Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge A Kacha Amụta Ihe Ngwa Ngwa

Oge A Kacha Amụta Ihe Ngwa Ngwa

Oge A Kacha Amụta Ihe Ngwa Ngwa

NDỊ mmadụ na-ekwukarị na ụbụrụ nwa e ku n’aka na-aghọ nkọ. Ọ bụ eziokwu, n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka o ji amụta ọtụtụ ihe. O nweghị ihe anya ya na-anaghị ahụ, ọ na-anụkwa ọtụtụ ihe ndị na-eme gburugburu ya. Nwa e ku n’aka makwa otú ndị mụrụ ya na ndị ọzọ si emeso ya.

Nke ka nke bụ na obi na-atọ nwa e ku n’aka ụtọ ma ọ hụ ihu ndị mmadụ, nụ otú olu ha si ada ma ọ bụkwanụ ma ha bitụ ya aka. E nwere akwụkwọ otu nwoke aha ya bụ Penelope Leach dere gbasara ụmụ e ku n’aka. N’akwụkwọ ahụ, o kwuru, sị: “Nchọpụta e mere gosiri na ụmụaka na-achọkarị ịhụ ndị torola eto, ha na-achọkarịkwa ịnụ olu ha, na-achọkwa ka ha kuru ha. Ndị na-eme ihe ndị a ụmụaka na-achọ na-abụkarị ndị mụrụ ha.” Ka a sịkwa ihe mere ọrụ ndị nne na nna na-arụ mgbe e ku nwata n’aka ji baa ezigbo uru.

‘Ekwuru M Okwu Dị Ka Nwa Ọhụrụ’

Ọ na-eju ndị nne na nna na ndị dọkịta anya ma ha hụ otú nwa a mụrụ ọhụrụ na-esi amụta asụsụ naanị na ọ na-anụ ka ndị mmadụ na-asụ ya. Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na nwa a mụrụ ọhụrụ na-amalite ịmata olu mama ya n’ime ụbọchị ole na ole a mụrụ ya. Ọ na-achọkwa ịnụ ya kama ịnụ olu onye ọzọ. Mgbe ọ na-erula izu ole na ole, ọ matawala otú asụsụ ndị mụrụ ya na-asụ si dị iche n’asụsụ ọzọ. Mgbe ọ na-erukwala ọnwa ole na ole, ọ matawala ihe dị iche na mgbe mmadụ na-ekwu okwu na mgbe a na-eme ụzụ.

Pọl onyeozi dere, sị: ‘Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, ekwuru m okwu dị ka nwa ọhụrụ.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Olee otú nwa ọhụrụ na-esi ekwu okwu? Ị ga-asị na ọ na-ekwu ihe mmadụ na-anaghị aghọta. Ma, ọ̀ bụ ụzụ nkịtị ka ọ na-eme? Mbanụ! E nwere otu akwụkwọ Dr. Lise Eliot dere gbasara ụmụaka na otú ha si ekwu okwu. N’akwụkwọ ahụ, o kwuru na ikwu okwu adịghị mfe. Ka mmadụ nwee ike ikwu ihe onye ọzọ ga-aghọta, “ụbụrụ onye ahụ, egbugbere ọnụ ya, ire ya, okpo ya, na nkọlọ ya ga-agbakọ aka mepụta okwu ahụ.” Dr. Lise Eliot kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ịsị na ihe ahụ ụmụaka na-eme bụ ka a bịa gwusawa ha egwu, ma, ha sikwa otú ahụ amụ ikwu okwu.”

Nwa ọhụrụ kwuwe okwu otú ahụ o si ekwu, papa ya ma ọ bụ mama ya na-abịa gwusawa ya egwu, obi ana-atọ ya ụtọ, ha abụọ ana-akpa nkata. Ihe ahụ ya na papa ya ma ọ bụ mama ya na-eme na-enyere ya aka ịmụta otú ndị mmadụ na ibe ha si akparịta ụka. Nke a ga-abakwara ya uru ma o too.

A Kwụsị Ime Ya Otú E Si Eme Ya

Mere nke a mere nke a dị na nwa anaghị ekwe nwaanyị ku nwa n’aka na di ya zuru ike. Nwata bewe ákwá, a gbara bịa nye ya nri. O bewe ákwá, a gbara bịa gbanwee ya napkịn. O bewe ákwá, a gbara bịa kuru ya. Otú a e si apa ya dị mma. Ọ bụ ụzọ kachanụ ndị nne na nna si arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ, ya bụ, ilekọta nwa ha.—1 Ndị Tesalonaịka 2:7.

Otú a e si apa nwata ga-eme ka ọ na-eche na ya bụ elu na ala. Ọ na-emekwa ka o chewe na ọ bụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ka ndị torola eto, karịchaa papa ya na mama ya, ga na-eme. Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ na-eche adịghị mma, ma, anyị ma ihe kpatara ya. Cheta na a na-apa ya apa kemgbe ihe karịrị otu afọ. N’obi ya, e kwesịrị ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ozugbo. John Rosemond, bụ́ onye na-enye ndụmọdụ banyere otú ezinụlọ ga-esi na-ebi n’udo, dere, sị: “Ndị nne na nna na-eji ihe na-erughị afọ abụọ eme ka nwa ha chewe na ọ bụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ka a ga na-eme. Ma, ime ka nwa ahụ kwụsị iche otú ahụ na-ewe, ọ dịkarịa ala, afọ iri na isii. Ndị nne na nna kwesịrị ịna-apa nwa ha apa, ha kwesịkwara imecha mee ka ọ kwụsị iche na ọ bụ ihe niile ọ chọrọ ka a ga na-eme.”

Mgbe nwa ọhụrụ ahụ na-anọla ihe dị ka afọ abụọ, ọ matawala na otú ahụ o si eme adịghị mma. Ihe ga-eme ka ọ mata nke a bụ na ndị mụrụ ya anaghịzi apa ya apa, kama ha ebidola ịkụziri ya ihe. Nwa ahụ ga-amatazi ugbu a na ọ bụghị yanwa ga na-agwa ndị mụrụ ya ihe ha ga na-eme, kama na ọ bụ hanwa ga na-agwa ya ihe ọ ga na-eme. Ndị mụrụ ya anaghịzi eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ka ha mee, o nwekwara ike ime ka obi na-ajọ ya njọ. Ma, ebe ọ bụ na ọ ka chọrọ ka ndị mụrụ ya na-eme ihe ọ chọrọ, gịnịzi ka ọ ga-ebido mewe?

Ihe E Nwere Ike Ime Ma Nwata Bido Ime Isi Ike Ụmụaka

Mgbe ụmụaka dị ihe dị ka afọ abụọ, ọtụtụ n’ime ha na-ebido kpawa àgwà ndị ha na-anaghị akpabu. Isi ike na-esokarị n’àgwà ndị ahụ. Oge ahụ anaghị adịrị ndị nne na nna mfe. A gwazie nwata okwu, ya asị “Mba!” ma ọ bụkwanụ “Ekweghị m!” O nwere ike nọkata, ahụ́ agbakasịwa ya, ya ebido wewere papa ya na mama ya iwe. Ọ chọghịzi iji anya na-ahụ ha n’agbanyeghị na ọ ka chọrọ ka ha na-elekọta ya. Ndị nne na nna na-amaghị nke ha ga-eme eme nwere ike ịna-eche na mbọ ha na-agba ịzụ nwa ha enweghị isi. Gịnị kpatara ihe a niile na-emenụ?

Cheta na a naghịzi apa nwa a otú e sibu apa ya. Mgbe mbụ, ọ na-abụ o meehaala ụṅara, papa ya ma ọ bụ mama ya agbara bịa. Ọ matawala ugbu a na a gaghịzi na-emere ya ihe niile, kama na ọ ga na-ejizi aka ya eme ihe ụfọdụ. Ka oge na-aga, ọ ga-aghọta na ya kwesịrị ịna-eme ihe ndị mụrụ ya kwuru n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile.”—Ndị Kọlọsi 3:20.

Ugbu a nwa a harala otú a, ndị nne na nna kwesịrị ịnọgide na-akụziri ya ihe ndị ahụ o kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na ọnụ esie ha ike mgbe ha na-eme otú a, ha ejirikwa ịhụnanya na-eme ya, nwa ahụ ga-emecha mụta ịnọ n’okpuru ha. Ihe ndị ọ mụtara ugbu a ga-abakwara ya uru ka ọ na-eto.

Ịkpa Àgwà Dị Mma

Ụmụ anụmanụ nwere ike ịghọta ihe mmadụ na-ekwu, ha nwekwara ike ikwughachi ihe mmadụ kwuru. E nwekwara ike ime kọmputa otú ọ ga-esi na-ekwughachi ihe mmadụ kwuru ma ọ bụkwanụ na-eme ihe mmadụ ji ọnụ gwa ya ka o mee. Ma, ọ bụ naanị mmadụ na-eche echiche. N’ihi ya, mgbe nwatakịrị na-erule ihe dị ka afọ abụọ ma ọ bụ atọ, ọ matawala mgbe o mere ihe tọrọ ndị ọzọ ụtọ, matakwa mgbe ndị ọzọ na-ewere ya iwe n’ihe o mere. O mee ihe ụfọdụ na-adịghị mma, ihere onwe ya emewe ya, o nwekwara ike na-ewute ya. Ihe ndị a ọ na-eme ugbu a bụ ihe ndị ga-emecha mee ka ọ ghọọ dimkpa na-akpa ezigbo àgwà, onye ga na-eme ihe ziri ezi ọ sọkwa ya ya bụrụ na ndị ọzọ na-eme ihe na-adịghị mma.

Ugbu a o ruwere afọ atọ, o nwere ihe ọzọ ọ ga-ebido mewe nke ga na-atọ ndị mụrụ ya ụtọ. Ọ ga-ebido ịma mgbe obi dị ndị ọzọ mma na mgbe obi na-adịghị ha mma. Cheta na mgbe ọ dị afọ abụọ, ọ na-abụ ndị ọzọ na-egwu egwu, ya anọrọ n’akụkụ ha na-egwu nke ya, ma ugbu a, ya na ha nweziri ike ịna-egwukọ egwu. Ọ matawakwala ihe ga-eme ka obi dị papa ya ma ọ bụ mama ya mma, o nwekwara ike chọwa ime ihe ahụ. Ihe ndị a na-egosi na a kụzikwuoro ya ihe, ọ ga-amụta ya.

Nwa a dị afọ atọ amatawala ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, bụ́ ihe ndị ọ na-amabughị. O doro anya na ọ bụ n’oge a ka ndị nne na nna kwesịrị ịmalite kụziwere nwa ha ihe ndị ga-enyere ya aka ịkpa ezigbo àgwà mgbe o toro.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Nwa a mụrụ ọhụrụ na-amalite ịmata olu mama ya n’ime ụbọchị ole na ole a mụrụ ya. Ọ na-achọkwa ịnụ ya kama ịnụ olu onye ọzọ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Nwa dị afọ atọ amatawala ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, bụ́ ihe ndị ọ na-amabughị

[Igbe dị na peeji nke 6]

IHE NWERE IKE IME KA IME ISI IKE MARA ỤMỤAKA AHỤ́

E nwere otu akwụkwọ John Rosemond dere banyere ịzụ ụmụaka. N’akwụkwọ ahụ, o kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ihe mere ụmụaka ha ji eme isi ike bụ na ha anaghị enyecha ha ihe ha chọrọ. Ha na-eche na ọ bụrụ na e nwere ihe ha mere, nke mere nwa ha ji mewe isi ike, ha kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ka nwa ahụ kwụsị isi ike ahụ ọ na-eme. N’ihi ya, ha na-ahapụ nwa ha ka o mewe ihe ndị ha sịburu ya emela. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ha kụrụ nwa ahụ ihe, ha enye ya ihe karịrị ihe ọ chọburu ka e nye ya. Ihe mere ha ji eme otú a bụ ka obi ha ghara imecha mawa ha ikpe. Obi na-ajụrụ nwatakịrị e meere ụdị ihe a, ahụ́ na-erukwa nne ya ma ọ bụ nna ya ala. Ndị nne na nna na-eme ụdị ihe a nwere ike na-eche na ha na-azụta ụmụ ha. Ma, nwa a ga-amata na ọ bụrụ na ya emewe isi ike, ndị mụrụ ya ga na-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Nke a ga-emekwa ka ime isi ike mara ya ahụ́.”