Otú Ị Ga-esi AkụziriNwa Gị Ihe—Mgbe Ọ Ghọwara Dimkpa
Otú Ị Ga-esi AkụziriNwa Gị Ihe—Mgbe Ọ Ghọwara Dimkpa
KA E WERE ya na i si obodo na-ekpokarị ọkụ kwaga obodo oyi na-atụkarị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-esiri gị ike ibi n’obodo ahụ. Ma, e nwere ihe ụfọdụ ị ga-eme ka i nwee ike ibi ebe ahụ.
Otú ahụkwa ka e nwere ihe ndị ị ga-eme ugbu a nwa gị ghọwara dimkpa. Ị na-ele ya, ya adị gị ka ọ bụghịzi nwa gị. Nwa gị ahụ na-anaghị achọ ịhapụ gị na-achọzi ka ọ bụrụ ya na ndị ọgbọ ya na-anọ. Mgbe mbụ, ọ na-achọ ịkọrọ gị ihe niile, ma ugbu a, ihe ọ bụla ị jụrụ ya, ya azaa gị ya elu elu gbachiri ụwa ya nkịtị. Dị ka ihe atụ, ya si ụlọ akwụkwọ lọta, ị jụọ ya otú ụlọ akwụkwọ si gaa, naanị ihe ọ ga-asa gị bụ, “Ọ gara nke ọma.” Ị jụọ ya ihe na-enye ya nsogbu n’obi, ya asị gị, “O nweghị.”
Gịnịzi na-eme ya? Mgbe mbụ, nwa gị na-agwa gị ihe niile, ma ugbu a ọ ghọwara dimkpa, ọ naghị achọ ịkọrọ gị ihe ọ bụla. O nwedịrị ike kọọrọ ndị ọgbọ ya ihe ọ na-agaghị akọrọ gị. Ka ihe ndị a na-eme, o nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ gị nọrọ na-ele ya sọọsọ anya.
Ì chere na ọ ka mma ị nọ na-ele ya sọọsọ anya? Mbanụ. I nwere ike inyere ya aka. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmata ihe ya na ya na-alụ ugbu a.
Ihe Ndị Na-eme Nwata ma Ọ Ghọwa Dimkpa
Mgbe mbụ, ndị na-eme nnyocha kwuru na nwata ruo afọ ise, ọ na-afọ obere ka ụbụrụ ya rụwa ọrụ dị ka nke dimkpa. Ma, ha na-ekwuzi na ọ bụ eziokwu na ụbụrụ nwatakịrị ahụ fọrọ obere ka ọ hara ka nke dimkpa, ọ rụwabeghị ọrụ otú nke dimkpa si arụ. Ụmụaka ghọwa dimkpa, ọtụtụ ihe na-agbanwe n’ahụ́ ha, otú ha si eche echiche na-agbanwekwa. Dị ka ihe atụ, a gwa nwata ihe, ọ na-ewere ya otú ahụ e si gwa ya ya. Ma, ọ bụrụ onye na-eto eto ka a gwara ihe ahụ, ọ ga-echebara ya echiche, chọpụta ma ihe ahụ ọ̀ bụ eziokwu. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Ọ naghịzi eme a gwa ya na ọ dị iri, ya achịrị wụnye n’akpa. Ihere anaghịkwa eme ya ikwu ihe dị ya n’obi.
Paolo, onye bi n’Ịtali, chọpụtara na nwa ya ebidola ime otú ahụ. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m na-ele nwa m, ya adị m ka ọ̀ bụ dimkpa guzo m n’ihu. Ọ bụghị naanị na m na-ahụ na o towela, kama ihe kacha atụ m n’anya bụ otú o si eche echiche. Ụjọ anaghịzi atụ ya ikwu ihe o chere, ọ na-ekwukwa ihe mere o ji chee otú ahụ.”
Nwa gị ọ̀ na-eme otú ahụ? O nwere ike ịbụ na mgbe ọ dị obere, ị gwahaala ya na ị chọrọ ka o mee ihe a, ya emee ya ozugbo. Ma, ugbu a ọ ghọwara dimkpa, ị gwa ya lekwa ihe ọ ga-eme, ọ ga-achọ ka ị gwa ya ihe mere i ji sị ya mee ihe ahụ tupu ya emee ya. O nwedịrị ike ịgwawa gị na otú unu si eme ihe ụfọdụ n’ezinụlọ unu adịghị mma. Mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna nwere ike ichewe na nwa ha emewela isi ike.
Echekwala na nwa gị na-emere gị isi ike. O nwere ike ọ na-agbalị ka o mewe ihe ndị
ahụ ị na-agwa ya mee. Were ya na i si n’ụlọ i bi na-akwafe n’ụlọ ọzọ. Ì chere na ọ ga-adịrị gị mfe ịhụ ebe ịga-akwasa ngwongwo gị niile n’ụlọ ọhụrụ a? O nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe. Ma, otu ihe doro anya bụ na o nweghị ngwongwo gị ị ga-atụfu, ebe ọ bụ na ha niile dịcha gị mkpa.Otú a ọ dị gị ka ọ dịkwa nwa gị n’ihi na o ruwela mgbe ‘ọ ga-ahapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike bụrụ na ọ dịtụ anya n’ihi na nwa gị aghọbeghị dimkpa, ma, e nwere ike ikwu na o jikewela. Kemgbe ọ bụ nwata, ọ na-echebara ihe ndị a na-akụziri ya echiche, na-ahọrọ ndị nke ọ ga-eji ebi ndụ ma o too. *
O nwere ike, obi agaghị na-eru gị ala ma i cheta na nwa gị ahụ ga-eji aka ya họrọ ihe ndị ọ ga na-eme ma o too. Ma, otu ihe doro anya bụ na nwa gị ghọọ dimkpa, naanị ihe ndị ọ ga na-eme bụ ihe ndị ahụ o weere na ha kacha mma. N’ihi ya, ọ bụ ugbu a gị na ya ka bi ka o kwesịrị ichebara ihe niile ị na-akụziri ya echiche.—Ọrụ 17:11.
Nwa gị kwesịrị ime otú ahụ n’ihi na ọ ga-abara ya uru. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ọ na-eme ihe ndị ị kụziiri ya n’echebaraghị ha echiche, o mechaa gaa biri nke ya, ọ ga na-eme ihe ndị ọzọ gwara ya n’echebaraghị ya echiche. (Ọpụpụ 23:2) Baịbụl kwuru na ọ naghị ara ahụ́ e dufuo onye na-eme otú ahụ, n’ihi na ‘o nweghị uche.’ Ị manụ na otu n’ime ihe e ji ama onye na-enweghị uche bụ na onye ahụ anaghị echebara ihe a gwara ya echiche. (Ilu 7:7) Onye na-eme ihe na-edoghị ya anya ‘na-agbanwe obi ya mgbe niile banyere ihe o kweere, mgbe ọ nụrụ ihe ọzọ dị iche ma ọ bụ mgbe onye ọzọ ji aghụghọ kwuo okwu ụgha nke ga-adị ka eziokwu.’—Ndị Efesọs 4:14, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
Olee ihe ị ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ime nwa gị? Gbaa mbọ hụ na o nwere ihe atọ ndị a anyị chọrọ ikwu okwu ha:
Nke Mbụ: IKIKE NGHỌTA
Pọl onyeozi kwuru na ‘ndị tozuru okè bụ ndị zụrụ ikike nghọta ha azụ ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Ndị Hibru 5:14) I nwere ike ịsị: ‘O teelanụ m kụziiri nwa m ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ Anyị ma na ihe ahụ ị kụziiri ya baara ya uru mgbe ahụ, ọ ga-enyekwara ya aka ugbu a. (2 Timoti 3:14) Ma, Pọl sị na ndị mmadụ kwesịrị ịna-azụ ikike nghọta ha azụ. Ọ bụ eziokwu na nwatakịrị nwere ike ịma ihe dị iche n’ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, ma, onye na-eto eto kwesịrị ‘ịbụ dimkpa n’ike ịghọta ihe.’ (1 Ndị Kọrịnt 14:20; Ilu 1:4; 2:11) Anyị ma na ị ga-achọ ka nwa gị na-echebara ihe ọ bụla a gwara ya echiche, ghara ịna-eme ya nụ na ọ dị iri, ya achịrị wụnye n’akpa. (Ndị Rom 12:1, 2) Olee otú ị ga-esi eme ka ọ mụta ịna-eme otú ahụ?
Jems 1:19; Ilu 18:13) Jizọs kwukwara, sị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Matiu 12:34) Ị na-ege nwa gị ntị, ị ga-achọpụta ihe dị ya n’obi.
Otu n’ime ihe ị ga-eme bụ ịna-ahapụ nwa gị ka o kwuo uche ya. Ya na-agwa gị ihe, emekwala ka à ga-asị na iwe ji gị a sịgodị na ihe o kwuru adịghị gị mma n’obi. I mee ka onye iwe ji, ọ ga-emechi ọnụ. Baịbụl kwuru, sị: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (I mechaa chọọ ikwu okwu, ọ ga-aka mma ka ị jụọ ya ajụjụ kama ịgbaghewe ọnụ kwuo otú obi dị gị. Mgbe ụfọdụ, Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya na ndị kpọrọ ekwo nkụ ajụjụ iji mata ihe dị ha n’obi. (Matiu 21:23, 28) I nwere ike ime otú ahụ ma gị na nwa gị na-ekwu okwu, a sịgodị na o kwuru ihe dị iche n’ihe gịnwa chere. Dị ka ihe atụ:
Ọ bụrụ na nwa gị asị: “Echeghị m na Chineke dị.”
Kama ịsị ya: “Ọ̀ bụ na anyị akụzibereghị gị na Chineke dị?”
I nwere ike jụọ ya, sị: “Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?”
Olee ihe mere o ji dị mma ka ị jụọ ya ajụjụ ahụ? Ọ bụ eziokwu na ị nụrụ ihe ahụ o kwuru, ihe mere ị ga-eji ajụ ya ajụjụ ahụ bụ ka ị mara ihe yanwa na-eche. (Ilu 20:5) O nwere ike, ihe mere o ji kwuo ya abụghị na o kwetaghị na Chineke dị, kama, o cheghị na iwu Chineke bara uru.
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-eto eto achọghị ịgbara omume ọjọọ ọsọ, o nwere ike kpebie na Chineke adịghị. (Abụ Ọma 14:1) O nwere ike gwa onwe ya, sị: ‘Ma Chineke adịghị, ọ pụtaziri na agaghị m eme ihe Baịbụl kwuru.’
Nwa gị na-eche otú ahụ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Èkwetara m n’eziokwu na m mee ihe Chineke kwuru, ọ ga-abara m uru? (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụrụ na o kwetara na ha ga-abara ya uru, kọwaara ya na o kwesịrị ịgba mbọ na-eme ha.—Ndị Galeshia 5:1.
Ọ bụrụ na nwa gị asị: “Ọ bụ okpukpe gịnwa chọrọ ikpe, ọ bụghị nke m chọrọ ikpe.”
Kama ịsị ya: “Ọ bụ okpukpe mmadụ niile nọ n’ezinụlọ a na-ekpe. Ebe ị bụ nwa anyị, ị ga-ekperịrị ya.”
I nwere ike kwuo, sị: “Ihe a i kwuru abụghị obere okwu. Ọ bụrụ na ị chọghị ikpe okpukpe m na-ekpe, a ga-enwenụ nke ị chọrọ ikpe. Ka m jụgodị gị, olee okpukpe ị chọrọ ikpe, gịnịkwa ka ha na-akụziri ndị òtù ha? Ì chere na ihe ha ga-akụziri gị ga-abara gị uru ná ndụ?”
Olee ihe mere o ji dị mma ka ị jụọ ya ajụjụ ndị ahụ? Ị jụọ ya ajụjụ ndị ahụ, ọ ga-eme ka o chebara onwe ya echiche. O nwere ike mechaa chọpụta na gị na ya kweere otu ihe, kama, na e nwere ihe ọzọ bụ́ nsogbu ya.
Dị ka ihe atụ, o nwere ike bụrụ na nwa gị ahụ amaghị otú ọ ga-esi akọwara ndị ọzọ ihe ndị o kweere. (Ndị Kọlọsi 4:6; 1 Pita 3:15) Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o nwere nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa ihe ya na-amasị ya, ma onye ahụ anaghị ekpe okpukpe yanwa na-ekpe. Gwuo ala mata ihe bụ́ nsogbu ya, gbaakwa mbọ nyere ya aka ka ọ hụ ebe nsogbu ya dị. Ọ bụrụ na ọ na-echebara ihe echiche, ọ ga-eme ka ọ ghọọ dimkpa ma ihe.
Nke Abụọ: ONYE TOROLA ETO YA NA YA BỤ ENYI
Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere otú mmadụ si akpa àgwà kwuru na ụmụaka gafee afọ iri na abụọ, ha ga na-enye ndị mụrụ ha nsogbu. Ma, n’ebe ụfọdụ taa, a chọpụtara na ihe ahụ ndị ọkachamara ahụ kwuru anaghị emecha. Mgbe e lebara anya n’ihe kpatara ya, a chọpụtara na ndị na-eto eto nọ ebe ndị ahụ na-ebido mgbe ha bụ ụmụaka mewe ihe dimkpa na-eme. Ha na ndị dimkpa na-arụkọ ọrụ, ha na ha na-anọ, ha na-enyekwa ha ọrụ ha ga na-arụ. N’ebe ndị ahụ, ụmụaka anaghị akpa arụ otú ụmụaka si akpa n’ebe ndị ọzọ, ndị mụrụ ha na-aṅụkwa mmiri tọgbọ iko.
Ma, n’ọtụtụ ebe, ndị na-eto eto na-abanye n’ụlọ akwụkwọ na-ekwo ekwo. N’ụdị ụlọ akwụkwọ ahụ, ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi anaghị akpacha, kama, ndị ha na ha na-akpa na-abụkarị ụmụ akwụkwọ ibe ha. Ụmụaka a lọta akwụkwọ, ha agaghị ahụ mama ha na papa ha n’ụlọ n’ihi na ha agaala ọrụ. Ndị ikwu ha ebighịkwa nso. Ndị ha na ha na-anọ na-abụkarị ndị ọgbọ ha. * Ị̀ hụla ihe mere o ji bụrụ nsogbu? Ụmụaka ahụ kpawa àgwà ọjọọ, a gaghị asị na ọ bụ naanị n’ihi na ha na ndị ọjọọ na-akpa. A chọpụtala na ụmụaka ndị na-akpa ezigbo àgwà nwekwara ike kpawa àgwà ọjọọ ma ọ bụrụ na ha na ndị dimkpa anaghị anọ.
N’oge ochie, otu n’ime mba ebe ndị na-eto eto na ndị dimkpa mekọrịtara ihe bụ mba Izrel. * Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Ọzaya ghọrọ eze Juda mgbe ọ ka na-eto eto. Olee ihe nyeere Ọzaya aka ịrụ nnukwute ọrụ eze na-arụ? O yiri ka ọ mụtara ihe n’aka Zekaraya, bụ́ onye Baịbụl kwuru na ọ “kụziiri ya ịtụ egwu Chineke.”—2 Ihe E Mere 26:5.
Nwa gị na-eto eto ò nwere onye torola eto ma ọ bụ ndị torola eto ya na ha na-akpa, bụ́ ndị ga na-enyere ya aka ime ihe ndị dị mma? Hapụ ya ka ya na ndị ahụ na-akpa, echekwala na ha na-anara gị nwa gị. Ha ga-enyere gị aka kụziere nwa gị ihe ga-abara ya uru ná ndụ. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.
Nke Atọ: Ọ NAGHỊ ANỌ NKỊTỊ
Ná mba ụfọdụ, e nwere awa ole iwu obodo kwuru na ndị na-eto eto ga-arụdebe ọrụ n’otu izu, nweekwa ụdị ọrụ ha agaghị na-arụ. Ihe mere e ji tie iwu ndị ahụ bụ ka a ghara ịna-enye ụmụaka ọrụ ndị ga-enye ha nsogbu n’ahụ́, ọ bụkwa kemgbe ụwa mepewere anya ka e bidoro tiwe ha.
Ọ bụ eziokwu na iwu ndị ahụ na-eme ka ndị na-eto eto ghara ịna-arụgbu onwe ha n’ọrụ, ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na
ọ na-emekwa ka ụmụaka na-anọ nkịtị. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ kwuru gbasara ndị na-eto eto ji kwuo na ọtụtụ ndị na-eto eto anaghịzi achọ ịrụ ọrụ, kama, ha na-achọ ka a na-emere ha ihe niile. Ha achọghịkwa ịna-eme ihe ọ bụla ga-esitụrụ ha ike omume. Ndị dere akwụkwọ ahụ kwuru na ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ n’ihi na ụwa a lekwasịrị anya n’imepụta naanị ihe ndị a ga-eji na-eme ndị na-eto eto obi ụtọ kama ịkụziri ha otú e si arụ ọrụ.Ma, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto Baịbụl kwuru na ha bidoro mgbe ha ka dị obere rụwa ọrụ dimkpa. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Timoti ka na-eto eto mgbe ya na Pọl onyeozi matara, Pọl kụzikwaara ya ọtụtụ ihe. E nwere mgbe Pọl gwara Timoti, sị: “Mee ka onyinye Chineke nke dị n’ime gị . . . nwuo dị ka ọkụ.” (2 Timoti 1:6) Ọ bụ eziokwu na Timoti ka na-eto eto n’oge ahụ, ya na Pọl onyeozi so na-aga eleta ọgbakọ, ha hiwekwara ọgbakọ dị iche iche ma gbaa Ndị Kraịst ume. Mgbe Pọl na Timoti rụkọrọ ọrụ ruo ihe dị ka afọ iri, Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Filipaị, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi [Timoti] nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie.”—Ndị Filipaị 2:20.
Ọ bụrụ na ndị na-eto eto achọpụta na ọrụ e nyere ha rụọ na-abara ndị ọzọ ezigbo uru, obi na-atọkarị ha ụtọ ịrụ ya. Ọ bụghị naanị na ọ ga-eme ka ha dị uchu ugbu a, kamakwa, ha na-esi na ya amụta ihe ndị ga-abara ha uru ma ha too.
Nyere Ya Aka Ugbu A Ọ Ghọwara Dimkpa
Dị ka anyị kwuburu, ọ bụrụ na i nwere nwa na-eto eto, ọ ga-abụ na ị chọpụtala na ọ naghịzi emecha otú ọ na-emebu afọ ole na ole gara aga. Ka obi sie gị ike na ị ga-azụli nwa gị a otú ahụ i si zụọ ya mgbe ọ na-aharubeghị otú a ọ hà.
Were oge a nwa gị na-eto eto nyere ya aka ka (1) o nwee ikike nghọta, (2) o nwee onye torola eto ya na ya bụ enyi, na (3) ọ ghara ịna-anọ nkịtị. I mee otú ahụ, nwa gị ga-aghọ dimkpa ma ihe.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe a anyị na-ekwu, gụọ Ụlọ Nche May 1, 2009, peeji nke 10-12. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
^ par. 32 Ihe ndị e bu ndị na-eto eto n’obi na-eme na tiivi, fim nakwa n’Ịntanet na-abụkarị ihe na-eme ka obi sie ha ike na ọ ka mma ka ha na ndị ọgbọ ha na-anọ. Ha na-emekwa ka ha were ndị ọgbọ ha ka ndị ma nke a na-akọ ebe ndị dimkpa bụ ndị na-amaghị ebe a nọ.
^ par. 33 Ihe ndị e kwuru na Baịbụl gosiri na ndị na-eto eto, ndị fere Chineke n’oge ochie, bidoro mgbe ha ka bụ ụmụaka mewe ihe ndị dimkpa na-eme. N’ọtụtụ ebe taa, anaghị akụziri ụmụaka ka ha na-eme ihe ndị dimkpa na-eme.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
“ECHEGHỊ M NA E NWERE NNE NA NNA ỌZỌ DỊ KA PAPA M NA MAMA M”
Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-akụziri ụmụ ha ka ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, hanwa na-agbalịkwa ime ihe Baịbụl kwuru. (Ndị Efesọs 6:4) Ma, ha anaghị amanye ụmụ ha ka ha mewe ihe Baịbụl kwuru. Ha ma na nwa ha toruo ogo o kwesịrị iji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme, ọ bụ yanwa ga-ekpebi ma ọ̀ ga-eme ihe Baịbụl kwuru ka ọ̀ bụ na ọ gaghị eme.
E nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Aislyn. Nne ya na nna ya bụ Ndịàmà Jehova, o jikwa aka ya kpebie ịna-eme ihe ha ji Baịbụl kụziere ya. O kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị otu ụbọchị n’izu ka m ji efe Chineke. M na-efe ya kwa ụbọchị. N’ihe ọ bụla m na-eme ná ndụ, m na-ajụ onwe m ma ọ̀ ga-adị Chineke mma. Anaghị m echefu Chineke mgbe m na-ahọrọ ndị mụ na ha ga-abụ enyi, ụdị ihe m ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ, na ụdị akwụkwọ m ga-agụ.”
Obi na-atọ Aislyn ezigbo ụtọ ma ya cheta otú nne ya na nna ya bụ́ Ndịàmà Jehova si zụọ ya. O kwuru, sị: “Echeghị m na e nwere nne na nna ọzọ dị ka papa m na mama m. Obi dịkwa m ụtọ na ha kụziiri m ka m ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka m kwụsị ịbụ Onyeàmà Jehova ma ugbu a ma n’ọdịnihu. O nweghịkwa ihe ga-eme n’ụwa a ka m hapụ ihe papa m na mama m kụziiri m.”
[Foto dị na peeji nke 17]
Hapụ nwa gị ka o kwuo uche ya
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụ na nwa gị enwee onye torola eto ya na ya bụ enyi, ọ ga-enyere ya aka
[Foto dị na peeji nke 19]
Onye na-eto eto nwee ọrụ bara uru ọ na-arụ, ọ na-enyere ya aka ịghọ dimkpa ma ihe