Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Olee Ihe Na-adịghị n’Ihe Osise A?
Gụọ Daniel 6:1-24. Lezie anya n’ihe osise ahụ. Olee ihe ndị na-adịghị na ya? Dee ihe ndị ị chọpụtara n’okpuru ebe a, senyezie ihe ndị ahụ na-adịghị na ya ma tee ya kreyọn.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere e ji tụba Daniel n’ebe a? Ò nwetụla mgbe ị tara ahụhụ maka na i mere ihe dị mma? Kọọ ihe merenụ. Olee uru ime ihe dị mma bara, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ ga-eme ka anyị taa ahụhụ?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Pita 2:19-21.
GỊNỊ KA Ị MA BANYERE MATIU ONYEOZI?
3. Olee aha ọzọ e ji mara Matiu?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 9:9; Mak 2:14.
․․․․․
4. Olee ihe Matiu hapụrụ ka o nwee ike bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Luk 5:27, 28.
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ịhapụ ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs? Olee ụfọdụ ngọzi ndị ị ga-enweta?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Mak 10:28-30.
SITE NA MAGAZIN A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ya.
PEEJI NKE 14 Ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute Nna ma ọ́ bụghị site n’onye? Jọn 14:________
PEEJI NKE 15 Olee ndị anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ha? Jems 5:________
PEEJI NKE 16 Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi? 1 Ndị Kọrịnt 9:________
PEEJI NKE 18 Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na i chere mgbe ifufe kwụsịrị tupu i mee ihe i kwesịrị ime? Ekliziastis 11:________
AZỊZA
1. Ọdụm.
2. Mmụọ ozi.
3. Livaị.
4. Ọ hapụrụ ihe niile.