Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Bụ Ikike Nkịtị?

Chineke Ọ̀ Bụ Ikike Nkịtị?

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Bụ Ikike Nkịtị?

ỌTỤTỤ mmadụ hụchaa ọmarịcha ihe ndị e kere eke dị n’ụwa a, ọ na-eme ka ha kweta na e nwere ikike karịrị nke mmadụ nke mere ka ihe ndị ahụ niile dịrị. Ọ̀ na-atọ gị ụtọ ịhụ ihe ndị dị iche iche e kere eke dị ma n’eluigwe ma n’ụwa? Ọ̀ na-eju gị anya ma ị hụ ihe ndị dị egwu e kere eke juru n’ụwa a nakwa ụzọ dị ịtụnanya ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ?

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ikekwe ihe ndị a niile ị na-ahụ emeela ka i kwere na e nwere ikike karịrị nke mmadụ dịnụ. Okpukpe ụfọdụ na-akụzi na ikike a bi n’ugwu, n’osisi, n’igwe, nakwa n’ihe ndị ọzọ e kere eke a na-ahụ anya. Ndị ọzọ kwekwaara na mmụọ ndị nna nna ha, ma ndị nke ezigbo ya ma ndị nke ọjọọ ya, na-abịakọta ghọọ ikike kacha ikike niile, bụ́ nke ha na-akpọ Chineke.

Nke ọ sọkwara ya ya bụrụ, otu ihe doro anya bụ na ndị kweere n’ikike a ekwetaghị na ya na ụmụ mmadụ nwere ike imekọrịta ihe. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na Chineke na-eche echiche, na ihe na-ewute ya, na a na-enwe ihe na-eme ya obi ụtọ nakwa na o nwere ihe ndị o zubere ime. Chineke ọ̀ bụ ikike nkịtị? Baịbụl, bụ́ otu n’ime akwụkwọ dị nsọ kacha ochie a kacha ekesa n’ụwa taa, zara ajụjụ a otú doro anya.

Otú Ụmụ Mmadụ Dị Na-egosi Otú Chineke Dị

Baịbụl kwuru na e kere mmadụ ka ọ dịrị otú Chineke dị. Jenesis 1:27 kwuru, sị, “Dị ka Chineke dị, ka Chineke siri kee mmadụ.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

O doro anya na ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru abụghị na mmadụ abụọ mbụ e kere eke dị nnọọ otú Chineke dị. Baịbụl kwuru na a na-anaghị ahụ Chineke anya n’ihi na ọ bụ mmụọ, ma e ji ájá dị n’ala, nke bụ́ ihe a na-ahụ anya, kee mmadụ. (Jenesis 2:7; Jọn 4:24) E wezụga na a naghị ahụ Chineke anya ma a na-ahụ mmadụ anya, ihe kwesịrị inyere anyị aka ịghọta otú Chineke dị bụ ileba anya nke ọma n’àgwà ụmụ mmadụ.

E kere ụmụ mmadụ ka ha jiri ike ha na-eme ihe ha chọrọ ime, nakwa ka ha na-echebara ihe ha chọrọ ime echiche nke ọma tupu ha emee ya. Ihe na-enyere ha aka ime otú ahụ bụ àgwà ndị dị ka obiọma, ikike iche echiche, ezi amamihe, na ikpe ziri ezi. Ụmụ mmadụ na-enwe ike ịhụ mmadụ ibe ha ma ọ bụ ihe na-abụghị mmadụ ibe ha n’anya, ha na-enwe obi ebere, nweekwa ike ịkpọ ihe asị ma ọ bụ iwe iwe. Ọ bụ otú onye ọ bụla n’ime anyị si akpa àgwà ndị a na-eme ka anyị dị iche n’ibe anyị. N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị nwere otú o si dị iche n’ibe ya. Ụmụ mmadụ abụghị ikike nkịtị.

Chineke ọ̀ ga-ekecha anyị ka anyị nwee àgwà ndị a ma yanwa abụrụ ikike nkịtị na-erugharị ka ikuku? Ọ bụrụ na e kere ụmụ mmadụ ka ha dị ka Chineke, ọ pụtara na e nwere ọtụtụ ụzọ Chineke na mmadụ si yie. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Chineke nwere aha. Baịbụl kwuru n’Aịzaya 42:8, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” Chineke chọrọ ka a mara aha ya. Baịbụl kwukwara, sị: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi. Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya, a ga na-eto aha Jehova.” (Abụ Ọma 113:2, 3) N’ihi ya, ebe ọ bụ na ndị na-efe Chineke maara na ọ bụghị ikike nkịtị, ha na-akpọ aha ya ma na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya.

Chineke enweghị oyiri. Baịbụl kwuru na e nwere naanị otu ezi Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 8:5, 6) Baịbụl sịrị: “[Ị] dị ukwuu n’ezie, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova; n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ka gị, ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị.” (2 Samuel 7:22) Akwụkwọ Nsọ kwukwara na Jehova bụ “ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa. E nweghị ọzọ.”—Diuterọnọmi 4:39.

Jehova Chineke kpọrọ ihe ọjọọ asị. Ọ bụrụ na Chineke bụ ikike nkịtị, o nweghị ike ịkpọ ihe asị. Ma Baịbụl gwara anyị na e nwere ihe ndị Onye kere anyị kpọrọ asị, ha bụ, “anya dị elu, ire na-agha ụgha, na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, obi nke na-echepụta ihe ọjọọ, ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ, onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume, na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.” (Ilu 6:16-19) Ị̀ hụrụ na Chineke kpọrọ àgwà mmadụ ga-akpa ya akpatara ibe ya nsogbu asị? Anyị ji nke a mara na Chineke na-eche banyere anyị nakwa na ọ kpọrọ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu asị.

Jehova Chineke hụrụ ndị o kere eke n’anya. Baịbụl kwuru na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16) O kwukwara na ọ bụ nna nke nwere obi ebere, onye bu ọdịmma ụmụ ya n’obi. (Aịzaya 64:8) Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ aghọta na Chineke bụ Nna hụrụ ha n’anya, ha ga-enweta ọtụtụ ngọzi.

Gị na Chineke Nwere Ike Ịbụ Enyi

Baịbụl kwuru hoo haa na Onye kere anyị na ụmụ mmadụ nwere ike imekọrịta ihe, na o nwere aha, nweekwa àgwà ndị e ji mara ya. O nwere ike o ji eme ihe ọ chọrọ ime, ọ na-echebakwara ihe ndị ọ chọrọ ime echiche nke ọma tupu o mee ha. Ọ bụ àgwà ndị dị ka obiọma, amamihe, na ikpe ziri ezi ka Chineke ji eme ihe ndị ọ na-eme. Chineke abụghị onye a na-enweghị ike ịbịaru nso. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịzaya 41:13.

Chineke nwere ihe o zubere imere ụmụ mmadụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Anyị ghọta na Jehova abụghị ikike nkịtị, kama onye nwere àgwà ndị pụrụ iche e ji mara ya, ọ ga-adịrị anyị mfe ịkpa ya nso, anyị enwetakwa ngọzi ndị ọ na-enye ndị niile bụ́ enyi ya.—Diuterọnọmi 6:4, 5; 1 Pita 5:6, 7.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Chineke ò nwere aha?—Aịzaya 42:8.

● È nwere ọtụtụ chi?—1 Ndị Kọrịnt 8:5, 6.

● Ụmụ mmadụ na Chineke hà nwere ike imekọrịta ihe?—1 Pita 5:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 19]

Chineke ọ̀ ga-ekecha anyị ka anyị dịrị otú a anyị dị ma yanwa abụrụ ikike nkịtị na-erugharị ka ikuku?