Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke 5—Hụ na Gị na Ezinụlọ Gị Na-eme Ihe Ndị Unu Mụtara

Nke 5—Hụ na Gị na Ezinụlọ Gị Na-eme Ihe Ndị Unu Mụtara

Nke 5​—Hụ na Gị na Ezinụlọ Gị Na-eme Ihe Ndị Unu Mụtara

“Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe.” (Ilu 13:16) Ọ bụrụ na ị mata ihe ndị dị mkpa ga-eme ka ahụ́ sikwuo gị ike, o nwere ike inyere gị aka ime mgbanwe ndị i kwesịrị ime ná ndụ gị, bụ́ ndị ga-eme ka ahụ́ dịkwuo gị na ndị ezinụlọ gị mma.

◯ Na-amụtakwu ihe. N’ọtụtụ mba, e nwere ụlọ ọrụ gọọmenti na nke ndị nkịtị ebe a na-akụziri ndị mmadụ ihe ga-enyere ha aka ka ahụ́ na-adịkwu ha mma. Ụlọ ọrụ ndị a na-ebipụtakwa akwụkwọ ndị kwuru maka ahụ́ ike. Gbalịa na-ege ha ntị ma na-agụ akwụkwọ ha, ka i nwee ike mụta ihe ndị dị mkpa ga-eme ka ahụ́ na-adịkwu gị mma ma zere ihe ndị ga-akpatara gị nsogbu. Agwala onwe gị na o nweghị uru ihe ha na-akụzi bara, kama gbalịa na-eme mgbanwe ndị dị mkpa ka i mee.

Ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ka ahụ́ dịkwuo gị mma ma na-eme ha eme, ọ ga-abara ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị uru. Ọ bụrụ na ndị nne na nna na-eri ezigbo nri, na-adị ọcha, na-arahụ ụra nke ọma, na-emega ahụ́, ma na-eme ihe ndị ga-eme ka ha ghara ibute ọrịa, ụmụ ha ga-amụta ime ihe ndị ahụ, ọ ga-abakwara ha uru.—Ilu 22:6.

◯ Gịnị ọzọ dị mkpa? Ọ bụghị naanị na mmadụ chọrọ ka ahụ́ na-adị ya mma ga-eme ka onye ahụ mewe ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie ya ike. Ọ naghị adị mfe ịkwụsị àgwà ọjọọ mmadụ nwere kemgbe ụwa, imedị mgbanwe ụfọdụ ná ndụ na-abụkarịkwa ọgụ na mgba. O nwedịrị ndị ọ na-abụ a gwa ha na ihe ha na-eme nwere ike ibutere ha ọrịa ma ọ bụdị gbuo ha, ọ gaghị eme ka ha mewe ihe ha ma na ọ ga-abara ha uru. Gịnịzi ga-eme ka ha mewe ya? Ihe ga-enyere ha aka ime ya bụ icheta na o nwere ọtụtụ ihe ndị bara uru ha nwere ike iji ndụ ha mee, otú ahụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị icheta.

Ahụ́ ga-adị di ma ọ bụ nwunye mma tupu ha enwee ike ịna-enyere ibe ha aka. Ndị nne na nna na-achọ ka ahụ́ dị ha mma ka ha nwee ike ịgbakọ aka zụọ ụmụ ha. Ahụ́ dịrị ụmụ ndị toro eto mma, ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-enwe ike ilekọta ndị mụrụ ha na ndị ikwu ha ndị katarala ahụ́. Ihe ọzọ bụ na anyị chọrọ ịbara obodo anyị uru kama ịghọrọ ya ibu arọ. Ihe ga-eme ka anyị mee ihe ndị a niile bụ n’ihi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, ihe banyere ha ana-emetụkwa anyị n’obi.

Ihe ga-akadị mee ka anyị mee ihe ndị anyị kwesịrị ime bụ na obi dị anyị ụtọ na Onye kere anyị nyere anyị ndụ, nakwa na anyị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. Ndị kweere na Chineke anaghị eji ndụ Chineke nyere ha egwu egwu. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụrụ na ahụ́ gbasiri anyị ike, anyị ga-enwe ike ife Chineke nke ọma. E wezụga ife Chineke, è nwere ihe ọzọ ka mkpa mere anyị ga-eji gbalịsie ike na-elebara onwe anyị anya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Obi ga-adị gị ụtọ ma ị na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ na-adị gị mma