Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú A Ga-esi Azụ Ụmụaka ma Ha Towe

Otú A Ga-esi Azụ Ụmụaka ma Ha Towe

Otú A Ga-esi Azụ Ụmụaka ma Ha Towe

“Mgbe nwa gị na-erubeghị afọ ise, naanị ndị ọ ma nke ọma agwụla unu abụọ. N’oge ahụ, ọ dịịrị gị mfe ịkụziri ya ka ọ na-akpa ezigbo àgwà. Ma, ugbu a ọ malitere ịga akwụkwọ, ọ ga na-ahụ otú ụmụ akwụkwọ ibe ya si akpa àgwà, na-anụkwa ụdị ihe ndị ha na-ekwu.”—Valter, onye bi n’Ịtali.

KA ỤMỤAKA na-eto, ha na-amatakwu ihe ndị ha na-amabughị. Ha na ndị ọzọ ga na-ekwuzi okwu, ma ndị ha na ha na-egwu egwu ma ụmụ akwụkwọ ibe ha ma ndị ikwu ha. Dị ka Valter kwuru, ọ bụghịzi naanị gị ka nwa gị ga-esi n’aka ya na-amụta ihe otú ahụ ọ na-emebu mgbe ọ dị obere. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ị kụziere nwa gị ka ọ na-erube isi ma na-akpa ezigbo àgwà mgbe ahụ ọ ka dị obere. Ọ dịkwa mkpa ka ị kụziere ya ihe dị iche n’ihe dị mma na ihe na-adịghị mma.

Nwa gị agaghị amụta ihe ndị ahụ ị na-akụziri ya ozugbo, ma ọ bụkwanụ na-eme ha, ma ọ bụrụ na yanwa ekwetabeghị na ihe ndị ahụ bụ ihe ndị o kwesịrị ịna-eme. Ọ ga-adị mkpa ka i ‘jiri ogologo ntachi obi niile na nkà izi ihe dọọ nwa gị aka ná ntị, baa mba, gbaakwa ya ume.’ (2 Timoti 4:2) A gwara ndị Izrel otú ha ga-esi na-akụziri ụmụ ha Iwu Chineke. Na Diuterọnọmi 6:6, 7, a gwara ha, sị: “Kụnye [iwu Chineke] n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” Ihe a Chineke gwara ha gosiri na ọzụzụ ị na-enye nwa gị ugbu a dị ezigbo mkpa.

Ihe dị n’ịzụ ụmụ karịrị akarị. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Oge Ige Ntị

Baịbụl kwuru na e nwere “oge ikwu okwu,” nweekwa oge ige ntị. (Ekliziastis 3:7) Olee otú ị ga-esi kụziere nwa gị ka ọ na-ege ntị mgbe gịnwa ma ọ bụ onye ọzọ na-agwa ya okwu? Otu ụzọ ị ga-esi eme ya bụ gịnwa ịna-ege ndị ọzọ ntị. Ọ bụrụ na ụmụaka gị ma ọ bụ ndị ọzọ ana-agwa gị okwu, ị̀ na-ege ha ntị?

Obere ihe na-adọpụkarị ụmụaka uche. N’ihi ya, mgbe ị na-agwa ha okwu, gbalịa na-enwere ha ndidi. Ebe ọ bụ na ụmụaka niile anaghị akpa otu àgwà, gbalịa chọpụta otú ka mma ị ga-esi na-agwa nwa gị okwu. Dị ka ihe atụ, na Briten, e nwere otu nwoke nwere nwata nwaanyị. Aha nwoke ahụ bụ David. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m gwa nwa m nwaanyị ihe ọ ga-eme, mụ agwa ya ka o kwughachi ihe ahụ otú o si ghọta ya. N’ihi otú a m si eme ya, ọ mụtala ịna-egekwu ntị mgbe a na-agwa ya okwu.”

Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, ọ gwara ha, sị: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.” (Luk 8:18) Ebe ọ bụ na a gwara ndị torola eto ka ha na-ege ntị, í cheghị na ọ kacha dịrị ụmụaka mkpa ka ha na-ege ntị?

“Na-agbaghara Ibe Unu Kpamkpam”

Baịbụl kwuru, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.” (Ndị Kọlọsi 3:13) E nwere ike ịkụziri ụmụaka ka ha mụta ịna-agbaghara ndị ọzọ. Olee otú e nwere ike isi mee ya?

Otú ahụ i kwesịrị ịna-ege ntị, ka ụmụ gị mụta ịna-ege ntị, ka i kwesịkwara ịna-agbaghara ndị ọzọ ka ụmụ gị nwee ike ịmụta ya. E nwere otu nwaanyị bi na Rọshịa, aha ya bụ Marina. Nwaanyị a nwere ụmụaka, ya na di ya na-agbakwa mbọ ịkụziri ha ka ha na-agbaghara ndị ọzọ. O kwuru, sị: “Mụ na di m na-agba mbọ ịgbaghara ndị mejọrọ anyị, ka ụmụ anyị nwee ike ịmụta ya. Anyị anaghị achọ ka okwu na-ebi naanị n’ọnụ anyị, ma ọ bụkwanụ kwe ka obere ihe ọ bụla na-akpasu anyị iwe. M mejọọ ụmụ m, m na-arịọ ha ka ha gbaghara m. Achọrọ m ka ha mụta ịna-arịọ ndị ha mejọrọ mgbaghara.”

Ụmụ gị kwesịrị ịmụta otú e si edozi esemokwu ma na-agbaghara ndị ọzọ n’ihi na ọ ga-abara ha uru ma ha too. Nyere ụmụ gị aka ka ha mụta ịna-echebara ndị ọzọ echiche nakwa ka ha na-ekweta mmejọ ha. Ị kụziere ha ya, ha amụta ya, ọ ga-abara ha ezigbo uru ka ha na-eto.

‘Gosinụ na Unu Bụ Ndị Nwere Ekele’

N’oge a “dị oké egwu, nke tara akpụ,” ọtụtụ ndị “hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Timoti 3:1, 2) Ugbu a ụmụ gị ka dị obere, i kwesịrị ịkụziri ha ka ha na-ekele ndị ọzọ maka ihe ọma ha meere ha. Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Gosinụ na unu bụ ndị nwere ekele.’—Ndị Kọlọsi 3:15.

Ugbu a ụmụ gị ka dị obere, i nwere ike ịkụziri ha otú e si akpa ezigbo àgwà na otú e si asọpụrụ ndị ọzọ. Olee otú i nwere ike isi mee ya? Dr. Kyle Pruett kwuru n’otu magazin, sị: “Otú kacha mma ị ga-esi akụziri ụmụ gị ka ha na-ekele onye meere ha ihe ọma bụ gịnwa ịna-ekele ndị ezinụlọ gị ma ha mee ihe dị mma. Ọ pụtara na ị ga na-ekele ha maka aka ha na-enyere gị ma ọ bụkwanụ maka ihe ọma ọ bụla ọzọ ha mere n’ụlọ . . . Ọ bụghị ihe a na-eme otu ugbo.”

E nwere otu nwoke bi na Briten, aha ya bụ Richard. Nwoke a nwere ụmụaka, ya na nwunye ya na-agbalịkwa ime ihe ahụ Dr. Kyle Pruett kwuru. Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m na-ekele ndị meere anyị ihe ọma, dị ka ndị nkụzi ụmụ anyị na ndị nne nne anyị na nna nna anyị, ka ụmụ anyị nwee ike ịmụta ya. Mgbe ọ bụla ezinụlọ ọzọ kpọrọ anyị oriri, anyị richaa, anyị na-eji obere kaadị deere ha otú obi si tọọ anyị ụtọ. Anyị na-agwakwa ụmụ anyị ka ha dee ihe na kaadị ahụ ma ọ bụkwanụ see obere ihe na ya.” Ị kụziere ụmụ gị ka ha na-emere ndị mmadụ ihe ọma nakwa ka ha na-ekele ndị meere ha ihe ọma, ọ ga-eme ka ha na ndị ọzọ ha na ha ga-emecha na-akpa dịrị ná mma.

“Ahapụla Ịdọ Nwatakịrị Aka ná Ntị”

Ka ụmụ gị na-eto, ị kwesịrị ime ka ha mata na ihe ọ bụla ha mere ga-enwerịrị ihe ọ ga-akpatara ha, ma n’ụlọ ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’obodo. Nyere ụmụ gị aka ka ha mata na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ. (Ndị Galeshia 6:7) Olee otú ị ga-esi eme ya?

Baịbụl kwuru, sị: “Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.” (Ilu 23:13) Ị gwa nwa gị na o mee ihe dị otú a lekwa ihe ị ga-eme ya, gbalịa mee ya ihe ahụ i kwuru na ị ga-eme ya ma o mee ihe ahụ ị sịrị ya emela. E nwere otu nwaanyị bi n’Ajentina, aha ya bụ Norma. Nwaanyị a kwuru, sị: “Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na-eme ihe ha kwuru. Nwatakịrị chọpụta na ndị mụrụ ya anaghị eme ihe ha kwuru mgbe ụfọdụ, ọ ga na-emezi ihe masịrị ya.”

Ọ bụrụ na ndị nne na nna agwa ụmụ ha ihe ha ga-eme ha ma ha mee ihe na-adịghị mma, ọ ga-eme ka ha na ụmụ ha ghara ikwuwe oké okwu ma ụmụ ha mee ihe ahụ a sị ha emela. Ọ bụrụkwa na ụmụaka ma ihe a ga-eme ha ma ha mee ihe a sị ha emela, ha agaghị esiwe ọnwụ ma a chọwa ime ha ihe ahụ. Ha agaghịkwa esiwe ọnwụ ma ha mara na o nweghị ihe ga-eme ka ndị mụrụ ha ghara ime ha ihe ahụ ha kwuru.

Ma, ndị nne na nna ekwesịghị iji iwe na-adọ ụmụ ha aka ná ntị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha ghara ịna-eme ihe ha sịrị ha emela. Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Ndị nne na nna ekwesịghị iji obi ọjọọ na-adọ ụmụ ha aka ná ntị, ma ọ̀ bụ mgbe ị chọrọ ịpịa ha ihe ma ọ bụ mgbe ị na-abara ha mba.

Nwa gị meekwanụ ihe gbawara gị obi, olee otú ị ga-esi ejide onwe gị? E nwere otu nwoke bi na Niu Ziland, aha ya bụ Peter. Nwoke a kwuru, sị: “Ọ naghị adịcha mfe. Ma, e kwesịrị ime ka ụmụaka mata na ihe mere e ji dọọ ha aka ná ntị bụ n’ihi àgwà ọjọọ ha kpara, ọ bụghị n’ihi na iwe ji ndị mụrụ ha.”

Peter na nwunye ya na-agba mbọ ime ka ụmụ ha mara na aka ná ntị a na-adọ ha bụ maka abamuru ha. Peter kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na ụmụ anyị mere ihe gbawara anyị obi, anyị na-agwa ha na ha ekwesịghị ịkpa ụdị àgwà ahụ ha kpara, kama na ha kwesịrị ịna-akpa àgwà dị mma.”

“Meenụ Ka Mmadụ Niile Mara na Unu Nwere Ezi Uche”

Mgbe Chineke na-agwa ndị ya na ya ga-ata ha ahụhụ maka mmehie ha, o kwuru, sị: “M ga-apịa gị ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaya 46:28) Ọ bụrụ na ụmụ gị emee ihe na-adịghị mma, gị adọọ ha aka ná ntị ókè kwesịrị ekwesị, ha agaghị ewere ya na ị kpọrọ ha asị. Pọl gwara Ndị Kraịst, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.”—Ndị Filipaị 4:5.

Otu n’ime ụzọ ị ga-esi egosi na i nwere ezi uche bụ ma ị dọọ nwa gị aka ná ntị otú na-agaghị emenye ya ihere. E nwere otu nwoke bi n’Ịtali, aha ya bụ Santi. Nwoke a kwuru, sị: “Anaghị m emenye nwa m nwoke ma ọ bụ nwa m nwaanyị ihere. Kama, ana m agba mbọ chọpụta ihe mere ha ji mee ihe ha mere ma nyere ha aka ka ha ghara ime ya ọzọ. Ana m agbalị ka m ghara ịnọ n’ihu ndị ọzọ na-adọ nwa m aka ná ntị, ọ sọgodị ya ya bụrụ nwanne ya. Anaghị m eji ihe ha mejọrọ akọ ha ọnụ, ma n’ihu ndị mmadụ ma mgbe naanị mụ na ha nọ.”

Richard, onye anyị kwuburu ihe o kwuru, chọpụtara na mmadụ inwe ezi uche bara uru. O kwuru, sị: “E kwesịghị iji maka ihe ọjọọ nwata mere n’oge gara aga taa ya ahụhụ karịrị ihe o mere ugbu a. Nwa gị mee ihe ọjọọ, gị adọọkwa ya aka ná ntị, i kwesịghị ịnọ na-echetara ya ihe ahụ o mere.”

Ịzụ ụmụaka adịghị mfe, ọ na-ewekwa ọtụtụ ihe. Ma, ị zụta ha, ị ga-enwe obi ụtọ. Ihe a ka Yelena, onye bi na Rọshịa, chọpụtarala. O kwuru, sị: “Ana m arụzi ọrụ na-enyekwu m ohere ka mụ na nwa m nwoke nwee ike ịna-anọ. Ọ dịrịghị m mfe ime ya, o mekwara ka m ghara ịna-akpata ego otú m gaara esi na-akpata. Ma, ihe ọ bụla m mere iji hụ na nwa m nwoke nwere obi ụtọ, mụ na ya adịrịkwa ka enyi na enyi, efughị ọhịa.”

[Foto dị na peeji nke 11]

E nwere ike ịkụziri ụmụaka ka ha na-enyere ndị ọzọ aka

[Foto dị na peeji nke 12]

Dọọ ụmụaka aka ná ntị otú na-agaghị emenye ha ihere