Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ị Ga-eji Kpachara Anya n’Otú I Si Ekwu Okwu

Ihe Mere Ị Ga-eji Kpachara Anya n’Otú I Si Ekwu Okwu

Echiche Baịbụl

Ihe Mere Ị Ga-eji Kpachara Anya n’Otú I Si Ekwu Okwu

O nwere ụbọchị otu praịm minista na otu agadi nwaanyị kparịtara ụka. Mkparịta ụka ha gara nnọọ nke ọma ka nke enyi na enyi. Ma, ka nwaanyị ahụ pụwara, praịm minista a weturu olu kwuo na nwaanyị ahụ abụghị ezigbo mmadụ nakwa na ndị na-arụrụ ya ọrụ ekwesịghị ịhapụ ụdị onye ahụ ka ọ bịakwute ya. Ka ọ na-ekwu ihe ndị ahụ, ọ maghị na a gbanyụbeghị maịkrofon dị ebe ahụ. Ihe ahụ o kwuru wutere ọtụtụ ndị nụrụ ya. N’ụbọchị asatọ sochiri ya, praịm minista a pụtara ka ọ dọọ ọkwá ọchịchị praịm minista nke ugboro abụọ ya. Ma, mgbe e mere ntụliaka ọchịchị, ọ dara n’ihi na ihe ahụ o kwuru nyere ya aha ọjọọ.

O NWEGHỊ mmadụ ọ bụla ga-asị na ya na-ekwu okwu ọma mgbe niile. (Jems 3:2) Ma, akụkọ ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a gosiri na anyị kwesịrị ịkpachara anya n’otú anyị si ekwu okwu. Otú i si ekwu okwu na ihe ị na-ekwu so n’ihe kacha ekpebi otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya. O sokwa n’ihe e ji ama ụdị ihe na-amasị gị, sorokwa n’ihe ga-ekpebi ma gị na ndị ọzọ ọ̀ ga-adị ná mma.

Ma, e nwere ihe ọzọ a na-esi n’okwu ọnụ gị ama gbasara gị. Baịbụl kwuru na ihe na-esi gị n’ọnụ apụta na-egosi ihe dị gị n’obi, e jikwa ya ama ụdị mmadụ ị bụ. Jizọs sịrị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Matiu 12:34) Ebe ọ bụ na ọ bụ okwu ọnụ gị ka e ji ama ụdị mmadụ ị bụ, otú obi dị gị nakwa ihe ị na-eche, ọ dị mkpa ka i lebara otú i si ekwu okwu anya nke ọma. Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ime ya? Chebara ihe ndị a na-aga ikwu ugbu a echiche.

Otú Ị Ga-esi Na-ekwu Okwu Dị Mma

Tupu mmadụ ekwuo okwu, ọ na-ebu ụzọ eche ihe ahụ ọ chọrọ ikwu. Ka i nwee ike na-ekwu ihe dị mma, i kwesịrị ilebara ihe ị na-eche n’obi gị anya ma chọpụta ma è nwere ihe i kwesịrị imezitụ. Legodị otú ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere gị aka, bụ́kwa nke ga-eme ka ị na-ekwu ihe dị mma.

Na-eche ihe ndị dị mma. Baịbụl kwuru ihe ndị ahụ dị mma i kwesịrị ịna-eche. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”Ndị Filipaị 4:8.

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe a magburu onwe ya Baịbụl gwara gị, ị gaghị na-eche ihe ndị na-adịghị mma. Chetakwa na ihe ị na-eche n’obi gị na-abụkarị ihe i ji anya gị hụ na ihe ị gụrụ agụ. N’ihi ya, ka i nwee ike izere iche ihe na-adịghị mma na ihe ndị rụrụ arụ, gbalịsie ike zere ihe ọ bụla ga-eme ka i chewe ha. Nke a pụtara na ị ga na-agbara fim na ihe ọ bụla a na-eme ihe ike na ha ọsọ, ya na ebe ọ bụla a na-eme ihe rụrụ arụ. (Abụ Ọma 11:5; Ndị Efesọs 5:3, 4) Kama ihe ndị a, lekwasị anya n’ihe ndị dị ọcha na ihe ndị ga-abara gị ezigbo uru. Baịbụl nwere ike inyere gị aka ime nke a. Dị ka ihe atụ, gụọ Ilu 4:20-27; Ndị Efesọs 4:20-32; na Jems 3:2-12. Ị gụọ ha ma na-eme ihe ndị ị gụtara, ị ga-achọpụta na otú i si ekwu okwu ga-akakwu mma. *

Chee echiche tupu i kwuo okwu. Ilu 12:18 kwuru, sị: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” Ọ bụrụ na ị chọpụta na ihe ị na-ekwu na-afụ ndị mmadụ ụfụ ka à ga-asị na a ‘mara ha mma,’ ọ dị mma ka i buru ụzọ na-eche echiche tupu i kwuwe okwu. Jisie ike mee ihe a magburu onwe ya Ilu 15:28 kwuru. Ọ sịrị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu, ma ọnụ ndị ajọ omume na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ.”

Kpebie ihe ị ga-eme. Gwa onwe gị na site ugbu a ruo ọnwa ọzọ, ị gaghị ekwu ihe mbụ batara gị n’obi ma a kpasuo gị iwe. Kama, gbalịa cheta ihe amaokwu Baịbụl ndị e dere n’isiokwu a kwuru. Gbalịakwa kwuo okwu otú ga-egosi na ị ma ihe, na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya nakwa na ị chọghị okwu na ụka. (Ilu 15:1-4, 23) Ma, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri.

Kpekuo Chineke ekpere ka o nyere gị aka. Otu onye so dee Baịbụl gwara Chineke n’ekpere, sị: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova.” (Abụ Ọma 19:14) Gwa Jehova Chineke na ị chọrọ ịna-ekwu okwu otú dị ya mma, ka gị na ndị mmadụ nwee ike ịna-adị ná mma. Ilu 18:20, 21 sịrị: “A ga-esi n’okwu ọnụ mmadụ mee ka afọ ju ya; ihe si n’egbugbere ọnụ ya pụta ga-eju ya afọ. Ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.”

Jiri Baịbụl leruo onwe gị anya. Baịbụl dị ka enyo, ọ ga-enyere gị aka ileru onwe gị anya nke ọma. (Jems 1:23-25) Dị ka ihe atụ, gụọ ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị e dere n’okpuru ebe a ma jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si ekwu okwu ọ̀ dabara n’ihe e kwuru ebe a? Olee otú ndị mmadụ si ele m anya?’

“Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) Okwu gị ọ̀ na-adị nro? Ọ̀ na-eme ka obi dajụọ onye iwe ji?

“Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.” (Ndị Efesọs 4:29) Okwu gị ọ̀ na-ewuli ndị gị na ha nọ elu?

“Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Ị̀ na-agbalị ime ka okwu gị dị n’amara, ka ndị ị na-agwa okwu nwee ike ige gị ntị? Ị̀ na-emekwa otú ahụ mgbe a kpasuru gị iwe?

Were ya na i jikeere ịpụ apụ, gị elee onwe gị n’enyo ma chọpụta na ejiji gị adịghị mma, gịnị ka ị ga-eme? Ị ga-ejizi ya ka i nwee ike ịdị mma n’anya, ahụ́ eruokwa gị ala ma gị na ndị ọzọ nọrọ. Otú ahụkwa ka ndị mmadụ ga na-ele gị anya ọma, ahụ́ eruokwa gị ala, ma ọ bụrụ na i jiri Okwu Chineke mere enyo ma gbanwee otú na-adịghị mma i si ekwu okwu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 I nwere ike ịga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.watchtower.org gụọ Baịbụl n’asụsụ Bekee.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ụdị mmadụ ihe ị na-ekwu na-egosi na ị bụ?—Luk 6:45.

● Olee otú i kwesịrị isi na-agwa ndị mmadụ okwu?—Ndị Efesọs 4:29; Ndị Kọlọsi 4:6.

● Olee ihe ndị i nwere ike ime ka otú i si ekwu okwu kakwuo mma?—Abụ Ọma 19:14; Ndị Filipaị 4:8.

[Foto dị na peeji nke 21]

Otú anyị si ekwu okwu nwere ike inye anyị aha ọma ma ọ bụ aha ọjọọ, ọ bụkwa ya ga-ekpebi ma anyị na ndị mmadụ ọ̀ ga-adị ná mma