Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Emeela Maka Igosi M na E Nwere Nna nke Hụrụ M n’Anya”

“Unu Emeela Maka Igosi M na E Nwere Nna nke Hụrụ M n’Anya”

“Unu Emeela Maka Igosi M na E Nwere Nna nke Hụrụ M n’Anya”

● Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, onye bi na ndịda mba Amerịka, dere, sị: “A mụrụ m n’ezinụlọ ndị ji ịga chọọchị kpọrọ ihe, amakwa m na Kraịst bụ Onye Nzọpụta m. Ma, kemgbe ụwa, ụjọ ịga ọkụ mmụọ na-atụ m. Ma e mechara m bido ịgụ akwụkwọ unu bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

“Ka m gụrụ naanị isiokwu ole na ole n’akwụkwọ ahụ, obi bịara ruo m ala. Ọ dị m ka è buturu m ibu dị arọ. Ugbu a, amatala m na Jehova bụ Chineke hụrụ anyị n’anya, onye obiọma na onye obi ebere. Ọ chọrọ ka m na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ọ bụghị n’ihi na m na-atụ egwu ihe ọ ga-eme m kama n’ihi na m hụrụ ya n’anya. Aga m aga Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova na Sọnde a! Obi atọgbuola m. Unu emeela maka igosi m na e nwere Nna nke hụrụ m n’anya, ọ bụghị nke ga-akpọ ndị mmadụ ọkụ n’ọkụ mmụọ.”

Akwụkwọ a bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? lebakwara anya n’isiokwu ndị ọzọ dị mkpa. Ụfọdụ n’ime ha kọwara ebe ndị nwụrụ anwụ gara, ihe bụ́ olileanya ndị nwụrụ anwụ, otú e si eme ka ndụ ezinụlọ ka mma, onye Chineke na Jizọs Kraịst bụ, na ihe mere Chineke ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ a e sere n’ebe a.

Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.