Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke

Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke

Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke

● Ọ bụ ihe a ka akọwara n’otu broshuọ nwere iri peeji atọ na abụọ, nke aha ya bụ, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Broshuọ a nwere ọtụtụ isiokwu ndị magburu onwe ha, nke ụfọdụ n’ime ha bụ: “Chineke Na-akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya” na “Chineke Bụ Enyi Kasị Mma Ị Pụrụ Inwe.” E dere broshuọ a otú ọ ga-esi enyere onye na-agụ ya aka ịmata ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi.

Na broshuọ ahụ, isiokwu bụ́ “Ndị Enyi Chineke Ga-ebi na Paradaịs” kọwara ihe mere Chineke ji kee ụwa anyị a. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi na Paradaịs ahụ Baịbụl kwere nkwa ya, anyị kwesịrị ịma otú Chineke chọrọ ka anyị si na-efe ya. Isiokwu bụ́ “Ụzọ Isi Chọta Ezi Okpukpe Ahụ” na “Jụ Okpukpe Ụgha!” ga-enyere gị aka ka gị na Chineke dịrị ná mma. Obi siri anyị ike na broshuọ a ga-abara gị uru ma ị gụọ ya.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị mụwara gị Baịbụl, ma ọ bụkwanụ chọọ ka e wetara gị broshuọ a, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetaranụ m otu akwụkwọ a e sere ebe a. Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.