Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Ka M Ga Na-akpa Nso?

Ole Ndị Ka M Ga Na-akpa Nso?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ole Ndị Ka M Ga Na-akpa Nso?

“Adị m iri afọ abụọ na otu. Mụ na ọtụtụ ndị bi ebe a abụghị ọgbọ. Nke a pụtara na ndị mụ na ha ga na-akpa ga-abụ ndị m tọrọ ma ọ bụkwanụ ndị lụrụla di ma ọ bụ ndị lụrụla nwunye. Ihe na-abụkarị mkpa ndị m tọrọ bụ otú ha ga-esi mee nke ọma n’ule, ebe ndị lụrụla di ma ọ bụ ndị lụrụla nwunye na-ekwukarị ihe gbasara ezinụlọ ha. O nweghị nke gbasara m n’ime ihe ndị a ha na-ekwu. Ọ gaara akara m mma ma a sị na m ga-ahụ ndị ihe ga na-adabara mụ na ha.”—Carmen. *

Ọ FỌRỌ obere ka ọ bụrụ na mmadụ niile, ma nwata ma dimkpa, achọghị ịgbapụ iche. O doro anya na gịnwa achọghịkwa ịgbapụ iche. Ọ bụ ya mere o ji ewe mmadụ iwe ma ya na onye ọzọ nọrọ, a gbachi ya nkịtị ka à ga-asị na ọ bụghị mmadụ. Nwa agbọghọ dị afọ iri na ise, aha ya bụ Michaela, kwuru na ọ na-adị ya ka e weere ya ka “onye e ji mejuo ọnụ ọgụgụ ndị nọ ebe ahụ.”

Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, nke bụ́ eziokwu bụ na i nwere “òtù ụmụnna dum” ị ga na-akpa nso. (1 Pita 2:17) Ma mgbe ụfọdụ, ọ ka nwere ike ịdị gị ka e nweghị ebe ị kwụ akwụ. Otu nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ, aha ya bụ Helena, kwuru, sị: “Anyị lọtawa ọmụmụ ihe, m na-anọ n’oche azụ ụgbọala na-ebe ákwá. M gbalịa itinye ọnụ n’ihe a na-ekwu, ọ naghị enwe isi, ya emee ka obi na-ajọ m njọ.”

Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka e nweghị ebe ị kwụ akwụ, gịnị ka ị ga-eme? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị matagodị (1) ndị ọ na-aka esiri gị ike ịkpa nso nakwa (2) ihe ị na- eme ma gị na ndị ahụ nọrọ.

N’ime ụdị ndị a e dere n’okpuru ebe a, kanye ✔ ná ndị ọ na-esiri gị ike ịkpa nso.

1. Afọ ndụ ha

□ ndị m tọrọ □ ndị ọgbọ m □ ndị tọrọ m

2. Ihe e ji mara ha

Ndị

□ na-eme egwuregwu □ ma eme ihe □ isi na-aghọ nkọ

3. Ụdị ndị ha bụ

Ndị

□ obi kara □ a ma ama □ nwere ndị òtù

Ngwa, kanye ✔ na nke ọ bụla n’ime ihe e kwuru n’okpuru ebe a, bụ́ nke kọwara ihe ị na-eme ma gị na ndị ahụ nọrọ.

□ M na-eme ka à ga-asị na ihe na-amasị ha na-amasị m ma ọ bụkwanụ na m ma eme ihe ha ma eme.

□ M na-ekwu ihe na-amasị m, ọ bụghị ihe na-amasị ha.

□ M na-agbachi ha nkịtị, na-eche ohere m ga-eji si ebe ahụ pụọ.

Ugbu a ị matarala ndị ọ na-akacha esiri gị ike ịkpa nso nakwa ihe ị na-eme mgbe gị na ha nọ, anyị agawala ịmata otú ị ga-esi merie nsogbu ahụ ị na-enwe. Ma, e nwere ihe ụfọdụ ị na-ekwesịghị ime.

NKE MBỤ: Akpala iche

Ihe na-akpata ya. Ọ bụrụ na ndị gị na ha nọ bụ ndị na-eme ihe ị na-amaghị eme ma ọ bụkwanụ ndị ihe na-amasị ha dị iche n’ihe na-amasị gị, o nwere ike ịdị gị ka e nweghị ihe jikọrọ gị na ha, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ị bụ onye ihere. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, aha ya bụ Anita, sịrị: “Anaghị m achọ ka ọ bụrụ m ga-ekwulite okwu. Ụjọ m bụ na m nwere ike kwuo ihe na-enweghị isi na ọdụ.”

Ihe Baịbụl kwuru. “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” (Ilu 18:1) N’eziokwu, ịnọrọ onwe gị ga-eme ka ihe ka njọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị na-akpa iche, nsogbu gị ka ga-adị ebe ọ dị. Owu na-ama gị ka ga-eme ka i chee na o nweghị ndị i nwere ike ịna-akpa nso. I chewe otú ahụ, ị ga na-agbara ndị mmadụ ọsọ, nke ahụ emeekwa ka ị na-akpa iche, owu ana-amakwu gị ruokwa mgbe i lebaara nsogbu gị anya.

“Ndị mmadụ anaghị ama ihe dị ibe ha n’obi. Ọ bụrụ na ị gwaghị ndị mmadụ ihe ị chọrọ, ị gaghị enweta ihe ahụ. Ọ bụrụ na ị na-anọrọ onwe gị, ị gaghị enwe ndị enyi. Ị ga-agbarịrị mbọ tupu i nwee ndị enyi. I kwesịghị iche na onye ahụ ị chọrọ ka gị na ya bụrụ enyi ga-abịa mete gị enyi. Ọ bụ aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri.”—Melinda, ọ dị afọ iri na itoolu.

NKE ABỤỌ: Ya adịla gị ọkụ ọkụ imete enyi

Ihe na-akpata ya. Ọ na-adị ọtụtụ ndị ọkụ n’obi inwe enyi, nke a na-emekwa ka ha mete ndị ọjọọ enyi. Ha na-eche na ọ ka mma imete onye ọ bụla ha hụrụ enyi karịa ịnọ n’enweghị enyi. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise, aha ya bụ René, sịrị: “Mgbe mbụ, obi na-ajọ m njọ ma m cheta na esoghị m n’òtù ndị a ma ama n’ụlọ akwụkwọ anyị. Ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m mee ihe ọ bụla ha na-eme ka mụ na ha nwee ike ịbụ enyi, a sịgodị na ime ihe ahụ ga-akpatara m nsogbu.

Ihe Baịbụl kwuru. “Ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe,” ma ọ bụ, dị ka nsụgharị Baịbụl ọzọ si kwuo ya, “ị ga-emerụ onwe gị ahụ́ ma gị na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ihe amaokwu Baịbụl a na-ekwu abụghị na ndị ahụ ọ kpọrọ “ndị nzuzu” enweghị ihe ha ma. Ha nwere ike ịbụ ụmụ akwụkwọ isi na-aghọ nkọ. Ma, ọ bụrụ na ha anaghị eme ihe Baịbụl kwuru, ha bụ ndị nzuzu n’anya Chineke. Ị ga-emerụ onwe gị ahụ́ ma ọ bụrụ na ị na-eme ka ogwumagala, ya bụ, ime ka ị̀ bụ ihe ị na-abụghị ka gị na ha wee dịrị ná mma.—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

“Ọ bụghị onye ọ bụla anyị hụrụ ka anyị na ya kwesịrị ịna-akpa. Onye ọ bụla nke chọrọ ka ị gbanwee àgwà ọma ị na-akpa ka gị na ya wee bụrụ enyi ekwesịghị ịbụ enyi gị. Ndị enyi gị kwesịrị ịbụ ndị hụrụ gị n’anya n’eziokwu nakwa ndị ga-enyere gị aka.”—Paula, ọ dị iri afọ abụọ na otu.

Echela ka ndị ọzọ bịa mete gị enyi, gaa mete ha enyi

Echerela ka ndị ọzọ bịa gwa gị ka gị na ha kpawa. Otu nwa okorobịa dị iri afọ abụọ na otu, aha ya bụ Gene sịrị: “Ọ bụghị mgbe niile ka anyị kwesịrị ịtụ anya ka ọ bụrụ ndị ọzọ ga-ebu ụzọ bịakwute anyị. Anyị kwesịrị ibu ụzọ gakwuru ha.” E nwere ihe abụọ ga-enyere gị aka ime nke a. Ha bụ:

Mete ndị na-abụghị ndị ọgbọ gị enyi. Ọ ga-abụ na Jọnatan ji iri afọ atọ tọọ Devid. N’agbanyeghị nke a, ha bụ ezigbo enyi. * (1 Samuel 18:1) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ndị tọrọ anyị nwere ike ịbụ ndị enyi anyị. A sịdị ka e kwuwe, ihe mere i ji asị na i nweghị ndị enyi bụ na ị chọrọ ka ndị enyi gị bụrụ naanị ndị ọgbọ gị. Nke a yiri mmadụ ịnọ na mmiri na-achọ mmiri ọ ga-aṅụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ gị na ha nwere ike ịbụ enyi. Otu n’ime ụzọ ị ga-esi ama ha bụ imete ndị gị na ha na-abụghị ọgbọ enyi.

“Mama m gwara m ka m gbaa mbọ ka mụ na ndị tọrọ m nọ n’ọgbakọ anyị na-akpa nkata. Ọ gwara m na m ga-achọpụta na ihe ndị na-amasị m na-amasịkwa ha. Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Enweela m ọtụtụ ndị enyi ugbu a.”—Helena, ọ dị iri afọ abụọ.

Mụta otú ka mma gị na ndị ọzọ ga-esi na-akpa nkata. Ịkpa nkata adịghị mfe, karịchaa, ma ọ bụrụ na ị bụ onye ihere. Ma, ị ga-emeli ya. Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ (1) ige ntị, (2) ịjụ ajụjụ, na (3) ịhụ ndị ọzọ n’anya.

“M na-ege ntị nke ọma mgbe mmadụ na-ekwu okwu, anaghị m achọ ka ọ bụrụ m na-ekwucha ihe niile. Mgbe m na-ekwu okwu, m na-agba mbọ ka m ghara ịna-eto onwe m ma ọ bụkwanụ na-akatọ ndị ọzọ.”—Serena, ọ dị afọ iri na asatọ.

“Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkọrọ m ihe m na-amaghị, m na-agwa ya ka ọ kọwaara m ya nke ọma. Nke a nwere ike ime ka o medaa obi ala gwa m ihe ahụ.”—Jared, ọ dị iri afọ abụọ na otu.

O nwere ike ịbụ na ị bụghị onye okwu. Nke a adịghị njọ. Anyị anaghịkwanụ ekwu na i kwesịrị ịbụ onye ekwurekwu. Ma, ọ bụrụ na ọ dị gị ka i nweghị ndị gị na ha na-akpa, gbalịa mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a. I nwere ike mechaa kwuo ihe otu nwa agbọghọ, aha ya bụ Leah, kwuru. Ọ sịrị: “Abụ m onye ihere, ọ bụ ya mere m ji na-agbalị ka mụ na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka ya na ndị ọzọ bụrụ enyi, onye ahụ kwesịrị ịna-emete ndị ọzọ enyi. Ọ bụ ya mere m ji mụta ịna-ekwuru ndị mmadụ okwu.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 31 Ọ ga-abụ na Devid erubeghị iri afọ abụọ mgbe Jọnatan ghọrọ enyi ya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Anyị bịa ọmụmụ ihe, m na-agbalị ka mụ na ndị m na-anaghị echeta ikwuru okwu kwuo okwu. Achọpụtara m na naanị ikele mmadụ ekele nwere ike ime ka gị na onye ahụ bụrụ enyi!”

“Na mbụ, m na-anọrọ onwe m na-eche na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ebe m nọ nakwa na o nweghị otú mụ na ha ga-esi nọrọ kpawa nkata. O siiri m ike ịgbanwe. Ma, mgbe m mechara na-agakwuru ha, mụ na ha malitere tọwa, ya emeekwa ka m gbanwee.”

“M bidoro na-etinyetụ ọnụ ma m nọrọ ebe ndị tọrọ m na-akpa nkata. Na mbụ, o siiri m ezigbo ike. Ma, o mechara baara m uru n’ihi na m dị obere nweta ezigbote ndị enyi na-enyere m aka ma m nwee nsogbu.”

[Foto]

Lauren

Reyon

Carissa

[Igbe dị na peeji nke 12]

IHE Ị GA-AJỤ NDỊ MỤRỤ GỊ

Mgbe unu hà ka m, ò siiri unu ike ịchọta ndị unu ga na-akpa nso? Olee ụdị ndị ọ kacha siere unu ike ịkpa nso? Gịnị ka unu mere iji merie nsogbu ahụ?

․․․․․

[Ihe Osise dị na peeji nke 12]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OTU NSOGBU NWERE IKE KPATA NSOGBU ỌZỌ

OWU ahụ

na-ama gị

ga-eme ka . . . ↓

. . . ị NA-AKPA ICHE,

ya emee

↑ ka . . .

. . . ị na-agbara ndị ọzọ ỌSỌ, ←

owu ana-ama

gị.