Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Uru Ụra Bara?

Olee Uru Ụra Bara?

Olee Uru Ụra Bara?

● Nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ugbu a, ọtụtụ ndị torurula ogo mmadụ na Kọntinent Ebe Ugwu Amerịka na-ehi ụra naanị awa asaa ma ọ bụ awa asaa na ọkara n’abalị ọ bụla. * Olee uru ụra bara? Ụra na-enwe agba nke mbụ, agba nke abụọ na agba ndị ọzọ. Mgbe mmadụ nọ n’ụra, ọ na-esi n’agba nke mbụ abanye n’agba ọzọ. Agba nke ọ bụla na-ewekwa ihe dị ka nkeji iri isii ruo nkeji iri itoolu. N’oge a ka ụbụrụ mmadụ na-akacha arụ ọrụ. Ndị na-eme nchọpụta kwetakwara na ọ bụ n’oge a ka ụbụrụ na-eji aka ya arụzi ihe ndị mebiri na ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na a na-enwe ihe na-eme ka mmadụ teta ụra mgbe ọ na-ehirubeghị otú o kwesịrị, ka oge na-aga, o nwere ike ịkpatara onye ahụ nsogbu n’ahụ́. Ụbụrụ onye ahụ ga-akwụsị ịrụ ọrụ nke ọma, nke ga-eme na ọ gaghị na-emezi ihe ndị ọ maara eme nke ọma, ọ ga-akpatakwara ya ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ.

Ihe ndị dị ka kọfị nwere ike igbochi mmadụ ihi ụra ruo oge ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ụbụrụ anyị nwere ihe na-eme ka ụra buru anyị ma ọ bụrụ na anyị ehirubeghị ụra otú ahụ́ anyị chọrọ. Ọ bụ nke a na-eme ụra ji eburu mmadụ ruo tịnkọm tịnkọm ole na ole mgbe ọ na-eme ihe dị ya mkpa. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kwuru na “ihe ọ sọkwara gị na-eme, ọ bụrụ na i hirughị ụra otú ahụ́ gị chọrọ, a ga-enwe oge ụra ga-eburu gị ruo ihe dị ka tịnkọm tịnkọm iri ma ọ bụ ruo ihe gafetụrụ otu nkeji.” Weregodị ya na mgbe i ji ụgbọala gị na-agba ihe ruru kilomita iri anọ na asatọ n’otu awa, ụra buuru gị ruo tịnkọm tịnkọm iri. Ihe ọ pụtara bụ na n’oge a ụra buuru gị, ebe ị gbaruru karịrị ọgbọ egwuregwu bọl n’ogologo. Ihe ọzọkwa bụ na ehighị ụra nke ọma nwere ike ime ka ahụ́ anyị gharazie inwecha ike ịlụso ọrịa ọgụ, n’ihi na ọ bụ mgbe anyị nọ n’ụra ka ahụ́ anyị na-emepụta ụdị mkpụrụ ndụ ndị na-alụso nje ọgụ. Ọ bụkwa n’oge anyị na-ehi ụra ka ahụ́ anyị na-emepụta ihe ndị na-enye aka eme ka agụụ na-agụ anyị otú kwesịrịnụ. N’eziokwu, otú ahụ o si dị mkpa ka anyị na-emega ahụ́ ma na-eri ezigbo nri, otú ahụkwa ka ọ dị mkpa ka anyị na-ehi ụra nke ọma.

Ọtụtụ ihe ndị ị na-arụ hà na-egbochi gị ihi ụra otú kwesịrịnụ? Ihe ndị na-echu gị ụra ọ̀ bụ nchegbu nke ndụ ka ọ̀ bụ ihe ndị ị kpakọbara maka ọdịnihu? Eze Sọlọmọn, onye maara ihe, kwuru, sị: “Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.”—Ekliziastis 5:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Gụọ isiokwu bụ́ “Iji Ụra Ụgwọ—Ọ̀ Na-emetụta Gị?” nke dị na Teta! February 8, 2004.