Ka Ha Na-eto
Ka Ha Na-eto
“Mgbe anyị dị obere, ndị mụrụ anyị ji Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible kụziere anyị ihe. Ugbu a, nwa anyị nwoke dị otu afọ na ọnwa anọ, anyị jikwa ya na-akụziri ya ihe. N’agbanyeghị na Joshua nwa anyị ka dị obere, anyị ejirila akwụkwọ a kụziere ya aha mmadụ iri atọ na ise e dere na Baịbụl. O ji aha ndị ahụ agụ egwú.”—Timothy na Ann.
“Nwa m nwoke dị afọ ise. Ọ na-amasị ya ile ihe ndị e sere n’akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ọ makwa ihe ọtụtụ n’ime ha pụtara. M na-eji akwụkwọ a akụziri ya otú ọ ga-esi na-emeri nsogbu ndị na-abịara ya ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe ndị ọzọ. Akwụkwọ a enweghị atụ.”—Jennifer.
“Akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, ga-enyere ndị na-eto eto aka imeri nsogbu ọ bụla ha na-enwe ná ndụ. Adị m afọ iri na itoolu. Akwụkwọ a enyerela m aka ikpebi ihe ndị m chọrọ ime ná ndụ, ịsa anya ná mmiri n’okwu gbasara onye m ga-alụ, na ime ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma. Ma nwata ma dimkpa kwesịrị ịgụ akwụkwọ a.”—Courtney.
□ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
□ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
□ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ —Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
□ Biko, wetaranụ m otu akwụkwọ a m kanyere ✔ n’ebe a.
□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.