Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebiela M Ndụ Baara M Ezigbo Uru

Ebiela M Ndụ Baara M Ezigbo Uru

Ebiela M Ndụ Baara M Ezigbo Uru

Dị ka Herawati Neuhardt si kọọ

A mụrụ m n’obodo Chirebọn nke dị na Indonisha. Ihe e ji mara obodo a bụ ọmarịcha ákwà a na-akpọ batik, bụ́ nke e sere ihe dị iche iche mara mma ma jiri ihe ndị e ji esiji ákwà sijie ya. E nwere ụzọ ụfọdụ ndụ m si yie ákwà batik ahụ mgbe m gara kwusaa ozi ọma n’ala ndị ọzọ. Mgbe m gara zie ozi ọma n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia nakwa na Ndịda Pasifik, ahụrụ m ọtụtụ ndị si ebe dị iche iche. Ka m kọọ otú o si mee.

N’AFỌ 1962, mgbe m dị afọ iri, mama m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ka oge na-aga, ya na papa m, mụnwa na ụmụnne m anọ, ghọrọ Ndịàmà Jehova. Mama m na papa m bụ ndị Chaịna a mụrụ n’Indonisha.

N’ụlọ anyị ka ndị si mba ọzọ bịa ikwusa ozi ọma n’obodo anyị nakwa ndị na-abịa eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-ebikarị. Ndị nlekọta ndị a na-eji Baịbụl agba ọgbakọ anyị ume ma ha bịa. Àgwà ọma ha na ihe ndị na-agba ume ha na-ekwu mgbe mụ na ha na-akparịta ụka mere ka m chọọ ịdị ka ha. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, ekpebiri m ịmalite ịgawa ozi ọma oge niile. Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, mụ na Josef Neuhardt lụrụ. Ọ bụ onye Jamanị, bụrụkwa onye na-ezi ozi ọma ná mba ọzọ. Ọ bịara Indonisha n’afọ 1968. Mgbe anyị lọtara ezumike anyị gara mgbe anyị gbachara akwụkwọ, anyị gara otu àgwàetiti a na-akpọ Sumatra, nke bụ́ àgwàetiti nke abụọ kachanụ ná mba Indonisha. Àgwàetiti ndị e nwere ná mba a karịrị puku iri na asaa. Ọrụ di m na-arụ bụ ileta ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị e nwere n’obodo ahụ. Ana m esokwa ya aga.

Ikwusa Ozi Ọma na Sumatra

Sekit anyị, ma ọ bụ ọgbakọ ndị di m na-eleta, bidoro na Padang, bụ́ obodo na-ekwo ekwo nke okpomọkụ na-adịkarị na ya, nke dịkwa na West Sumatra, ruo ọmarịcha obodo Lek Toba, nke bụ́ nnukwu ọdọ mmiri dị n’ebe ugwu nke Nọt Sumatra. E mechakwara ziga anyị ileta ọgbakọ ndị dị n’ebe ndịda Sumatra. N’izu ọ bụla, anyị na-eji obere ụgbọala anyị merela ochie akwaga ọgbakọ ọzọ. Ụzọ ndị anyị si agafe jọrọ ezigbo njọ. Anyị na-agbafe ọtụtụ oké ọhịa, na-esi n’ákwà mmiri ndị na-esichaghị ike, bụ́ ndị e ji osisi akị bekee rụọ, agbafe, na-esikwa n’akụkụ ugwu ndị na-agbọpụ ọkụ na ndị nke na-adịghị agbọpụ ọkụ na-agbafe. N’abalị, anyị na-arahụ n’ala nkịtị n’ụlọ ndị e ji osisi rụọ. E nweghị ọkụ eletrik, mmiri pọmpụ ma ọ bụ ebe ịsa ahụ́ na ebe ịga mposi n’ebe ahụ. Anyị na-asa ahụ́ n’iyi nakwa n’osimiri ndị dị ebe ahụ. Ndụ a na-ebi ebe ahụ abụghị ndụ gbalụ gbalụ, anyị hụkwara ndị ebe ahụ n’anya. Ha nabatara anyị nke ọma ma na-enye anyị nri. Ọtụtụ n’ime ha nwekwara mmasị ịmụ Baịbụl.

N’obodo Padang, bụ́ ebe ndị Minangkabau bi, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Alakụba. O juru ha anya mgbe anyị si na Baịbụl gosi ha na Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu, otú ahụ chọọchị ndị Krisendọm si na-akụzi ya, kama na Chineke bụ otu. Ihe ndị ahụ ha nụrụ tọrọ ha ụtọ. (Diuterọnọmi 6:4) Ọtụtụ n’ime ha naara magazin Ụlọ Nche na Teta!, ụfọdụ mechakwara mụọ Baịbụl ma bịa fewe Jehova. Mgbe anyị gara Lek Toba, bụ́ ebe ndị Batak bi, anyị hụrụ na ọtụtụ n’ime ha na-aga chọọchị, ha makwa na Jehova bụ aha Chineke n’ihi na ha na-ahụ ya na Baịbụl ndị Batak ha. (Abụ Ọma 83:18) N’agbanyeghị na ha ma aha Chineke, ọ dịkwa mkpa na ha ga-aghọta onye Chineke bụ na ihe o kwere nkwa imere ụmụ mmadụ. Ọtụtụ n’ime ha mụrụ Baịbụl ma ghọọ Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma.

Ikwusa Ozi Ọma na Java

N’afọ 1973, e zigara mụ na di m Java, nke bụ́ àgwàetiti bururu ibu ka ọkara mba Briten. Ndị bi na Java karịrị nde mmadụ iri asatọ n’oge ahụ. * Anyị kwusaara ndị Java, ndị Sundan, na ndị Chaịna bi n’obodo ahụ ozi ọma.

Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m bụ ndị Chaịna a mụrụ n’Indonisha, amụtara m ịsụ ọtụtụ asụsụ, ma asụsụ Java, asụsụ Sundan, asụsụ Indonisha, nakwa asụsụ Bekee. Nke a mere ka m nwee ike izi ọtụtụ ndị nwere mmasị ozi ọma n’asụsụ ha.

Na Jakata, bụ́ isi obodo Indonisha, bụ́ nke dị na Java, ahụrụ m otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, onye ihu ya gosiri na obi adịghị ya mma. Eziri m ya ozi ọma banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs. Mgbe m na-agụrụ ya ihe Baịbụl kwuru, o bewara ákwá. Ọ sịrị: “Anti, i meela maka ịkụziri m ihe ndị a. Enwetazubeghị m ego m ga-eji kwụọ ụgwọ akwụkwọ m na-aga na mahadum. Ọ fọrọ otu nde rupiah na narị puku rupiah ise [nke bụ́ ihe dị ka puku naịra iri abụọ na ise]. Echi ka m kwesịrị iwetazu ya. Amaghị m ebe m ga-esi enweta ya. Anọ m na-eche ma m̀ ga-aga kwaa iko iji nwetazuo ya. Tupu ị bata, anọ m na-ekpe ekpere ka Chineke gwa m ihe m ga-eme. Ugbu a amatala m ihe m ga-eme. Ekpebiela m ịkwụsịgodị ịga akwụkwọ, ka m ghara imebi onwe m.” Nwa agbọghọ ahụ nwere obi ụtọ ịmụtakwu Baịbụl.

Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ ndị Java, ndị Sundan na ndị Chaịna mụrụ Baịbụl ma bido ibi ndụ otú Chineke si chọọ. Ihe ndị ha mụtara emeela ka ha nwee udo na ezigbo obi ụtọ ná ndụ dị nnọọ ka Chineke kwuru na Baịbụl.—Aịzaya 48:17, 18.

Kalimantan—Obodo Ndị Dayak

Mụ na di m si Java gaa Kalimantan, nke bụ́ otu nnukwu obodo ndị Indonishan dị na àgwàetiti a na-akpọ Bọnio. E wezụga Grinland na Niu Gini, Bọnio bụ àgwàetiti nke atọ kachanụ n’ụwa a. Bọnio nwere nnukwu oké ọhịa, ọtụtụ ugwu, na ọtụtụ osimiri. Ndị bi ebe ahụ bụ ndị Chaịna, ndị Malee na-ekpe okpukpe Alakụba, na ndị Dayak bụ́ ụmụ amaala obodo ahụ. Ndị Dayak na-ebikarị n’akụkụ mmiri. N’oge gboo, a ma ha ama ka ndị ike na ndị ogbu isi.

Anyị na-eji ụgbọ epeepe ma ọ bụ ụgbọ mmiri abanye n’ime ime obodo ndị Dayak. Osimiri ndị ahụ ka dị otú ha dị kemgbe ụwa, oké ọhịa dịkwa n’akụkụ ha abụọ. Agụ iyi ndị buru ezigbo ibu na-anọcha n’akụkụ mmiri ndị ahụ na-anya anwụ, enwe na-anọ n’elu osisi ndị dị n’akụkụ mmiri ahụ na-ele anyị anya, ebe ụmụ nnụnụ ndị mara nnọọ mma na-efegharị n’elu. N’eziokwu, ịga kwusaa ozi ọma n’ebe ndị a tọgburu onwe ya ma na-eyikwa egwu!

Ọtụtụ ndị Dayak bi n’ụlọ ndị e ji ahịhịa na osisi rụkwasị n’elu osisi ndị e gwunyere n’ala. Ụfọdụ n’ime ụlọ ndị a dị obere; ebe ọtụtụ ezinụlọ na-ebi n’ụlọ ndị nke dị ogologo. Ọtụtụ ndị n’obodo a ahụtụbeghị onye ọcha, n’ihi ya, di m ghọrọ onye a na-ekiri ekiri. Ọ na-agafe, ụmụaka ana-esogharị ya, na-akpọ ya, “Pastọ! Pastọ!” Onye ọ bụla chọkwara ịnụ ihe onye ozi ọma a bụ́ onye ọcha nwere ikwu. Mgbe ọ bụla di m ziwere ozi ọma, ọ bụ ụmụnna ndị ebe ahụ na-asụgharị ihe ọ na-ekwu n’asụsụ ha. Ụmụnna ndị a na-ahazizi ịmụwara ndị nwere mmasị Baịbụl.

Anyị Agaa Papiuwa Niu Gini

Na Disemba afọ 1976, gọọmenti Indonisha machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu ná mba ahụ n’ihi ihe ndị kpọrọ Ndịàmà Jehova asị gwara ha. N’ihi nke a, e zigaziri mụ na di m Papiuwa Niu Gini.

Obere oge ka anyị rutere Pọt Moresbi, bụ́ isi obodo Papiuwa Niu Gini, anyị ji ọnwa abụọ mụọ asụsụ Hiri Motu, nke bụ́ asụsụ ndị ebe ahụ ji azụ ahịa. Anyị mechara gaa Daru, nke bụ́ obere àgwàetiti dị n’ime ime n’ebe ọdịda anyanwụ obodo ahụ. N’ebe ahụ, ahụrụ m Eunice, bụ́ otu nwaanyị ọma gbara agba ma sie ike. Ezé nwaanyị a na-eji oji n’ihi na ọ dịla anya ọ tawara akị osisi bitel. Mgbe nwaanyị a mụtara na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya dị ọcha n’anụ ahụ́, n’omume nakwa n’ime mmụọ, ọ kwụsịrị ịta akị osisi bitel ma ghọọ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Mgbe ọ bụla anyị hụrụ ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị ji obi umeala na-eme ihe ha mụtara na Baịbụl, ọ na-eme ka anyị kwenyesie ike n’ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma 34:8, bụ́ ebe sịrị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.”

Josef mechara malitekwa ọrụ ileta ọgbakọ. Ọ fọrọ obere ka anyị gazuo obodo niile dị na Papiuwa Niu Gini, nke bụ́ mba a na-asụ ihe dị ka narị asụsụ asatọ na iri abụọ. Ka anyị nwee ike ikwusakwuru ọtụtụ ndị ọzọ ozi ọma, anyị mụkwuru asụsụ ọzọ, ya bụ, asụsụ Tọk Pisin, nke bụ́ asụsụ onye ọ bụla maara asụ ná mba ahụ. Ka anyị nwee ike ijeru obodo ukwu na obodo nta ndị dị ná mba ahụ, a na-enwe mgbe anyị na-eji ụkwụ, ụgbọala, ụgbọ mmiri, ma ọ bụdị obere ụgbọelu aga. Ọtụtụ mgbe, anyị na-anọ n’oké okpomọkụ, anwụnta na-atakarịkwa anyị, anyị na-arịkarịkwa ịba.

N’afọ 1985, e zigakwara anyị ebe ọzọ, ya bụ, obodo Sọlọmọn Aịlands, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Papiuwa Niu Gini. N’ebe ahụ, anyị jere ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ebe ahụ, anyị gakwara leta ọgbakọ ndị dị ebe ahụ ma gbaa ha ume, anyị na-agakwa mgbakọ Ndị Kraịst. Anyị mụwakwara asụsụ ọzọ, nke ugbu a bụ asụsụ Sọlọmọn Aịlands Pijin. Ma anyị nwere ezigbo obi ụtọ mgbe anyị malitere iji ya ezi ndị Sọlọmọn Aịlands ozi ọma n’ihi na ịnụ ozi ọma na-atọ ha ụtọ!

Mgbe Ihe Kacha Siere M Ike

N’afọ 2001, e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova n’Indonisha. Nke a mekwara ka mụ na di m laghachi Jakata. Ma obere oge ka anyị laghachiri ebe ahụ, di m ọma rịawara ọrịa kansa nke na-eme n’akpụkpọ ahụ́. Anyị gara obodo ya bụ́ Jamanị ka a gwọọ ya. Ma o wutere m mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2005, n’ụbọchị mere ya nnọọ afọ iri atọ na atọ anyị lụrụ. Enwere m olileanya na a ga-akpọlite ya mgbe ụwa ghọrọ Paradaịs. (Jọn 11:11-14) Ọ gbara afọ iri isii na abụọ tupu ya anwụọ, o jikwa afọ iri anọ jee ozi ọma oge niile.

Anọgidere m na Jakata, bụ́ ebe m ka nọ na-eje ozi ọma. Ọnwụ di m ọma ka na-ewute m ruo taa. Ma ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke enyerela m aka idi ọnwụ di m. Ozi ọma na-eme ka m nwee obi ụtọ nakwa ka m mara na e nwere ihe bara uru m ji ndụ m na-eme. N’eziokwu, enwere m ike ikwu hoo haa na Jehova emeela ka e nwee ọtụtụ ihe ndị mara mma mere ná ndụ m, meekwa ka m bie ndụ baara m ezigbo uru.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Taa ndị bi na Java agafeela otu narị nde mmadụ na nde iri abụọ.

[Map dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

INDONISHA

Java

JAKATA

Chirebọn

Sumatra

Padang

Lek Toba

Bọnio

PAPIUWA NIU GINI

PỌT MORESBI

Daru

SỌLỌMỌN AỊLANDS

[Foto dị na peeji nke 14]

Herawati na ndị ọ na-amụrụ Baịbụl n’obodo Sọlọmọn Aịlands

[Foto dị na peeji nke 14]

Mụ na di m bụ́ Josef, mgbe anyị nọ ná mba Họland, obere oge tupu ya anwụọ n’afọ 2005