Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Peji nke Abụọ

Peji nke Abụọ

Peji nke Abụọ

Otú A Ga-esi Zụọ Ụmụaka Ka Ha Baa Uru

Mgbe a mụrụ nwa, o nwere ike ọ gaghị agbata nne na nna n’obi na obere nwa ahụ na-eme ha obi ụtọ ga-emecha ghọọ dimkpa, gaa biri nke ya. Ma, ọ ga-emechanụ mee n’ihi na Baịbụl kwuru na “nwoke [ga-ahapụ] nna ya na nne ya.” (Jenesis 2:24) Nwaanyị na-ahapụkwa nna ya na nne ya.

Ma, n’ụbọchị ahụ nwa ha na-ahapụ ha, ha ga na-eche ọtụtụ ihe gbasara ya. Ha nwere ike na-ajụ onwe ha, sị: ‘Ànyị zụzikwara nwa anyị a azụzi? Ọ̀ ga-adịkwa uchu n’ọrụ ọ na-arụ? Ọ̀ ga-elekọtali ebe o bi, na-ekowe akpa ya ebe aka ya ga-eru?’ Nke ka nke, ‘Nwa a ọ̀ ga na-akpakwa ezigbo àgwà ndị anyị nọ na-akụziri ya kemgbe?’—Ilu 22:6; 2 Timoti 3:15.

Teta! a pụrụ iche ga-akọwa otú ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl nwere ike isi nyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma malite n’oge e ku ha n’aka ruokwa mgbe ha ghọrọ ndị na-eto eto.