Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nwere obere nwa n’ụlọ, o nwere ike ịbụ na ọ na-esiri gị ike ịzụ ya. Dị ka ihe atụ, olee ihe i nwere ike ime ma nwa ahụ bido ime isi ike? Olee otú ị ga-esi kụziere ya ihe bụ́ ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, oleekwa otú dị mma ị ga-esi mee ka ọ mara na ihe o mere adịghị mma? Lee otú ndị nne na nna ụfọdụ sirila zụọ ụmụaka ha.

ISI IKE ỤMỤAKA

“Mgbe nwatakịrị dị ihe dị ka afọ abụọ, ọ na-achọkarị ka papa ya na mama ya na-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ọ bụ ihe nwa anyị nwoke na-emebu. Ọ bụrụ na e mereghị ya ihe ọ chọrọ, ọ na-atụfu ihe ọ bụla ruru ya aka. Ebe ọ bụ nwa mbụ anyị mụrụ, anyị amaghị na ụmụaka na-eme otú ahụ. Ndị ọzọ nọ na-agwa anyị na ọ bụ otú ụmụaka na-eme mgbe ha hà otú a, ma nke a emeghị ka obi ruo anyị ala.”​—Susan, onye bi na Kenya.

“Mgbe nwa anyị nwaanyị dị afọ abụọ, ọ na-abụ obere ihe mee ya atụọ onwe ya n’ala, bewe ákwá, gbawa ụkwụ lịka lịka . . . Ihe a ọ na-eme na-ewe anyị iwe. Anyị gụgụwa ya, ọ naghị ekwe. Ihe anyị na-emezi bụ ịkpọrọ ya kpọba n’ime ụlọ ya, ma jiri nwayọọ gwa ya na mgbe ọ bụla obi jụụrụ ya, o nwere ike ịpụta bịa gwa anyị ihe bụ́ iwe ya. Obi mechaa jụrụ ya, otu onye n’ime anyị na-agakwuru ya n’ime ụlọ ya kọwaara ya ihe mere o kwesịghị ime ihe ahụ o mere. Aka ahụ anyị ji soo ya magburu onwe ya. O nwedịrị mgbe anyị nụrụ ka ọ nọ na-ekpe ekpere, na-arịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Ka oge na-aga, ọ kwụsịrị ime isi ike.”​—Yolanda, onye bi na Spen.

“Mgbe ụfọdụ, ụmụaka na-akpachara anya mee ihe na-adịghị mma, ka ha mara ihe ndị mụrụ ha ga-eme. Ọ bụrụ na nwata emee ihe ị sị ya emela, gị agba ya nkịtị, o nwere ike ichewe na ihe ahụ o mere dị mma. Anyị chọpụtara na ọ bụrụ na anyị agwa ụmụ anyị na anyị agaghị eme ihe a, hụkwa na anyị emeghị ya, ọ na-eme ka ha mata na ọ bụghị ịda n’ala bewe ákwá ga-eme ka anyị mee ihe ahụ anyị sị na anyị agaghị eme.”​—Neil, onye bi na Briten.

ỊDỌ AKA NÁ NTỊ

“Ọ bụrụ na nwatakịrị erubeghị afọ ise, ọ na-esi ike ịma ma ọ̀ na-ege papa ya na mama ya ntị. O nwee ihe ị chọrọ ka ọ na-eme, na-agwa ya ya ugboro ugboro. Mgbe ị na-agwa ya ihe ahụ, na-emegharị ahụ́, ọnụ siekwa gị ike.”​—Serge, onye bi na Frans.

“N’agbanyeghị na ọ bụ anyị ji aka anyị zụọ ụmụaka anọ anyị mụrụ, onye nke ọ bụla n’ime ha nwere àgwà nke ya. Otu nwere ike bewe ákwá ma ọ mata na ya emeela ihe anyị na-achọghị ka o mee. Nke ọzọ nwere ike kpachara anya mee ihe ọjọọ ka ọ mara ihe anyị ga-eme. Mgbe ụfọdụ, nwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ka o mee, anyị nwere ike lee ya sọọsọ anya ma ọ bụ baara ya mba. Ma, e nwekwara mgbe anyị na-enye ya ezigbo ntaramahụhụ.”​—Nathan, onye bi na Kanada.

“Ọ dịghị mma ị gwa nwa gị na ị gaghị eme ihe a, e mechaa gị emee ya. Ma, nke ahụ apụtaghị na nne na nna ga-eji aka ike na-azụ nwa ha. Ọ bụrụ na nwa anyị emee ihe na-adịghị mma, rịọ mgbaghara, anyị anaghị atacha ya ahụhụ otú anyị gaara esi ata ya.”​—Matthieu, onye bi na Frans.

“Abụghị m nne na-anaghị ekwe ụmụ ya megharịa ahụ́. Ma, nwa m mee ihe m sị ya emela, anaghị m ahapụ ime ya ihe m sị na m ga-eme ya. Nwa m nwoke dị afọ atọ, ọ makwa na m ga-enye ya ntaramahụhụ ma o mee ihe na-adịghị mma. Nke a mere ka ọ na-akpachara anya n’ihe ọ na-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịchara m mfe ịdọ nwa m aka ná ntị mgbe ike gwụrụ m. Ma, ana m agbalị mee ya ihe m kwesịrị ime ya, ka ọ ghara iche na anaghị m eme ihe m kwuru. Nne na nna kwesịrị ịna-eme ihe ha kwuru.”​—Natalie, onye bi na Kanada.

I KWUO IHE, MEE YA

“Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ekwuo ihe, ghara ime ihe ahụ o kwuru, nwatakịrị anaghị echefu ya.”​—Milton, onye bi na Bolivia.

“Mgbe ụfọdụ, nwa m nwoke na-abịa gwa m ka m meere ya otu ihe. M jụ, ya ejiri ụzọ ọzọ gwa m ya ka ọ mara ma m̀ ka ga-ajụ. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mụ ajụ, mama ya ekweta, ọ na-ama na mụ na mama ya enweghị otu olu. Mgbe ahụ, ya achọwa otú ọ ga-esi kụkọta isi anyị abụọ.”​—Ángel, onye bi na Spen.

“Mgbe obi dị m mma, nwa m nwoke mee ihe m gwara ya emela, mụ agba ya nkịtị. Ma ọ bụrụ mgbe obi na-adịghị mụ mma, mụ emesie ya ike. M chọpụtara na ime otú ahụ na-eme ka nwa m na-emekwu isi ike.”​—Gyeong-ok, onye bi na Koria.

“E kwesịrị ime ka ụmụaka mata na o nweghị mgbe àgwà na-adịghị mma ga-emecha bụrụ àgwà dị mma.”​—Antonio, onye bi na Brazil.

“Ọ bụrụ na nne na nna anaghị eme ihe ha kwuru, nwa ha nwere ike ịna-eche na a naghị eji ihe ha kwuru n’aka, nakwa na ihe na-ekpebi ma hà ga-eme ihe ha kwuru bụ otú obi dị ha. Ma ọ bụrụ na nne na nna ekwuo ihe, mee ya, ụmụaka ga-ama na o nweghị mgbe ndị mụrụ ha ga-ekweta ka ha mee ihe ha sị ha emela. O so n’otú ndị nne na nna na-esi elekọta ụmụ ha ma na-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya.”​—Gilmar, onye bi na Brazil.

“Ụmụaka hụ na e nwere ndị bịara n’ụlọ ha, ha nwere ike jiri ohere ahụ chọọ ka papa ha ma ọ bụ mama ha meere ha ihe ha sị na ha agaghị eme. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha na-eche na ndị mụrụ ha emekataghị jụ ime ihe ahụ mgbe ahụ ndị ọzọ nọ ya. Ọ bụrụ na agaghị m emere nwa m nwoke ihe ọ na-arịọ m, m na-agwa ya hoo haa na o nweghị ihe yanwa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ rịọrọ n’arịrịọ ga-eme ka m mee ya.”​—Chang-seok, onye bi na Koria.

“Nne na nna kwesịrị ịna-enwe otu olu. Ọ bụrụ na e nwere ihe mụ na nwunye m na-ekwekọrịtaghị, anyị na-ekwurịta ya mgbe naanị anyị abụọ nọ. Ụmụaka na-ama mgbe papa ha na mama ha na-enweghị otu olu, ha na-ejikarịkwa ohere ahụ kụkọta isi ha abụọ.”​—Jesús, onye bi na Spen.

“Nwatakịrị mata na papa ya na mama ya na-enwe otu olu, nakwa na o nweghị otú ọ ga-esi akụkọta isi ha abụọ, ọ ga-ama na ya mee ihe na-adịghị mma, ihe papa ya ga-eme ya agaghị adị iche n’ihe mama ya ga-eme ya.”​—Damaris, onye bi na Jamanị.

“Ọ bụghị naanị mgbe mụ na nwunye m gwara nwa anyị ihe anyị ga-eme ya ma o mee ihe na-adịghị mma ka anyị na-eme ihe anyị kwuru. Kama, anyị kwe ya nkwa ịzụtara ya ihe, anyị na-azụtara ya ihe ahụ. Nke a na-eme ka ọ mata na anyị na-eme ihe anyị kwuru.”​—Hendrick, onye bi na Jamanị.

“Ọ bụrụ na ọga m na-eme ọ sị m mee ihe a taa, echi ya asị m emela ya, ọ ga-ewe m iwe. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụaka. Obi na-aka eru ha ala ma ha mata na papa ha na mama ha anaghị eme ha sị ha mee ihe a taa, echi ha asị ha emela ya. E kwesịrị ime ka ha mata ihe a ga-eme ha ma ha mee ihe na-adịghị mma nakwa na a gaghị emecha gbanwee ihe ahụ e kwuru na a ga-eme ha.”​—Glenn, onye bi na Kanada.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ka Ee unu bụrụ Ee, ka Ee e unu bụrụkwa Ee e.”​—Jems 5:12

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

IHE NDỊ MERE N’EZINỤLỌ ỤFỌDỤ

Ihe Anyị Mere Mgbe Nwunye M​—Tụụrụ Ime Anyị Na-atụghị Anya Ya

Dị ka Tom Han na nwunye ya bụ́ Yoonhee si kọọ

Tom: Naanị ọnwa isii ka mụ na nwunye m biri, ya adịrị ime. Mgbe ọ chọpụtara, gwa m, mụ emee ka à ga-asị na e nweghị nsogbu ọ bụla dịnụ. Ihe mere m ji mee otú ahụ bụ ka obi ruo ya ala. Ma, n’ime obi m, ezigbote ụjọ ji m.

Yoonhee: Ike ụwa gwụrụ m, ezigbote ụjọ abịa m. M bere ezigbo ákwá n’ihi na echeghị m na anyị ga-azụli nwa ahụ. Echeghịdị m na m ga-elekọtali nwata ka nne.

Tom: Mgbe ahụ, echeghị m na m ga-emeli ihe nna na-emere nwa ya. Ma, mgbe anyị na ndị mụrụla ụmụ kparịtachara nkata, anyị chọpụtara na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-atụrụ ime mgbe ha na-atụghị anya ya. Ihe ọzọ nyeere anyị aka bụ na ndị ọzọ nwere ụmụaka gwara anyị na ịzụ nwa na-atọ ụtọ. Ka oge na-aga, ụjọ ahụ na-atụ m kwụsịrị, mụ atụwazie anya mgbe nwunye m ga-amụ nwa ahụ.

Yoonhee: Mgbe m mechara mụọ Amanda nwa anyị nwaanyị, nsogbu ndị ọzọ bidoro. Mgbe ọ bụla, Amanda nọ n’ákwá. Ruo ọtụtụ izu, nwatakịrị a ekweghị m hie ụra. Nri ekweghị m oriri, ya emee ike ana-agwụ m. Anabughị m achọ ịnọ ebe ndị mmadụ nọ. Ma, emechara m chọpụta na ịnọ naanị m agaghị enyere m aka. Amaliteziri m ịna-agakwuru ndị ọ̀ dị ka ọ dị m. Mụ na ha nọrọ, onye nke ọ bụla na-akọ nsogbu nwa ya na-enye ya. Nke a mere ka m mata na ọ bụghị naanị m ka nwa ya na-enye nsogbu.

Tom: Agbalịrị m ime ka ihe na-aga otú o kwesịrị n’ezinụlọ anyị. Dị ka ihe atụ, ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, mụ na nwunye m gbara mbọ ịhụ na anyị na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Ihe ọzọ bụ na ịzụ nwa na-efu ego. Mgbe ụfọdụ, ihe a ga-eji ego eme nwere ike dapụta mgbe ị na-atụghị anya ya. Anyị gbalịrị hụ na anyị na-ekowe akpa anyị ebe aka anyị ga-eru, ghara ịna-eji ụgwọ n’ihi na ọ ga-eme ka ihe ka njọ.

Yoonhee: Echeburu m na agaghị m agali ozi ọma n’ihi nsogbu nwa m na-enye. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmadụ na-achọkarị iku ụmụaka. Nke a mere ka m jisie ike na-aga ozi ọma, ghara iche na nwa m enyegbuola onwe ya ná nsogbu.

Tom: Baịbụl kwuru na ụmụ bụ “ihe nketa si n’aka Jehova,” bụrụkwa “ụgwọ ọrụ” Chineke na-akwụ dị na nwunye. (Ọma 127:3) A sị m kwuo, m ga-asị na ihe a Baịbụl kwuru gosiri na nwa bụ onyinye pụrụ iche. Otú ahụ onye e nyere onyinye ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-eji onyinye ahụ kpọrọ ihe ka onye Chineke nyere nwa ga-ejikwa aka ya kpebie ma ọ̀ ga-eji nwa ya kpọrọ ihe. Amụtala m na ka nwata na-eto ka ndị mụrụ ya na-agbanwe otú ha si azụ ya. Ọ bụrụ na mụ ejighị otú ahụ zụọ nwa m nwaanyị, o nwere ike imebinahụ m.

Yoonhee: Mgbe ụfọdụ, ihe mmadụ na-atụghị anya ya nwere ike ime. Ma, nwaanyị ịtụrụ ime ọ na-atụghị anya ya adịghị njọ. Nwa m nwaanyị dị afọ isii ugbu a, ọ na-atọkwa m ezigbo ụtọ mụ na ya ịnọ.

[Foto]

Tom, nwunye ya, na Amanda nwa ha nwaanyị