Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ E Si Akpụpụ Ndị Ohu Ofesi N’oge Gboo

Ụzọ E Si Akpụpụ Ndị Ohu Ofesi N’oge Gboo

Ụzọ E Si Akpụpụ Ndị Ohu Ofesi N’oge Gboo

MALITE n’ihe dị ka narị afọ anọ ruo ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ihe e ji mara obodo Wida dị n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ire ndị ohu. E si na obodo Wida, nke dị n’ebe bụ́ Ripọblik ọf Benin ugbu a, kpụga ihe karịrị otu nde ndị ohu mba ndị dị n’ofesi. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị Afrịka na-ere ndị Afrịka ibe ha ka ndị ọcha nye ha mmanya, ákwà, ọla aka, mma nkịtị, mma agha, na nke ka nke égbè, bụ́kwanụ ihe ha na-achọsi ike n’ihi agha ha na ibe ha na-alụrịta.

N’ihe dị ka agbata narị afọ anọ na narị afọ abụọ gara aga, a kpụgara ihe dị ka nde ndị Afrịka iri na abụọ Kọntinent ndị dị n’Amerịka ka ha nọrọ ebe ahụ na-akọrọ ndị ọcha ugbo ma ọ bụkwanụ na-egwutere ha ihe n’ala. Otu akwụkwọ kwuru na n’ime ndị ohu iri ọ bụla a zụtara, ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ itoolu ka a kpọgara “Brazil na mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Karịbian, bụ́ ebe Briten, Frans, Spen, na Nedalandz na-achị n’oge ahụ.” E kwukwara na ọ bụ ole na ole n’ime ha ka a kpọgara ná mba ndị mechara ghọọ Amerịka. *

A na-eke ọtụtụ n’ime ndị ohu ndị ahụ agbụ ígwè, tie ha ihe, daakwa ha ọkụ e ji ahụwa ha ama, ma si n’ụzọ dị n’akụkụ otu ụlọ dị na Wida kpọfee ha. Ụlọ ahụ dị n’akụkụ Oké Osimiri Atlantik, a rụgharịakwala ya ugbu a ma jiri ya mere ebe a na-edebe ihe mgbe ochie. Ha na-esi ebe ahụ kpọrọ ha gaa ihe ruru kilomita anọ ruo n’otu ọnụ ụzọ ọ na-abụ ha banyehaala, ya abụrụ na ha agaghị alọta ọzọ. Ọnụ ụzọ ahụ dị n’ikpere mmiri, o nwekwara ihe ọ nọchiri anya ya n’ihi na e sighị otu ebe akpụga ndị ohu niile ofesi. Olee ihe mere ịgba ohu ji ghọọ omenala n’oge ahụ?

O Teela Omume Ọjọọ A Dịwara

N’oge gboo, ndị eze e nwere n’Afrịka na-eresị ndị Arab ndị ha dọtara n’agha. Ka oge na-aga, ndị ọchịchị si Yurop malitere ịzụrụ ndị ohu, karịchaa, mgbe ha chịwara mba ndị e nwere na Kọntinent ndị dị n’Amerịka. N’oge ahụ, a na-enwe ọtụtụ ndị a dọọrọ n’agha ma mba na mba lụọ agha, ndị ahụ na-aghọkwara ndị dọọrọ ha n’agha ndị ohu. Mba ndị meriri n’agha na ndị anyaukwu ndị na-azụ ndị ohu ndị ahụ jizi agha kpaa ezigbo ego. N’oge ahụkwa, a na-atọrọ ndị mmadụ ree ka ha bụrụ ohu ma ọ bụkwanụ ndị Afrịka ndị na-agba mgbere ndị ohu abanye ime Afrịka gaa zụrụ ndị ohu resị ndị ọcha. Mgbe ahụ, e nwere ike ire onye ọ bụla ka ọ bụrụ ohu, eze nwedịrị ike ree nwa ya ma ọ bụrụ na ọ na-enupụrụ ya isi.

Onye e ji ịgba mgbere ndị ohu mara n’oge ahụ bụ onye Brazil aha ya bụ Francisco Félix de Souza. N’afọ 1788, e nyere De Souza ọrụ ịhụ maka ire ndị ohu n’ụlọ ahụ dị na Wida, nke dị n’akụkụ Oké Osimiri Atlantik, bụ́ ebe bụ́ isi a nọ na-ere ndị ohu. N’oge ahụ, Wida dị na Dahọmi, e nwekwara eze na-achị Dahọmi. Ma, De Souza na Adandozan, bụ́ eze Dahọmi, mechara see okwu, ọ ga-abụkwa na eze ahụ tụrụ ya mkpọrọ. De Souza na nwanne eze mechara kpaa nkata ọjọọ, chụtuzie eze Dahọmi n’ọkwa n’afọ 1818. Otú a ka Ghezo, bụ́ eze ọhụrụ malitere ichi Dahọmi, na De Souza si ghọọ enyi, ya enyeghachi ya ọrụ ịhụ maka ire ndị ohu. Adịm ná mma ha abụọ wetakwaara ha nnukwu uru. *

Ihe bụ mkpa Ghezo bụ ime ka ebe ọ na-achị hikwuo nne, ọ bụkwa ngwá agha si Yurop ka ọ ga-eji melie ihe a ọ chọrọ ime. Ọ bụ ya mere o ji họpụta De Souza ka ọ na-achị Wida, ka o nwee ike na-eleru anya n’ahịa alaeze ya na ndị Yurop na-azụkọrịta. Ebe ọ bụ naanị De Souza na-ahụ maka ire ndị ohu ná mpaghara ahụ, ọ dịghị anya ya enwee ezigbo ego. Ụlọ ahụ a nọ na-ere ndị ohu, bụ́ nke dị ụlọ ya nso, ghọziri ebe ndị si ofesi nakwa ndị si mba ndị dị n’Afrịka na-abịa azụrụ ndị ohu.

Ije Ahụhụ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga hụ ụzọ ahụ dị na Wida, bụ́ ebe e si na-akpụpụ ndị ohu ofesi, ị ga-amalite n’ụlọ ahụ ndị Pọchụgal rụrụ, bụ́kwanụ nke a rụgharịrị arụgharị ugbu a. Ndị Pọchụgal wuru ụlọ ahụ n’afọ 1721, ọ bụkwa ya bụ ụlọ ahụ anyị kwuburu na a na-edewezi ihe ndị mgbe ochie n’ime ya. E jide ndị a chọrọ ire ka ha bụrụ ohu, a na-akpọchi ha ná nnukwu ụlọ dị n’etiti ogige ebe ahụ a na-anọ ere ndị ohu. Tupu ọtụtụ n’ime ha erute ebe ahụ, a na-eji otu agbụ ígwè eke ha niile, ha ejekwa ije ọtụtụ abalị. Gịnị mere e ji akpụta ha ebe ahụ n’abalị? Ọ bụ maka na itiri na-agba mgbe ahụ na-eme ka ha ghara ịma ebe ha nọ, nke a na-emekwa ka o siere onye ọ bụla si ebe ahụ gbapụ ike ịma ụzọ ọ ga-esi gbalaa.

Ọ bụrụ na a kpụta ndị ohu ebe ahụ, onye kacha kwee ha ọnụ na-azụrụ ha. Ya mechazie, ya adaa ha ọkụ ọ ga-eji hụwa ha ama. A na-akpọga ndị ohu a chọrọ ịkpọga ofesi n’akụkụ oké osimiri, bụ́ ebe ụgbọ epeepe ga-eburu ha buga n’ụgbọ mmiri ga-ebuga ha ofesi.

Ihe ọzọ dị n’ụzọ ahụ e si akpụpụ ndị ohu bụ ebe e nweburu osisi a sị na ọ bụ osisi na-eme ka mmadụ chefuo ụzọ o si bịa. Ọ na-abụ a kpọrọ ha rute n’osisi ahụ, a gwa ndị nwoke ka ha gbaa ya gburugburu ugboro itoolu ma gwa ndị nwaanyị ka ha gbaa ya gburugburu ugboro asaa. A gwara ha na ọ bụrụ na ha emee ya, ọ ga-eme ka ha chefuo obodo ha ma hapụ inupụ isi. Taa, e nwere ihe e wuru n’ebe ahụ osisi ahụ dịbu.

Ihe ọzọ e wuru n’ụzọ ahụ bụ ihe e ji echeta ụlọ akịrịka Zomaï. Zomaï bụ okwu na-egosi otú ụlọ akịrịka ndị ahụ si agba itiri. Ụlọ akịrịka ndị ahụ ha na-anọ na-eme ka ahụhụ ha ga-ata mgbe ha ga-arị ibe ha elu n’ụgbọ mmiri mara ha ahụ́. O nwekwara ike bụrụ na a na-akpọchi ha n’ụlọ ndị ahụ ọtụtụ ọnwa ruo mgbe ụgbọ mmiri ga-eburu ha ga-abịa. E nwee ndị nwụrụ tupu ụgbọ mmiri ahụ abịa, e likọta ha n’otu ili.

E nwere ihe ọzọ e wuru n’ụzọ ahụ, a na-akpọ ya Zomachi. Onye ma akụkọ a hụ ihe ahụ, ọ ga-ewute ya. Ihe ahụ na-egosi na arụ ahụ a kpara n’oge gboo na-ewute ndị ebe ahụ nakwa na ha chọrọ ka ha na ibe ha dịghachi ná mma. Na Jenụwarị ọ bụla, ụmụ ụmụ ndị e rere ka ha gaa bụrụ ohu na ụmụ ụmụ ndị gbara mgbere ndị ohu na-abịa ebe ahụ iji rịọ ka a gbaghara ma ndị rere ndị ohu ma ndị zụụrụ ndị ohu n’oge ochie.

Ihe ikpeazụ ị ga-ahụ ma ị gaa n’ụzọ ahụ bụ ọnụ ụzọ ọ na-abụ ndị ohu banyehaala, ha amara na ha agaghị alọta ọzọ. Ugbu a, a rụzigharịala ọnụ ụzọ ahụ, ọ na-echetakwara ndị mmadụ na ndị ohu ruo ebe ahụ, ụkwụ ha agaghị emetụ n’Afrịka ọzọ. N’elu ọnụ ụzọ ahụ, a tụrụ ìgwè ndị ohu abụọ e kere agbụ ígwè, bụ́ ndị a kpụ na-aga n’ụsọ Oké Osimiri Atlantik. A sị na a kpụrụ ndị ohu rute ebe a, ụfọdụ n’ime ha na-ekporo ájá raa ka ha ghara ichefu ala nna ha. Ụfọdụkwa na-eji agbụ ígwè e kere ha nọrọ ebe a kwụgbuo onwe ha.

Otú E Si Kwụsị Ịgba Ohu

Tupu afọ 1805, ọtụtụ ndị gbara ezigbo mbọ ka a kwụsị ịgba ohu. Ụgbọ mmiri ikpeazụ si Wida bute ndị ohu n’Amerịka rutere Mọbụl nke dị n’Alabama n’ọnwa Julaị 1860. Ma, ha agbateghị ohu aka n’ihi na gọọmenti Amerịka tiri iwu n’afọ 1863 ka a kwụsị ịgba ohu. Ịgba ohu mechara kwụsị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa n’afọ 1888 mgbe gọọmenti Brazil mara iwu ka a kwụsị ịgba ohu. *

Ọ bụ ịgba ohu mere e ji nwee ọtụtụ ndị isi ojii na omenala ndị isi ojii na Kọntinent ndị dị n’Amerịka. Ihe ọzọ ịgba ohu mere ka e nwee n’ebe ndị ahụ bụ voodoo, ya bụ, ife ndị nna nna nwụrụla anwụ. Ndị Heiti na-ekpekarị ụdị okpukpe a, ndị na-ekpekwa ya na-emekarị anwansi. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru, sị: “E si n’okwu bụ́ vodun nweta voodoo, nke pụtara chi, ma ọ bụ mmụọ. Vodun bụ okwu ndị na-asụ Fon na Benin (ya bụ, ebe bụbu Dahọmi).”

Ọ dị mwute na ụdị ịgba ohu ndị jọgburu onwe ha ka dị taa, ọ bụ eziokwu na ha abụchaghị ịgba ohu nkịtị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde mmadụ bụ ndị ohu n’ihi na ha anaghị ahụ nke ha riri. Ndị ọzọ na-ata ahụhụ n’ihi na ndị na-achị ha dị aka ike. (Ekliziastis 8:9) Ọtụtụ nde ndị ọzọ bụkwa ndị okpukpe ụgha na nkwenkwe ụgha mere ka ha ghọọ ohu. Ọchịchị mmadụ ọ̀ ga-emeli ka ndị ha na-achị nwere onwe ha, ghara ịbụ ohu n’ihe ndị a? Mba. Ọ bụ naanị Jehova Chineke ga-emeli ya, ọ ga-emekwa ya! N’eziokwu, Okwu ya e dere ede, bụ́ Baịbụl, kwere anyị nkwa na ndị na-efe Jehova otú Baịbụl kwuru ka e si na-efe ya ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” otu ụbọchị.—Ndị Rom 8:21; Jọn 8:32.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’agbanyeghị na ọ bụ ndị ohu ole na ole ka a kpọgara Amerịka, ha mechara hie nne mgbe ha mụwara ụmụ.

^ par. 7 E nwere ọtụtụ ụzọ e si asụpe “Ghezo.”

^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Baịbụl kwuru banyere ịgba ohu, gụọ isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Chineke Ọ̀ Nabatara Ahịa Ohu?” Ọ gbara na Teta! September 8, 2001.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

‘MMADỤ ACHỊALA MMADỤ IBE YA ỌCHỊCHỊ NCHỊGBU’

Ọtụtụ ndị sị na ndị na-agba mgbere ndị ohu na-abanye n’ime obodo dị iche iche gaa nwụde ndị ọ bụla dị ha mma. O nwere ike ịbụ na ihe a ha kwuru bụ eziokwu. Ma, otu ọkachamara n’ihe gbasara akụkọ ndị Afrịka, aha ya bụ Dr. Robert Harms, kwuru mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ na redio na a sị na “ndị eze na-achị obodo ndị dị n’Afrịka, ha na ndị na-agba mgbere ndị ohu, enyereghị ndị na-abịa Afrịka na-azụ ndị ohu aka,” ha agaraghị enwe ike inweta ọtụtụ ijeri ndị ahụ e rere ha abụrụ ohu. Nke a gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, nke bụ́, ‘mmadụ achịala mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—Ekliziastis 8:9.

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Réunion des Musées Nationaux/Art Resource, NY

[Map dị na peeji nke 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

A kpụgara ihe dị ka nde ndị Afrịka iri na abụọ Kọntinent ndị dị n’Amerịka ka ha nọrọ ebe ahụ na-agba ohu

AFRỊKA

BENIN

Wida

Ebe A Na-akpọrute Ndị Ohu

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ụlọ ndị Pọchụgal wuru na Wida n’afọ 1721, bụ́zi ebe a na-edebe ihe ndị mgbe ochie

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Gary Cook/Alamy

[Foto dị na peeji nke 17]

Ohu e kefere aka azụ, kechiekwa ọnụ

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọnụ ụzọ ọ na-abụ ndị ohu banyehaala, ha agaghị alọta ọzọ. E ji ya echeta na ndị ohu ruo ebe a, ụkwụ ha agaghị emetụ n’Afrịka ọzọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Danita Delimont/Alamy