Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú M Si Kwụsị Ime Ihe Ike

Otú M Si Kwụsị Ime Ihe Ike

Otú M Si Kwụsị Ime Ihe Ike

Dị ka Jose Antonio Nebrera si kọọ

OLEE ihe na-eme ka mmadụ na-eme ihe ike? Amụtara m ime ihe ike n’ihi na ọ bụ aka e ji zụọ m. Papa m bụ otu n’ime ndị uwe ojii ọchịchị Spen nyere ọzụzụ pụrụ iche n’otú e si ata mmadụ ahụhụ. Mgbe papa m dị obere, nna ya anaghị emere ya ebere ma ya tiwe ya ihe, papa m mụtakwara ime otú ahụ. Ọ na-apịakarị m nnukwu belt ya. Nke ka njọ bụ na ọ na-akpọkarị m onye iberiibe ma na-apa nwanne m nwaanyị nke m tọrọ apa. Mama m na-atụ papa m ụjọ, ọ naghịkwa achọ ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe. Ụjọ ọ na-atụ ya mekwara ka ọ ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka obi rutu m ala ma ọ bụ metụkwanụ m ka nwata ọ hụrụ n’anya.

Mụ na ụmụaka ibe m nọrọ n’ụlọ akwụkwọ, ana m eme ka onye ụwa zuuru ka à ga-asị na obi ụtọ m nwere enweghị atụ. Ndị mmadụ nwere ike na-eche na obi na-adị m ụtọ mgbe niile nakwa na mụ enweghị nsogbu. Ma, ihe a m na-eme bụ ịmachi ụwa jọọjị. Achọghị m ka ndị mmadụ mara ụdị ụjọ na-atụ m na ụdị iwe na-ewe m. A gbasaa akwụkwọ, ike ịla na-agwụ m n’ihi na ụjọ na-atụ m na papa m ga-akpọ m onye iberiibe otú o si akpọ m ma ọ bụkwanụ tie m ihe.

Mgbe m dị afọ iri na atọ, abanyere m ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị ụkọchukwu, bụ́ ebe m bi ebi, ka m wee gbaara nsogbu dị n’ụlọ anyị ọsọ. E nwedịrị mgbe m kpebiri ịbụ ụkọchukwu. Ma, otú ihe si na-aga n’ụlọ akwụkwọ ahụ emeghị ka obi na-adị m ụtọ. Anyị na-ebili n’elekere ise nke ụtụtụ, jiri mmiri oyi saa ahụ́. Anyị sachaa ahụ́, ihe anyị ga-emezi n’ụbọchị ahụ niile bụ ịmụ ihe, ikpe ekpere, ikpe chọọchị, na izutụ ike. Anaghịkwa agbanwe ihe ndị a agbanwe.

A gwara anyịnwa bụ́ ụmụ akwụkwọ ka anyị na-agụ akụkọ gbasara ndị a sị na ha bụ ndị nsọ, ma, Baịbụl esoghị n’ihe anyị na-amụ. Naanị otu Baịbụl ka e nwere n’ụlọ akwụkwọ ahụ, e tinyekwara ya n’ihe e ji ugegbe rụọ. Onye ọ bụla chọrọ ịgụ ya na-aga nata ikike pụrụ iche.

Mgbe m nọfere afọ abụọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, a malitere ịna-enwe oge ọpịpịa. M na-agbalị ka m rie oké nri otú ọ ga-abịa m ọrịa ka m ghara iso na-enwe ọpịpịa. Ma, nke ahụ enweghị isi. Emegidere m ihe a ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ atọ, ike ya agwụ m. Nke a mere ka m hapụ ụlọ akwụkwọ ahụ lọta ụlọ anyị. Adị m afọ iri na isii mgbe ahụ.

Ebidoro M Ịchọ Ihe Ga-eme M Obi Ụtọ

Mgbe m lọtara ụlọ anyị, amalitere m ịkụ ọkpọ na ịgba mgba. Isi malitere ibu m n’ihi na ịkụ ọkpọ na ịgba mgba bịara doo m anya. Ma, ihe ndị a m na-eme mere ka m jiri aka ike na-enweta ihe ọ bụla m chọrọ otú ahụ papa m na-eme.

Ma, mgbe m dị afọ iri na itoolu, e nwere ihe merenụ, bụ́ nke kụziiri m na m kwesịrị ịkwụsịlatatụ otú m si akpa ike. Ọ bụ mgbe ahụ ka m matara Encarnita, m mechakwara lụọ ya mgbe ọnwa itoolu gafere. Naanị ihe Encarnita ma bụ na m na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-egosi ha obiọma, nakwa na obi na-adị m ụtọ. Ọ maghị na m bụ onye obi ọjọọ. Otú m dị bịara doo ewu na ọkụkọ anya mgbe e were m n’ọrụ soja. N’oge ahụ, nwunye m ka mụrụ ọkpara anyị ọhụrụ.

M ji aka m kwuo na m chọrọ iso ná ndị soja na-alụrụ Spen agha n’ala ọzọ. Ihe mere m ji kwuo ya bụ ka a ghara ịkpụ m isi a na-akpụ ndị soja nkịtị nakwa ka m were ohere ahụ na-aga mba dị iche iche. Obi m bụ na e ziga anyị n’ọzara dị Moroko nso, m ga-enwe ike na-aga ebe ihe siri ezigbo ike, bụ́kwanụ nke ga na-enye m obi ụtọ. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-eme ka m gbaara ọrụ m kwesịrị ịna-arụ n’ezinụlọ m ọsọ. Ma, ihe ndị a niile mere ka a matakwuo na m bụ ajọ mmadụ.

Ọ raghị ahụ́ mụ na otu soja nke na-emesi ndị soja ọhụrụ ike esee okwu. Ọ na-ewe m iwe ịhụ ebe a na-emegbu mmadụ, m nwedịrị ike ịlụrụ ihe ahụ ọgụ ma m chee na o zighị ezi. O nwere otu ụtụtụ a nọ na-akpọ aha, mụ amaa njakịrị, soja ahụ arọgharịa ihe njakịrị ahụ pụtara. Mgbe o weliri aka ka o tie m ihe, mụ ahịjie ya aka ozugbo, gbaa ya úkwù n’ala. M jidere aka ya n’ala ka ọ ghara ịgba m égbè.

Nke a mere ka a taa m ahụhụ ọnwa atọ. A kpọchiri m n’obere ụlọ mkpọrọ a kpọchiri ihe dị ka mmadụ iri atọ. N’oge ahụ niile m nọ ebe ahụ, agbanweghị m efe m yi. E nwere otu soja obi ọjọọ ịpịa ndị mmadụ ihe na-atọ ụtọ. Ma, otu ụbọchị, m gwara ya na m ga-egbu ya ma ọ nwaa anwa pịa m ihe. N’ihi ihe ahụ m gwara ya, ya apịazie m ọnụ ụtarị atọ kama iri atọ. Ihe a niile mere ka m na-akpakwu ajọ ike otú ahụ ndị na-ata m ahụhụ na-akpa.

Mgbe M Gara Ọrụ Nzuzo

Mgbe a na-enye m ozuzu ka m soro na-aga n’ala ebe ihe na-esi ike, eji m aka m họrọ ịga mee ụdị ihe ọ bụla a chọrọ. Ma, amaghị m na ọ bụ onwe m ka m na-ekotere nsogbu. Ọ bụ maka ihe ahụ m họọrọ mere e ji nye m ọzụzụ pụrụ iche a na-enye ndị soja na-aga ebe ihe tara ike, ọ bụkwa ya mere e ji kụziere m otú e si eji ngwá agha dị iche iche alụ agha. E mechaziri ziga m Lanli, Veginịa, nke dị n’Amerịka, ka a zụọ m n’otú e si eledo obodo.

Tupu mụ amara ihe na-eme, esorola m ná ndị soja na-eledo obodo. Malite n’afọ 1960, eso m gaa na-eledo ọtụtụ obodo. Eso m ná ndị na-ejide ndị na-ere ọgwụ ọjọọ na ndị na-ebubata ngwá agha n’ebe Etiti Kọntinent Amerịka nakwa n’ebe Ndịda Kọntinent Amerịka. A gwara anyị ka anyị na-egbu ndị anyị jidere. Ọ na-ewute m na m so gbuo ndị e jidere n’oge ahụ. O nweghị onye n’ime ndị e jidere a hapụrụ ndụ ruo otu nkeji ma e wezụga ndị a chọrọ ịjụpụta ihe n’ọnụ.

E mechara gwa m ka m ledowe ndị isi agha Spen, n’ihi na a chọrọ ịma ndị ọchịchị Franco ji aka ike na-achị na-adịghị mma n’obi. Anyị gakwara ledoo Frans iji mara ma è nwere ndị Spen bi na Frans ọchịchị Franco na-adịghị mma n’obi. Ihe anyị bu n’obi gaa iledo ebe ahụ bụ ka anyị tọrọ ndị ọchịchị Franco kacha ewe iwe ma kpọrọ ha lọta Spen gbuo ha.

Ọrụ ikpeazụ m rụrụ bụ ịhazi ndị agha m ga-akpọrọ gaa kwatuo ọchịchị nke otu obere mba dị n’Afrịka. A gwara anyị ka anyị wakpo ogige ndị agha dị n’isi obodo ha ma weghara ebe onyeisi ala ahụ bi. Anyị batara ná mba ahụ n’ime abalị ma jiri naanị awa anọ mee ihe anyị bịara. Mmadụ atọ n’ime ndị agha anyị nwụrụ, anyị gbukwara ọtụtụ ndị agha mba ahụ. Eso m gbuo ndị ahụ.

Akọnuche m bidoro ịpịa m ụtarị n’ihi ihe ndị a m mekọjuru. Anaghị m ehi ụra n’abalị n’ihi na ana m arọ nrọ ebe m ji aka na-anyagbusi ndị mmadụ. Ná nrọ ndị ahụ m na-arọ, m na-ahụ otú egwu si ejide ndị m chọrọ igbu.

M kpebiri na agaghị m egbu mmadụ ọzọ. M tinyere akwụkwọ ma gwa ha na mụ arụjuola. Ma, ka ọnwa atọ gafere, ndị ka m n’ọkwa gwara m ka m gaa ledoo ebe ọzọ. M gbagara Swizaland, mgbe ọnwa ole na ole gachara, nwunye m bịara soro m biri na Bazụl. N’oge ahụ, nwunye m amaghị ihe m na-arụbu.

O Siiri M Ike Ịhapụ Ihe Ọjọọ M Na-eme

N’afọ atọ ahụ m nọ na-arụ ọrụ soja, nwunye m na Ndịàmà Jehova nọ na-amụ Baịbụl na Spen. Ọ gwara m na ya amatala eziokwu banyere Chineke, otú o sikwa jiri obi ụtọ na-ekwu ihe ọ mụtara bịara na-amasị m. Ozugbo ahụ, anyị chọtara Ndịàmà Jehova bi na Swizaland ma gwa ha ka ha bịa mụwara anyị Baịbụl.

Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m matara ihe Chineke bu n’obi imere ụmụ mmadụ. Ọ bụ eziokwu na m chọrọ ịna-eme ihe m na-amụta na Baịbụl, ọ dịrịghị m mfe. Ihe kacha siere m ike ịkwụsị bụ obi ọjọọ m ji emeso ndị mmadụ ihe. Ma, ihe ndị m na-amụta na-atọ m ezigbo ụtọ. Mgbe a kụziiri m Baịbụl ọnwa ole na ole, agwara m onye na-amụrụ m Baịbụl na m chọrọ iso na-aga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ.

Jehova nyeere m aka, mụ emechaa kwụsị iwe iwe ọkụ. E mechakwara mee mụ na nwunye m baptizim. Mgbe m dị iri afọ abụọ na itoolu, a họpụtara m ka m bụrụ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova.

Anyị kpebiri ịlaghachi Spen n’afọ 1975. Ma, ndị soja echefubeghị m. Ha gwara m ka m bịa soro ha gaa ọrụ pụrụ iche ha chọrọ ịga. Ka nsogbu ghara ịdị, agbaghachiri m Swizaland ozugbo. Mụ na ezinụlọ m bi ebe ahụ ruo n’afọ 1996, bụ́ mgbe anyị lọghachiri Spen.

Ugbu a, nwa m nwoke alụọla nwaanyị, mụta ụmụ abụọ. Nwa m nwaanyị alụọkwala di, ha niile na-efekwa Jehova. Ihe ọzọ bụ na kemgbe ahụ, enyerela m ihe dị ka mmadụ iri na isii aka ka ha mata uche Jehova. Otu n’ime ha bụ otu nwa okorobịa sobu na-eme ngagharị iwe n’ebe ugwu Spen. Ihe a niile na-eme m obi ụtọ.

Ana m arịọ Jehova mgbe niile ka o nyere m aka ka m ghara ịna-akpa ajọ ike m na-akpabu nakwa ka m ghara ịna-arọ nrọ ọjọọ ndị m na-arọ. Ka m na-agba mbọ ime ihe dị mma, anaghị m ahapụ ime ihe e dere n’Abụ Ọma 37:5. Ebe ahụ sịrị: “Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova, dabere n’ebe ọ nọ, ya onwe ya ga-emekwa ihe.” Jehova emeerela m ihe a o kwuru. O nyeerela m aka ịkwụsị ime ihe ike. Ihe a Jehova meerela mụ na ezinụlọ m bụ ihe ọma na-enweghị atụ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Mgbe m dị afọ iri na atọ banye ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị ụkọchukwu, bụ́ ebe m bi ebi

[Foto dị na peeji nke 15]

N’afọ 1968, mgbe m kwụsịrị ọrụ ma si n’ọfịs ndị soja a na-eziga agha ná mba ọzọ na-apụta

[Foto dị na peeji nke 15]

Foto mụ na nwunye m sere n’oge na-adịbeghị anya