadụ na ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ a e sere n’ebe a.

Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.