Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwekwadịrị Ihe M Dị Mma Ya?

Ò Nwekwadịrị Ihe M Dị Mma Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ò Nwekwadịrị Ihe M Dị Mma Ya?

“E nwere otu enyi m ọ na-abụ mụ na ya nọrọ, mụ ewere onwe m ka onye na-enweghị uru ọ bara. Ihe niile na-agara ya siriri werere, o yikwara ka o nweghị ihe na-ara ya ahụ́ omume! Amaghị m ihe m ga-asị na ọ bụ ya na-eme m eme. Ọ bụ naanị mụnwa si otú a ele onwe m anya.”—Annette. *

Ọ̀ DỊ gị ka o nweghị ihe ị ma eme nke na ị naghịzi agba mbọ ime ihe ndị ị na-emetụbeghị? Ihe ndị chọrọ ka ihe na-agaziri gị na-agwa gị ọ̀ na-eme mgbe ụfọdụ ka i chee na o nweghị ihe ị dị mma ya? Ò nweela ihe ndị ị na-emetaghị n’oge gara aga, bụ́ ndị na-eme ka o siere gị ike ime ihe ndị ị na-amaghị eme? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú i kwesịrị isi lee ihe ị na-emetaghị anya ma ọ bụkwanụ nke i chere na i metaghị?

Ọ ga-abara gị ezigbo uru ma ị chọpụta azịza ajụjụ ikpeazụ a n’ihi na o nweghị onye ga-asị na ya na-emetacha ihe niile ọ chọrọ ime. (Ndị Rom 3:23) O nwere ndị ọ na-abụ ha mewe ihe ma ha emetaghị ya, ha agbaa mbọ meta ya n’oge ọzọ. Ihe na-enyere ụdị ndị a aka bụ na ha anaghị etinyecha obi ha n’ihe ahụ ha na-emetaghị. Ọ bụ ya na-eme ha mechaa nwaa ọzọ, ha nwere ike meta ya. Ngwa, ka anyị leba anya n’otú ị ga-esi emeri ihe atọ nwere ike ịbụ nsogbu gị. Ha bụ: Ihe ị na-agaghị emeli, ihe ọ dị gị ka ị gaghị emeli, na ihe ị na-emetaghị.

IHE Ị NA-AGAGHỊ EMELI → IHE NWERE IKE IME Ụjọ gị bụ na ị gaghị emeta ya. N’ihi ya, ị chọghịdị ịgba mbọ mee ya maka na o nweghị otú o si yie gị ka ị ga-emeta ya.

Olee ihe ọ bụ? N’ime ihe ndị a na-esonụ, kanye ✔ na nke ị ga-achọ imeta ma ya abụrụ na i chere na ị gaghị emeta ya ma i mewe ya.

◯ Ịgwa ụmụ klas unu ihe ị mụtara na Baịbụl

◯ Ịchọ ọrụ

◯ Iguzo n’ihu ndị mmadụ kwuo okwu

◯ Iso egwu egwuregwu

◯ Ịgụ egwú ma ọ bụ ịpị otu ngwá egwú

◯ Ihe ndị ọzọ ․․․․․

Chebara ya echiche. Chebara ihe ahụ ị kanyere akara echiche ma zaa ajụjụ ndị na-esonụ iji chọpụta ihe ndị nwere ike ime ma i mewe ya:

‘Gịnị ka m chọrọ ka o mee ma m mewe ya?’

․․․․․

‘Gịnị ka m na-atụ ụjọ ya na ọ ga-eme ma m mewe ya?’

․․․․․

Ngwa, dee otu ihe mere i ji kwesị ịgba mbọ mee ihe ahụ n’agbanyeghị na o yiri gị ka ị gaghị emeta ya.

․․․․․

Ihe atụ dị na Baịbụl. Mgbe Jehova Chineke gwara Mozis ka ọ bụrụ onye ndú ụmụ Izrel, ihe mbụ o mere bụ ikwu ihe bụ́ ụjọ ya. Ọ gwara Chineke, sị: ‘Ha agaghị ege m ntị.’ Ya amalitezie kwuwe ihe ndị ọ na-amaghị eme. Ọ sịrị Chineke: “Abụghị m onye maara okwu ekwu. O nweghị oge m ji bụrụ.” Mgbe Jehova mechakwara kwe Mozis nkwa inyere ya aka, Mozis rịọrọ ya arịrịọ, sị ya: “Biko Jehova, ziganụ onye ọzọ.” (Ọpụpụ 4:1, 10, 13, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Mozis mechara kweta ịga ozi Jehova ziri ya, ị manụ ihe mechaziri mee. Chineke nyeere Mozis aka, ya abụrụ onye ndú ụmụ Izrel ruo afọ iri anọ.

Ihe i nwere ike ime. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.” (Ekliziastis 9: 10) N’ihi ya, kama ikwe ka ụjọ mee ka ị ghara ime ihe ị chọrọ ime, jiri obi gị dum mee ihe ahụ. Chetụgodị echiche oge i mere ihe meta ya otú ị na-atụghị anya ya. Gịnị ka nke ahụ kụziiri gị? Olee otú ihe ahụ merenụ ga-esi enyere gị aka ka ị ghara ịna-atụ ụjọ ị na-atụ ugbu a?

Ihe ga-enyere gị aka: Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gwa papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ enyi gị torola eto ka ọ tụọrọ gị aro otú ị ga-esi na-elekwu onwe gị anya ka onye bara uru. *

IHE Ọ DỊ GỊ KA Ị GAGHỊ EMETALI → IHE I CHERE MERENỤ Ọ bụrụ na onye ọzọ emeta ihe ị na-emetalighị, i jiri onwe gị tụnyere onye ahụ, ya adị gị ka o nweghị ihe ị dị mma ya.

Olee ihe ọ bụ? Ònye ka i ji onwe gị atụnyere, oleekwa ihe onye ahụ metara i chere na ị gaghị emetali?

․․․․․

Chebara ya echiche. Na onye ahụ metara ihe ahụ ọ̀ pụtara n’eziokwu na ị gaghị emetali ya? N’okpuru ebe a, dee otu ihe i mere na nso nso a meta ya ma onye ọzọ akara gị meta ihe ahụ. O nwere ike bụrụ ule e lere unu n’ụlọ akwụkwọ.

․․․․․

Dee ihe mere i ji chee na mbọ ị gbara n’ihe ahụ efughị ọhịa.

․․․․․

Ihe atụ dị na Baịbụl. Mgbe Ken chọpụtara na àjà Ebel nwanne ya chụrụ masịrị Jehova, o ‘were iwe dị ọkụ.’ Jehova baara Ken mba n’ihi anyaụfụ ahụ ọ na-enwere nwanne ya. Chineke gwakwara Ken na o nwere ike ime nke ọma ma ọ chọọ. Jehova gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu?” *Jenesis 4:6, 7.

Ihe i nwere ike ime. Kama gị na mmadụ ‘ịsọwa mpi’ n’ihe, a sịgodị na ọ bụ n’obi ka i bu ya, gbalịa na-aja ndị metara ihe ị chọrọ ime mma. (Ndị Galeshia 5:26; Ndị Rom 12:15) Ma, i kwesịkwara ịja onwe gị mma maka ihe ndị ị ma eme, nke a apụtaghị na isi ga na-ebu gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”Ndị Galeshia 6:4.

IHE Ị NA-EMETAGHỊ → IHE I MERE I chebaara ihe ndị ị na-emetaghị n’oge gara aga echiche, gị echee na ihe kpatara ya bụ na ị gbaghị ezigbo mbọ.

Olee ihe ọ bụ? Olee ihe ọ na-abụ i cheta na ị naghị eme nke ọma na ya, ya emee ka ike ụwa gwụ gị?

․․․․․

Chebara ya echiche. Ihe ahụ i dere ọ̀ pụtara na o nweghị ihe ị dị mma ya? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere omume na-adịghị mma ị na-amaghị ụma mee, ọ̀ pụtaziri na ị ga na-eme ya mgbe niile? Ka nke ahụ ò gosiri na e kwesịrị inyere gị aka? Ọ bụrụ na ị daa ebe ị na-egwu egwuregwu, ị ga-achọ ka mmadụ nyere gị aka ka i bilie gwuwekwa egwu ị na-egwu. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i mee ụdị ihe ahụ ma ọ bụrụ na e nwere àgwà na-esiri gị ike nkwụsị? N’okpuru ebe a, dee aha onye ị ga-achọ ịgwa ihe ahụ bụ́ nsogbu gị. *

․․․․․

Ihe atụ dị na Baịbụl. E nwere mgbe ike gwụrụ Pọl onyeozi n’ihi ihe ndị ọ na-anaghị emeta. O kwuru, sị: “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ!” (Ndị Rom 7:24, IBS) Ma, Pọl mechara chọpụta na ezughị okè ya apụtaghị na o nweghị ihe ọ ma eme. O dere, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.”—2 Timoti 4:7.

Ihe i nwere ike ime. Kama ilekwasị anya naanị n’ihe ndị ị na-emejọ, gbalịa chee echiche n’ihe ndị ị na-emezi. Jehova anaghị eleghara ebe mmadụ na-eme nke ọma anya. Baịbụl sịrị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—Ndị Hibru 6:10; Abụ Ọma 110:3.

Buru n’obi na e nweghị onye zuru okè. Onye ọ bụla nwere mgbe ọ na-emejọ ihe. Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ imezi ihe i mejọrọ, ọ ga-abara gị ezigbo uru mgbe i toro. Ilu 24:16 sịrị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” I kwesịrị ịbụ ụdị onye a Baịbụl kwuru!

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ onye a abụghị ezigbo aha ya.

^ par. 23 Ị chọọ ịmatakwu otú i ga-esi na-ele onwe gị anya ka onye bara uru, gụọ Teta! Julaị–Septemba 2010, peeji nke 26-28.

^ par. 31 Ken leghaara ndụmọdụ ahụ Jehova nyere ya anya. Ihe ahụ mere Ken kwesịrị ịkụziri gị na i kwesịrị ịkpachara anya ka ị ghara inwere onye ọzọ metara ihe anyaụfụ.—Ndị Filipaị 2:3.

^ par. 36 Ọ bụrụ na Onye Kraịst mere mmehie dị ezigbote njọ, ọ ga-akara ya mma ka ọ gakwuru ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere ya aka.—Jems 5:14, 16.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ọ bụrụ na ị na-eme naanị ihe ndị ị ma eme, ya bụrụkwa na ị naghị agbalị ime ihe ndị ị na-anaghị emeta, o nwere ihe na-efunahụ gị.”

“I nwere ike mụta ihe n’ihe i mejọrọ ma gbaa mbọ mezie ya, ma ọ bụkwanụ gị ekworo n’ihi ihe ahụ i mejọrọ jụzie ịgba mbọ ime ihe na-esiri gị ike omume. Ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ụdị onye ị chọrọ ịbụ.”

“Ọ bụrụ na m ma na o nwere ike m gaghị emeta ihe m chọrọ ime, m na-ebu ụzọ chịwa onwe m ọchị. Ọ kara m mma ịchị onwe m ọchị kama ịnọ na-ewegbu onwe m n’iwe. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya ka i metachaa ihe niile, obi agaghị emekata dị gị ụtọ.”

[Foto]

Andrea

Trenton

Naomi

[Igbe dị na peeji nke 28]

IHE Ị GA-AJỤ NDỊ MỤRỤ GỊ

Mgbe unu hà ka m, olee ihe ndị unu na-anaghị emecha nke ọma na ha? Gịnị ka unu mere? Ùnu ka na-emejọ ihe ndị ahụ mgbe ụfọdụ?

․․․․․

[Foto dị na peeji nke 28]

Onye maara ihe daa n’ihe ọ na-eme, ya ebilie. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, e nwere ike nyere ya aka