Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Abụọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Abụọ
N’ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a, dee 1 na nke ọ bụla i chere kacha dịrị gị mkpa, deekwa 2 na nke i chere na-eso ya, derezie ya otú ahụ na-aga.
․․․․․ ihe m na-achọghị ka ndị ọzọ mara
․․․․․ oge m
․․․․․ ụdị aha m na-emere onwe m
․․․․․ ndị m na-emete enyi
N’IME ihe anọ ahụ e dere n’elu, olee nke i dere 1, ya bụ, olee nke i kwuru na ọ bụ ya kacha dịrị gị mkpa? Ọ bụrụ na gị na ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet, mara na i nwere ike inwe nsogbu na nke ahụ ị sị na ọ kacha dịrị gị mkpa, nakwa n’atọ ndị nke ọzọ.
Ma, ì kwesịrị idenye aha gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet? Ọ bụrụ gị na papa gị na mama gị bi, ọ bụ hanwa ga-ekpebi ma ì kwesịrị idenye aha gị. * (Ilu 6:20) Otú ahụ Ịntanet n’onwe ya bara uru, nweekwa ọghọm, ka ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet bakwara uru, nweekwa ọghọm. Ọ bụrụ na papa gị na mama gị achọghị ka gị na ndị mmadụ si n’Ịntanet na-akparịta ụka, gee ha ntị.—Ndị Efesọs 6:1.
Ma, ọ bụrụ na ha hapụrụ gị ka gị na ndị enyi gị na-akparịta ụka n’Ịntanet, gịnị ka i nwere ike ime ka ị ghara itinye onwe gị ná nsogbu? N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ihe abụọ dị mkpa. Ha bụ: Ihe ndị ị na-agaghị achọ ka ndị ọzọ mara, na oge gị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụdị aha ị na-emere onwe gị n’ebe ahụ, ya na ụdị ndị ị na-emete enyi.
ỤDỊ AHA Ị NA-EMERE ONWE GỊ
Ọ bụrụ na mmadụ achọghị inwe aha ọjọọ, onye ahụ ga-akpachara anya ka ọ ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ lewe ya anya ka onye ọjọọ. Ka e were ya na i nwere ụgbọala ọhụrụ, nke ọkọ ọ bụla na-akọbeghị, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka ọ dịgide otú ahụ? Olee otú obi ga-adị gị ma ụgbọala gị ahụ kpọkasịa ebe ị na-anya ya ara ara?
Ụdị ihe ahụ nwere ike ime aha gị ma ọ bụrụ na ị kpachaghị anya n’ebe ahụ gị na ndị enyi gị na-anọ akparịta ụka n’Ịntanet. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cara kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ etinye foto na-adịghị mma ebe ahụ ma ọ bụkwanụ dee ihe na-adịghị mma, o nwere ike imebi aha ya.” Dị ka ihe atụ, legodị ihe ụfọdụ nwere ike ime ka i nwee aha ọma ma ọ bụkwanụ aha ọjọọ n’ebe ahụ. Ha bụ:
● Foto gị. Pita onyeozi dere, sị: “Na-akpa ezigbo àgwà mgbe niile.” (1 Pita 2:12, Baịbụl bụ́ Contemporary English Version) Olee ụdị foto ị chọpụtarala ndị mmadụ na-etinye n’ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet?
“Mgbe ụfọdụ, m na-achọpụta na onye m weere na ọ bụ ezigbo mmadụ nwere foto ebe ọ nọ ka onye mmanya na-egbu.”—Ana, ọ dị afọ iri na itoolu.
“E nwere ụmụ agbọghọ m ma tinyere foto ebe ha yi uwe tapaara ha n’ahụ́. Otú ha na-eme ma ị hụ ha ná mmadụ dị iche n’ihe ị ga-ahụ n’Ịntanet.”—Cara, ọ dị afọ iri na itoolu.
Ọ bụrụ na mmadụ sere foto ebe (1) o yi efe tapaara ya n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ (2) ebe ọ nọ ka onye mmanya na-egbu ma tinye ya ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ị hụ foto ahụ, olee otú ị ga-esi na-ele onye ahụ anya?
1 ․․․․․
2 ․․․․․
● Ihe i dere. Ndị Efesọs 4:29 kwuru, sị: “Ka okwu rere ure [‘okwu rụrụ arụ,’ Baibul Nsọ (Ndezighari Ọhuru)] ghara isi unu n’ọnụ pụta.” Ndị ụfọdụ achọpụtala na okwu na-ekwesịghị ekwesị, asịrị, ma ọ bụ okwu rere ure na-eso n’ihe ndị mmadụ na-ekwu ma ha na ndị enyi ha na-akparịta ụka n’Ịntanet.
“Ndị mmadụ na-ekwukarị ihe ọ bụla masịrị ha ma ha na ndị enyi ha na-akparịta ụka n’ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ha na-eche na ihe dị njọ e kwuru n’ọnụ anaghị adị njọ ma e dee ya ede. O nwere ike ya abụrụ na ị gaghị akpọ ndị enyi gị iyi, ma, ihe ị na-ede nwere ike ime ka ndị ọzọ chee na ị na-achụ nwoke ma ọ bụkwanụ na ị na-achụ nwaanyị. I nwekwara ike dee ihe ga-awụ onye gụrụ ya akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ gị ekwuo okwu ndị rere ure.”—Danielle, ọ dị afọ iri na itoolu.
Olee ihe i chere mere ọtụtụ ndị ji ekwu ihe masịrị ha ma ha na ndị enyi ha na-akparịta ụka n’Ịntanet?
․․․․․
Ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị njọ ma mmadụ tinye ụdị foto ọ bụla sọrọ ya ebe ahụ ma ọ bụkwanụ dee ihe ọ bụla masịrị ya? Mbanụ! Nwa agbọghọ aha ya bụ Jane kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, ihe ndị ahụ anaghị abụ obere okwu. O nweela oge anyị nọkọrọ kwuo na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ nwere ike gaa ebe onye ha chọrọ iwe n’ọrụ denyere aha ya n’Ịntanet, jiri ihe ha hụrụ ebe ahụ kpebie ụdị onye onye ahụ bụ.”
N’akwụkwọ a kpọrọ Facebook for Parents, Dr. B. J. Fogg kwuru na ọ bụ ihe yanwa na-eme. O kwuru, sị: “Anaghị m eji ịma ụdị onye onye m chọrọ iwe n’ọrụ bụ egwu egwu. Ọ bụrụ na m gaa ebe onye ahụ denyere aha ya, hụ ihe na-adịghị mma, ihe onye ahụ agaghịzi adị m mma. Agaghị m ewe ya n’ọrụ. Maka gịnị? Maka na achọrọ m ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ na-arụrụ m ọrụ.”
Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, e nwedịrị ihe ka mkpa i kwesịrị ichebara echiche. I kwesịrị iche echiche otú ihe ndị ị na-ede ebe ahụ ga-esi adị ndị ọzọ n’obi, ma hà bụ Ndịàmà Jehova ibe gị ma ọ̀ bụkwanụ na ha abụghị. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla.”—2 Ndị Kọrịnt 6:3; 1 Pita 3:16.
Ihe I Nwere Ike Ime
Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka ị na-aga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, lee ụdị foto i tinyere ebe ahụ ma jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụdị onye foto ndị a m tinyere na-egosi na m bụ? Ọ̀ bụ otú m chọrọ ka ndị mmadụ si na-ele m anya? Ọ bụrụ na papa m na mama m, okenye ọgbakọ anyị, ma ọ bụkwanụ onye chọrọ iwe m n’ọrụ ahụ foto ndị a, ihere ọ̀ ga-eme m?’ Ọ bụrụ na ihe ị ga-aza n’ajụjụ nke ikpeazụ a bụ ee, gbalịa wepụsịa foto ndị ahụ. Ọ bụ ihe a ka nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu, aha ya bụ Kate, mere. O kwuru, sị: “Otu okenye gwara m okwu gbasara foto m tinyere ebe ahụ. Ihe ahụ ọ gwara m mere m obi ụtọ. Ama m na ọ chọghị ka m nwee aha ọjọọ.”
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ileru anya n’ihe ndị i dere, nakwa nke ndị ọzọ dere, n’ebe ahụ i denyere aha gị. Ọ bụrụ na onye ọ bụla edee “okwu nzuzu” ma ọ bụ “okwu njakịrị rụrụ arụ” n’ebe ahụ i denyere aha gị, gwa ya ka ọ ghara ide ụdị ihe ahụ ụbọchị ọzọ. (Ndị Efesọs 5:3, 4) Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Jane kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ede ihe ndị na-adịghị mma ma ọ bụkwanụ ihe ọ ga-abụ mmadụ gụọ ọ gaghị ama ihe onye dere ya bu n’obi dee ya. A sịgodị na ọ bụghị gị dere ya, ọ ga-eme ka ndị mmadụ lewe gị anya ka onye ọjọọ n’ihi na ọ bụ n’ebe i denyere aha gị ka e dere ihe ahụ.”
A bịa n’ụdị foto ị na-etinye nakwa ụdị ihe ị na-ede, olee ihe i nwere ike ime ka ha ghara imebi aha gị?
․․․․․
ỤDỊ NDỊ Ị NA-EMETE ENYI
Ọ bụrụ na aha gị dị ka ụgbọala ahụ anyị kwuru okwu ya, e nwere ike ikwu na ndị enyi gị dị ka ndị i bu n’ụgbọala ahụ. Ọ bụrụ na ị zụrụ ụgbọala ọhụrụ, ọ̀ bụ onye ọ bụla ị hụrụ ka ị ga-eji ya buru? Ọ bụrụ na papa gị na mama gị hapụrụ gị ka ị na-aga ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ọ bụghị onye ọ bụla ka i kwesịrị imete enyi. Olee ndị i kwesịrị imete enyi?
“Ihe ụfọdụ ndị kwo edenye aha ha ebe ahụ bụ naanị ka ha mete ndị ọzọ enyi. Ha na-etinyedị aha ndị ha na-amaghị ná ndị enyi ha.”—Nayisha, ọ dị afọ iri na isii.
“Mmadụ nwere ike ịnọ ebe ahụ nweta ndị ha na ya bụbu enyi. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-aka mma ka onye ahụ hapụ ndị ahụ ka ha nọọrọ onwe ha.”—Ellen, ọ dị afọ iri abụọ na ise.
Ihe I Nwere Ike Ime
Aro: Leruo ndị i metere enyi anya. Gaghachi n’ebe ahụ e dere aha ndị enyi gị, mara ma è nwere ndị i kwesịrị iwepụ. I ruo n’aha onye nke ọ bụla, jụọ onwe gị, sị:
1. ‘Olee ụdị onye onye a bụ?’
2. ‘Olee ụdị foto onye a na-etinye, oleekwa ụdị ihe ọ na-ede?’
3. ‘Onye a m kpọrọ enyi m ọ̀ na-enyere m aka ịkpa àgwà dị mma?’
“N’ọnwa ọ bụla, m na-eleba anya n’ebe e dere aha ndị enyi m. Ọ bụrụ na e nwere onye m tinyere ebe ahụ nke ihe ya na-edochaghị m anya ma ọ bụkwanụ m na-amachaghị ụdị onye ọ bụ, ana m ewepụ aha ya.”—Ivana, ọ dị afọ iri na asaa.
Aro: Kpebie ụdị ndị ị ga-emete enyi. Otú ahụ ọ na-abụghị onye ọ bụla ị hụrụ ná mmadụ ka ị ga-emete enyi ka ọ na-ekwesịghị ịbụ onye ọ bụla gwara gị ka gị na ya bụrụ enyi n’Ịntanet ka ị ga-ekwe ka ọ bụrụ enyi gị. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Dị ka ihe atụ, nwa agbọghọ aha ya bụ Leanne kwuru, sị: “Nke m bụ: Ma mụ amaghị onye mmadụ bụ, agaghị m ekwe abụ enyi ya. M hụ ihe na-adịchaghị m mma n’ebe enyi m denyere aha ya n’Ịntanet, m ga-ewepụ aha ya ná ndị enyi m, agaghịkwa m ekwe etinyeghachi ya ma ọ gwa m ka m tinyeghachi ya.” Ọ bụghị naanị nwa agbọghọ a na-eme ihe a.
“Ọ bụghị onye ọ bụla m hụrụ ka m na-emete enyi. Mmadụ nwere ike itinye onwe ya ná nsogbu ma ọ bụrụ na ọ na-emete onye ọ bụla ọ hụrụ enyi.”—Erin, ọ dị afọ iri abụọ na otu.
“E nweela mgbe ndị mụ na ha gakọrọ akwụkwọ gwara m ka mụ na ha bụrụ enyi n’Ịntanet. Ma, ebe ọ bụ na ekweghị m ka mụ na ha bụrụ enyi mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, ọ baghị uru ka mụ na ha bụrụ enyi ugbu a.”—Alex, ọ dị afọ iri abụọ na otu.
N’okpuru ebe a, dee ụdị ndị gị na ha ga-abụ enyi n’Ịntanet.
․․․․․
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Teta! anaghị ekwu na ọ bụ ebe dị otú a ma ọ bụ ebe dị otú a ka mmadụ kwesịrị ịga denye aha n’Ịntanet, ka ya na ndị ọzọ nwee ike na-akparịta ụka n’ebe ahụ. Ọ naghịkwa ekwu na ebe dị otú a na ebe dị otú a adịghị mma idenye aha. Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ihe ha na-eme n’Ịntanet abụghị ihe Baịbụl kpọrọ asị.—1 Timoti 1:5, 19.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu; amara dị mma karịa ọbụna ọlaọcha na ọlaedo.”—Ilu 22:1.
[Igbe dị na peeji nke 28]
IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA
Gị na papa gị na mama gị lebaghachi anya n’ihe e kwuru n’isiokwu abụọ a, bụ́ ndị kwuru gbasara ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Gị na ha kwuo gbasara (1) ihe ndị ị na-agaghị achọ ka ndị ọzọ mara, (2) oge gị, (3) ụdị aha ị na-emere onwe gị, na (4) ụdị ndị ị na-emete enyi n’Ịntanet.
[Igbe dị na peeji nke 29]
IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE
O nwere ike ịbụ na ihe gbasara Ịntanet doro ụmụ gị anya karịa gịnwa, ma ị ka ha mara ihe. (Ilu 1:4; 2:1-6) Ọ bụ ya mere otu nwoke ihe gbasara Ịntanet doro anya, aha ya bụ Parry Aftab, ji kwuo, sị: “Ụmụaka ma ihe gbasara nkà na ụzụ karịa ndị mụrụ ha. Ma, ndị mụrụ ha ka ha mara ihe gbasara ndụ.”
Ọ dịbeghị anya ihe ịga n’Ịntanet na-akpa nkata bidoro wuwe. Ọ bụ ununwa ga-eji aka unu kpebie ma nwa unu ọ̀ marala ihe dị mma na ihe dị njọ nke na o nwere ike ịna-aga ebe ahụ. Otú ahụ ịnya ụgbọala na idewe ego n’ụlọ akụ̀ nwere ọghọm ka ịga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet nwekwara. Olee ụfọdụ n’ime ọghọm ndị o nwere?
IHE NDỊ ỌZỌ NA-EKWESỊGHỊ ỊMA. Ọtụtụ ndị na-eto eto amaghị na mmadụ ide ọtụtụ ihe gbasara onwe ya n’Ịntanet na-akpata nsogbu. Mmadụ ikwu ebe o bi, ebe ọ na-aga akwụkwọ, mgbe ọ na-anọ n’ụlọ ma ọ bụkwanụ mgbe mmadụ na-anaghị anọ n’ụlọ ha nwere ike ịkpatara ezinụlọ ha ezigbo nsogbu.
Ihe unu nwere ike ime. Mgbe ụmụ unu dị obere, unu kụziiri ha ka ha buru ụzọ lee anya n’aka ekpe nakwa n’aka nri tupu ha agbafee okporo ụzọ. Ugbu a ha tolitetụrụla, kụzierenụ ha ihe ha ga-eme ka ha ghara itinye onwe ha ná nsogbu n’Ịntanet. Gụọnụ isiokwu nta bụ́: “Ihe Ndị Ị Na-agaghị Achọ Ka Ndị Ọzọ Mara.” Ọ malitere na peeji nke 17 na magazin a. Gụọkwanụ Teta! Bekee nke October 2008, peeji nke 3-9. Unu gụchaa ha, unu na ụmụ unu kwurịta ihe ndị e kwuru na ha. Gbalịanụ kụziere ụmụ unu ka ha ‘na-echekwa ezi amamihe na ikike iche echiche’ ma a bịa n’ihe gbasara Ịntanet.—Ilu 3:21.
OGE. Ịga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet nwere ike iri mmadụ ahụ́. Nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na atọ, aha ya bụ Rick, kwuru, sị: “Naanị abalị ole na ole m denyechara aha m n’ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet, mụ ana-agazi ebe ahụ mgbe niile. M na-anọ ebe ahụ ọtụtụ awa na-ele foto ndị mmadụ tinyere, na-agụkwa ihe ndị ha dere.”
Ihe unu nwere ike ime. Unu na ụmụ unu gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Ekwe Ntị, Tiivi ma Ọ Bụ Kọmputa Ò Riela M Ahụ́?” Ọ gbara na Teta! Eprel–Jun 2011. Mgbe unu na-atụle ya, lekwasịnụ anya n’ihe e dere n’igbe dị na peeji nke 26, nke isiokwu ya bụ: “Izirịta Ozi n’Ịntanet Riri M Ahụ́.” Nyerenụ nwa unu aka ka ọ mụta ‘ịna-emeru ihe n’ókè,’ ka ọ gharakwa ịna-anọfe oge unu na ya kwekọrịtara ka ọ nọọ n’Ịntanet. (1 Timoti 3:2) Chetaranụ ya na ọ bụghị naanị n’Ịntanet ka mmadụ na ibe ya na-anọ akpa nkata!
ỤDỊ AHA HA NA-EMERE ONWE HA. Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ.” (Ilu 20:11) Ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ihe ọzọ bụ na ebe ahụ a na-akparịta ụka n’Ịntanet bụ maka ọhaneze, ihe ụmụ unu dere ebe ahụ nwere ike inye ma hanwa ma ezinụlọ unu aha ọjọọ.
Ihe unu nwere ike ime. Ndị na-eto eto kwesịrị ịma na ihe ha na-ede n’Ịntanet na-egosi ụdị ndị ha bụ. Ha kwesịkwara ịma na ihe ọ bụla ha mere ebe ahụ enweghị ọpụpụ. Akwụkwọ bụ́ CyberSafe, nke Dr. Gwenn Schurgin O’Keeffe dere, kwuru, sị: “A gwa ụmụaka na ihe e tinyere n’Ịntanet enweghị ọpụpụ, ya ana-esiri ha ike nghọta. Ma, ọ dị mkpa ka ha bido ugbu a ghọtawa ya. Otu n’ime ụzọ a ga-esi akọwara ha ya bụ ịkụziri ha ka ha ghara ịgwa onye ha na ya na-akparịta ụka n’Ịntanet ihe ha na-agaghị agwali mmadụ ma ha na onye ahụ na-akpa nkata ihu na ihu.”
NDỊ HA NA-EMETE ENYI. Nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ, aha ya bụ Tanya, kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eto eto chọrọ ka ụwa niile mara ha, ọ bụ ya mere ha ji ekweta ka ha na onye ha na-amaghị ma ọ bụkwanụ onye àgwà ya na-adịghị mma bụrụ enyi.”
Ihe unu nwere ike ime. Kụzierenụ nwa unu ka ọ na-ahọ ndị ọ ga-emete enyi n’Ịntanet ahọ. Dị ka ihe atụ, Alicia, onye dị afọ iri abụọ na abụọ, anaghị etinye aha enyi enyi ya ná ndị bụ́ enyi ya. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mụ amaghị mmadụ ma ọ bụkwanụ na mụ na onye ahụ ahụtụbeghị ihu na ihu, agaghị ekwo na enyi m bụ enyi ya denye aha ya ná ndị enyi m.”
Di na nwunye, aha ha bụ Tim na Julia, denyere aha ha n’ebe nwa ha nwaanyị denyere aha ya n’Ịntanet, ka ha nwee ike ịma ndị bụ́ ndị enyi ya na ụdị nkata ha na-akpa ebe ahụ. Julia, sịrị: “Anyị gwara ya ka o tinye aha anyị ná ndị enyi ya. Ọ bụrụ na ya na mmadụ ana-akpa nkata, ọ ga-adị nnọọ ka hà nọ n’ime ụlọ anyị na-akpa nkata ahụ. Anyị chọrọ ịma ndị ha bụ.”
[Foto dị na peeji nke 27]
Otú ahụ ị ga-esi akpọkasị ụgbọala gị ma ị na-anya ya ara ara ka ị ga-esi emebi aha ọma gị ma ọ bụrụ na ị na-ede ihe na-adịghị mma n’Ịntanet ma ọ bụ na-etinye foto na-adịghị mma ebe ahụ
[Foto dị na peeji nke 28]
Ọ̀ bụ onye ọ bụla ị hụrụ ka ị ga-eburu n’ụgbọala gị ma ọ sị gị buru ya? Oleezi ihe mere ị ga-eji emete onye ị na-amaghị enyi n’Ịntanet?