Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Jikọrọ Okwukwe na Ichebara Ihe Echiche?

Ò Nwere Ihe Jikọrọ Okwukwe na Ichebara Ihe Echiche?

Echiche Baịbụl

Ò Nwere Ihe Jikọrọ Okwukwe na Ichebara Ihe Echiche?

ỌKÀ ihe ọmụma bụ́ onye Briten aha ya bụ A. C. Grayling, dere, sị: “Inwe okwukwe pụtara echebaraghị ihe echiche.” Ihe a o kwuru bụ ihe ọtụtụ ndị na-ede akwụkwọ na ndị ọkà ihe ọmụma chere. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ha na-ekwu na o nweghị ihe jikọrọ okwukwe na ichebara ihe echiche.

N’eziokwu, e nwere ihe ụfọdụ ndị okpukpe kweere ha na-echebaraghị echiche tupu ha ekwere na ha. Ma chegodị ihe a: E nwere ọtụtụ ihe ndị sayensị kwenyesiri ike na ha ma e mechaa chọpụta na ha abụghị eziokwu. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ihe niile ndị sayensị kweere bụ ụgha ma ọ bụkwanụ na e nweghị nke ọ bụla ha chebaara echiche tupu ha ekwere na ha? Gịnịzi mere a ga-eji na-ele ihe ndị okpukpe kweere anya otú dị iche? Nke bụ́ eziokwu bụ na okwukwe Baịbụl kwuru okwu ya abụghị ihe mmadụ na-enwe ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ ma banyere ihe ahụ o kweere na ya. Kama, onye ahụ ghọtara ihe o kweere nke ọma ma nwee ezigbo ihe mere o ji kwere n’ihe ahụ. Ka ị na-agụ isiokwu a, ị ga-achọpụta ihe bụ́ ezigbo okwukwe nakwa ihe jikọrọ ya na ichebara ihe echiche.

Otú E Si Enwe Ezigbo Okwukwe

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ofufe anyị bụrụ “nke dị Chineke mma,” ọ ga-abụrịrị “ozi dị nsọ site n’ike iche echiche [anyị].” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na anyị kwesịrị ife Chineke “ka ndị na-echebara ihe echiche.” (Ndị Rom 12:1; The Jerusalem Bible) N’ihi ya, ụdị okwukwe Baịbụl kwuru okwu ya abụghị nke na-enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ nakwa ihe mmadụ na-ekwere n’echeghị echiche ma ọ bụ ihe mmadụ na-anọkata ya ekweta na ya. Ọ bụghịkwanụ mmadụ ikweta ihe ọ bụla a gwara ya n’ajụghị ase. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe mmadụ chebaara echiche nke ọma, nke mere ka o nwee ihe ọ gbakwasịrị ụkwụ tụkwasị Chineke obi ma kweta n’Okwu ya.

Nke bụ́ eziokwu bụ na tupu i nwee ike ichebara ihe echiche nke ọma, ọ dị mkpa na ị ga-ama ihe bụ́ eziokwu banyere ihe ahụ. Kọmputa a rụrụ nnọọ nke ọma nwere ike ịgwa mmadụ ihe na-abụghị eziokwu ma ọ bụrụ na ihe e tinyere na kọmputa ahụ abụghị eziokwu. Otú ahụkwa ka inwe okwukwe dị. Ihe ga-ekpebi ma okwukwe gị ọ̀ ga-abụ nke ezigbo ya bụ ihe ị na-anụ ma ọ bụkwanụ otú ihe ị na-ekponye n’ụbụrụ gị dịruru ná mma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “a na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe.”—Ndị Rom 10:17.

Otu ihe dị ezigbo mkpa mmadụ ga-enwe tupu o nwee okwukwe bụ “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụ naanị “eziokwu” ka Baịbụl kwuru na ọ ‘ga-eme ka mmadụ nwere onwe ya’ pụọ na nkwenkwe ụgha ndị na-eduhie mmadụ, ma ò si n’aka ndị sayensị ma ọ bụ n’aka ndị okpukpe. (Jọn 8:32) Baịbụl dọrọ gị aka ná ntị ka ị ghara ikweta “okwu niile.” (Ilu 14:15) Kama ikweta okwu niile, ọ sịrị na i kwesịrị ‘ịchọpụta ihe niile’ ma ọ bụ chebara ihe ndị ị nụrụ echiche tupu i kweta na ha. (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Gịnị mere o ji dị mkpa na ị ga-eme nchọnchọ banyere ihe ndị i kweere ma chebara ha echiche iji chọpụta ma hà bụkwa eziokwu? Ọ bụ n’ihi na inwe okwukwe n’ihe na-abụghị eziokwu bụ mmadụ ịmụ anya arọ nrọ. Ụfọdụ ndị nwere ezi obi bi n’obodo oge ochie bụ́ Beria gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime iji nwee ezigbo okwukwe. Ọ bụ eziokwu na ndị ahụ chọrọ ikweta ihe Ndị Kraịst si ala ọzọ na-akụziri ha, ha wepụtara oge “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:11.

Otú Ị Ga-esi Nwee Okwukwe na Baịbụl

Ọ́ bụrụkwanụ na obi esichaghị gị ike na ihe ndị e kwuru na Baịbụl bụ eziokwu? Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na Baịbụl bụ ebe e si enweta ezi ihe ọmụma? Chegodị ihe a: Gịnị ga-eme ka obi sie gị ike na mmadụ na-agwa gị eziokwu? O doro anya na ọ bụ ịmata onye ahụ nke ọma. Otú i sikwanụ eme ya bụ ile otú onye ahụ si akpa àgwà ruo oge ụfọdụ. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i mee otu ihe ahụ n’ihe gbasara Baịbụl? *

Baịbụl kwuru na ezigbo okwukwe bụ “atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Ndị Hibru 11:1) O doro anya na onye nwere ezigbo okwukwe abụghị onye na-ekweta ihe ọ bụla, onye na-adịghị echebara ihe ndị a gwara ya echiche, kama ọ bụ onye chebaara ihe o kweere echiche nke ọma. Ichebara ihe echiche nke ọma otú ahụ na-eme ka mmadụ nwee ihe ọ gbakwasịrị ụkwụ kwenyesie ike na ihe ndị ọ na-enweghịdị ike iji anya nkịtị hụ dị adị n’ezie.

Ọ bụrụ na ihe ndị ị na-amụta adabaghị n’ihe ndị i kweere kemgbe ụwa, ì kwesịrị ịgbachi nnọọ nkịtị? Mbanụ. O nwedịrị oge ọ ga-adị mkpa ka i leba anya n’ihe ndị doro anya ọ dị gị ka ha na ihe ndị i kweere anaghị adaba. Na Baịbụl, Chineke kwere nkwa ime ka ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu nweta ihe ọmụma, nghọta na ikike iche echiche.—Ilu 2:1-12.

Okwukwe nke gbakwasịrị ụkwụ n’ihe Baịbụl kwuru bụ nke e chebaara echiche nke ọma nwee. Olee ụdị okwukwe i nwere? Ọtụtụ ndị kweere n’ihe ndị ha kweere n’ihi na ọ bụ n’aka ndị mụrụ ha ka ha si nụ ya, o nwetụbeghịkwanụ mgbe ha chebaara ihe ndị ahụ echiche iji mara ma hà bụ eziokwu. Ma ọ dịghị njọ ma i leba anya n’ihe ndị i kweere, ka i nwee ike ‘chọpụta n’onwe gị’ ma ò kwekọkwara n’ihe Okwu Chineke na-ekwu. (Ndị Rom 12:2) Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ‘nwalee okwu si n’aka mmụọ, ka anyị wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke.’ (1 Jọn 4:1) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-enwe ike ‘ịzara ọnụ gị n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ gị ihe mere i ji nwee olileanya ahụ i nwere,’ ọ sọgodị ya ya bụrụ n’ihu ndị na-ekwu na ihe i kweere abụghị eziokwu.—1 Pita 3:15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma eziokwu banyere Baịbụl, detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Baịbụl ọ̀ sịrị mmadụ echebarala ihe echiche?—Ndị Rom 12:1, 2.

● Olee ụdị ihe ọmụma dị ezigbo mkpa na ị ga-enwe tupu i nwee ezigbo okwukwe?—1 Timoti 2:4.

● Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Baịbụl si kọwaa okwukwe?—Ndị Hibru 11:1.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Chineke na-agọzi onye ji ezi obi na-achọ eziokwu