Uru Ọ Bara Ichekwa Ego Kama Ịzụfusi Ya
Uru Ọ Bara Ichekwa Ego Kama Ịzụfusi Ya
ỌTỤTỤ ndị na-asị na ichekwa ego na-esi ike, ma, ịzụfusi ya anaghị ara ahụ́.
Ma ihe isi ike a zuru ụwa ọnụ ọ̀ kpara gị aka ọjọọ ma ọ̀ bụ na ọ kpaghị gị, ọ ga-abara gị uru ma ị gụọ otú i nwere ike isi na-echekwa ego gị na otú i nwere ike isi jiri ego gị na-eme ihe bara uru. Legodị ihe Baịbụl kwuru, bụ́ nke nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka kemgbe ụwa n’agbanyeghị otú ihe si siere ha ike.
Ndụmọdụ Atọ Ndị Ga-abara Gị Uru
E nwere otu akụkọ Jizọs onye Nazaret kọrọ, nke gosiri otu ihe dị mkpa ga-enyere mmadụ aka ma a bịa n’ihe gbasara ego. Ọ kọrọ na otu nna ukwu gwara odibo ya, sị: “Ị gaara etinye [ego m] n’aka ndị na-echekwa ego, mgbe m lọtara, m gaara anata ihe m, ya na ọmụrụ nwa ya.” (Matiu 25:27) Ihe ahụ Jizọs kwuru mgbe ahụ bara ezigbo uru ugbu a. Legodị ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.
N’oge na-adịchabeghị anya, e nwere mba ụfọdụ ọ na-abụ mmadụ tinye ego n’ụlọ akụ̀ hapụ ya ruo ihe dị ka afọ iri, ya amụtara ya ọmụrụ nwa karịrị isi ego ya. Taa, ọtụtụ ụlọ akụ̀ anaghịzi enye ụdị ọmụrụ nwa ahụ, ihe ndị mmadụ na-atụkwa anya inweta ma ha tinye ego ha n’ụlọ akụ̀ anaghị abụ ihe ha na-enweta. Ma, ọ ka bara uru mmadụ ichekwa ego ya a dịghị ama ama ihe e ji ego eme adapụta.
Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Amamihe bụ ihe nchebe, dịkwa ka ego bụ ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ma, ego agaghịnụ echebe gị ma ọ bụrụ na e nweghị nke i dewere. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu nọrọ n’ụlọ ya wepụta ihe ma debe ya dị ka ihe si na-agara ya nke ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 16:2.
Otú I Nwere Ike Isi Chekwaa Ego
Nke mbụ: Tupu ị zụọ ihe ọ bụla na-ada ọnụ, jụọ onwe gị ma ihe ahụ ọ̀ dị gị ezigbo mkpa.
Nke abụọ: E nwee ihe ị chọrọ ịzụ, zụrụ nke ọhụrụ ma ọ bụkwanụ gị azụrụ nke ọkịrịka ya ka dị ezigbo mma. E nwere di na nwunye bi na Nọọwee aha ha bụ Espen na Janne. Mgbe ha mụrụ nwa ọhụrụ, chọwa ịzụ oche ha ga-eji na-akwagharị ya, ha gara zụrụ nke ọkịrịka ka dị ezigbo mma. E kee ego ha gaara eji zụọ nke ọhụrụ ụzọ abụọ, ọkara ya ka ha ji zụọ nke ahụ. Espen kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Daniel nwa anyị etofee ya, anyị ka ga-erete ya ezigbo ego.” O kwukwara, sị: “Ịchọta nke dị ezigbo mma otú ahụ abụghị obere ihe.” *
Nke atọ: Azụla ihe ọ bụla ị hụrụ; chebara ihe ọ bụla ị chọrọ ịzụ echiche. I chebachaara ya echiche, obi aka sie gị ike na ihe ahụ dị gị ezigbo mkpa, i nwere ike gaa chọọ ya n’ebe a na-ere ihe ọkịrịka ma ọ bụkwanụ n’ebe a na-egbu ihe ná ntụ. Ihe ọzọ bụ: Ị chọwa ịzụ ihe, agakwala chọwa nke ụwa niile na-azụ n’ihi na ọ na-aka ada ọnụ. Ị chọọkwa ịzụrụ ụmụ gị ákwà, agakwala n’ọdụ ahịa ebe a na-ere ákwà ndị na-ewu ewu n’ihi na ha na-adị ọnụ. I nwedịrị ike inweta nke dị ezigbo mma ma ị gaa n’ọdụ ọkịrịka.
Nwaanyị ku nwa n’aka nwekwara ike na-awa nwa ya napkịn ákwà kama ịzụrụ nke ndị Bekee. N’akwụkwọ Denise Chambers dere gbasara ichekwa ego, o kwuru, sị: ‘E jiri ego napkịn ndị Bekee ga-efu nwaanyị ku nwa n’aka tụnyere ego ịzụrụ nke ákwà ga-efu ya, ego napkịn ndị Bekee na-akaji nke ákwà olu. Ọ na-adịrị nwaanyị ku nwa n’aka mfe ịwa nwa ya napkịn ákwà a na-emepụta ugbu a, ọ naghịkwa emetọ mbara èzí.’
Nke anọ: Cheta na ịga zụrụ nri ahịa na-efu ego karịa ịga zụrụ ihe jiri aka gị sie ya. Ọ bụrụ na ụmụ gị ka na-aga akwụkwọ, ọ ga-aka mma ka ị kụziere ha ka ha na-esi n’ụlọ ebu nri aga akwụkwọ kama ịna-enye ha ego ha ga-eji na-azụrụ nri ahịa. Kama ịna-aṅụ mmanya ọtọ bịrịbịrị na-ada ọnụ, ọ ga-akara gị mma ịna-aṅụ mmiri. Ị manụ na ọ ga-aka na-edozi gị ahụ́, ọ gaghịkwa na-efu gị oké ego.
N’oge mbụ, ndị mmadụ na-eji aka ha akọ akwụkwọ nri na ihe ndị ọzọ ha ji esi nri. Í cheghị na ọ ga-adị mma ka ị na-eme otú ahụ? Ọtụtụ ndị nwere ebe ha na-akọ ụmụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa, ma hà bi ná nnukwu ụlọ ma ọ̀ bụ n’obere ụlọ. O nwere ike ịtụ gị n’anya na obere
ala ị kụrụ ụmụ ihe ụfọdụ ga-emepụtara gị ezigbo nri.Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ị ga-enwerịrị ekwe ntị, ọ ga-akara gị mma ka i jiri ya na-akpọ mmadụ naanị mgbe ọ dị gị ezigbo mkpa. I mee otú ahụ, ị gaghị na-akpọfusi ego gị. Ọ dịkwa mma ka i jiri aka gị na-asa ákwà gị kama ịna-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ka ha na-asara gị ha. Ọ bụrụkwa na i nwere ntụoyi ma ọ bụ ihe e ji eme ka ụlọ na-ekpo ọkụ, lee ma ị̀ ga-eselatatụ aka n’otú i si agbanye ya. Tupu ị gbanye ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Oyi ọ̀ na-atụ, ma ọ bụkwanụ, ụlọ ọ̀ na-ekpo ajọ ọkụ?’ I nwekwara ike jụọ ndị ọzọ ihe ha na-eme mere ụgwọ eletrik ha na-akwụ anaghị akarị akarị.
Ọ ga-abakwara gị uru ma ị na-echekwa ego gị otú ị ga-esi na-enweta ọmụrụ nwa. Otu nwoke nke na-arụ ọrụ afọ ofufo na Saụt Afrịka kwuru ihe ọzọ dị mkpa. Ọ sịrị: “I kwesịghị itinye ego gị niile n’otu ụlọ akụ̀. Mgbe ụfọdụ, ụlọ akụ̀ na ebe ndị ọzọ a na-echekwa ego nwere ike ịda. Ụdị ihe ahụ emetụla anyị.” N’ihi ya, leruo anya ala mgbe ị na-ahọ ụdị ụlọ akụ̀ ị ga na-echekwa ego gị. Ọ kacha mma ka ị na-echekwa ya n’ụlọ akụ̀ gọọmenti ga-akwụghachi gị ego gị ma ọ bụrụ na ụlọ akụ̀ ahụ adaa.
Otú I Nwere Ike Isi Na-akwụ Ụgwọ I Ji
Nke mbụ: Gbaa mbọ ka ị na-akwụ ihe karịrị ego ole i kwesịrị ịkwụ kwa ọnwa.
Nke abụọ: Buru ụzọ na-akwụ ụgwọ ndị nke nwere nnukwu ọmụrụ nwa.
Nke atọ: Selata aka n’otú i si azụfụsi ego. Nke a dị ezigbo mkpa.
Ihe ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ekwu gbasara ngwá ahịa ha ọ̀ na-eme ka ịzụ ha na-adọ gị akpịrị? Ụdị ihe a mere otu nwoke ya na ezinụlọ ya bi na Swidin, aha ya bụ Danny. Nwoke a rekpọrọ ngwá ahịa ya iji nweta ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Ihe a mere ya kụziiri ya ezigbo ihe nke na ọ naghịzi azụfusi ego ya. O kwuru, sị: “Adịla anyaukwu. Azụla ihe ọ bụla aka gị na-erughị. Ka ihe i nwere ju gị afọ.”
Ụgwọ Bara Uru Mmadụ Nwere Ike Iji
Ọ bụghị mmadụ niile chọrọ ịzụ ụlọ ga-akwụli ụgwọ ya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-aga n’ụlọ akụ̀ gbaziri ego ha ga-eji azụ ụlọ. Ego ha ga na-akwụ ụlọ akụ̀ ahụ kwa ọnwa ga-adị ka ego ha gaara na-akwụ onye nwe ụlọ ma a sị na ha bi n’ụlọ onye ọzọ. Ha mechaa kwụzuo ụgwọ ụlọ ahụ ha chọrọ ịzụ, ya aghọzie nke ha.
Ọtụtụ ndị na-agbaziri ego, zụrụ ụgbọala na-anaghị aṅụ mmanụ. Ha kwụchaa ụgwọ ahụ ngwa ngwa, ụgbọala ahụ abaara ha ezigbo uru, ya adịzie ka hà chekwara ego ahụ were ya zụọ ụgbọala. * Ụfọdụ ndị na-aga azụrụ ụgbọala ka dị mma, nke onye nwe ya na-agbakabeghị. Ndị ọzọ na-abanye ụgbọala ọhaneze ma ọ bụdị jiri ígwè na-aga ebe ha chọrọ ịga kama iji ụgbọala ha.
N’agbanyeghị otú ọ bụla dị gị mma ị chọrọ isi na-eji ego gị, ihe ka mkpa bụ: Na-ekowe akpa gị ebe aka gị ga-eru. Ịzụfusi ego anaghị ara ahụ́ ewe mmadụ ahụ́, ọ na-etinyekwa mmadụ ná nsogbu. N’ihi ya, gbalịa hụ na ị naghị emefusi ego gị. Ị na-eme otú ahụ, ihe agaghị na-esiri gị ike nke otú ahụ.
Ihe ọzọ bụ: Ka i nwee ike na-echekwa ego gị nke ọma, i kwesịrị ịma ihe ị ga-eji ya na-eme. Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ka ị ghara ịzụ ihe mmadụ zuru n’ohi, gwa onye ọ bụla na-eresị gị ihe e jitụrụla ejitụ ka o nye gị risit. Ya deekwa aha ya na ebe o bi na risit ahụ.
^ par. 24 Chetakwa na ọ bụrụ na ị kwụkata ụgwọ ahụ kwụsị, n’ihi na o nweghị otú ị ga-esi kwụchaa ya, e nwere ike ịnaghara gị ụlọ ahụ ma ọ bụ ụgbọala ahụ, ego ndị nke ị kwụrụ akwụ efuo ọhịa.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
IHE I NWERE IKE IME KA Ị GHARA IMEFUSI EGO
Jiri akwụkwọ akụkọ chọọ ma è nwere ihe ndị a na-ere ere ị ga-azụrụ
Gaa zụrụ ákwà n’ọdụ ọkịrịka ma ọ bụ n’ebe a na-egbu ya ná ntụ
Kụziere ụmụ gị ka ha na-esi n’ụlọ ebu nri aga akwụkwọ
[Foto dị na peeji nke 6]
Na-akọ ụmụ ihe ụfọdụ e ji esi nri, ka ego ị na-emefu ná nri nwee ike ibelata. Na-eji aka gị asa ákwà gị kama ịna-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ka ha na-asara gị ha