Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Otú Nwoke na Nwoke Inwe Mmekọahụ ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ Ga-esi Bụrụ Ihe Dị Mma?

Ò Nwere Otú Nwoke na Nwoke Inwe Mmekọahụ ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ Ga-esi Bụrụ Ihe Dị Mma?

Echiche Baịbụl

Ò Nwere Otú Nwoke na Nwoke Inwe Mmekọahụ ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ Ga-esi Bụrụ Ihe Dị Mma?

N’ỌTỤTỤ mba, nwoke na nwoke inwe mmekọahụ ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ aghọọla omenala. N’Amerịka, o nwere ndị chọọchị sị na e kwesịrị ịkọwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ụdị mmekọahụ a otú ọ ga-adaba n’ihe ndị mmadụ na-eme ugbu a n’ihi na “ụwa emepeela anya.” Na Brazil, otu pastọ nke lụrụ nwoke ibe ya na nso nso a kwukwara na e kwesịrị “ilebagharị anya n’ihe Baịbụl kwuru n’okwu a” ma kọwaa ya otú ọ ga-adaba n’ihe ndị chọọchị ya na-eme ugbu a.

N’ihi ya, e nwee ndị sị na ụdị mmekọahụ a adịghị mma, a sị na ha kpọrọ ndị na-enwe ya asị. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ụdị mmekọahụ a?

Ihe Baịbụl Kwuru

Baịbụl anaghị akụziri anyị ka anyị kpọọ mmadụ ibe anyị asị. Ma, ihe o kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ doro anya.

“Gị na nwoke edinala otú gị na nwaanyị si edina. Ọ bụ ihe arụ.”Levitikọs 18:22.

Iwu a so n’Iwu Mozis, ọ bụkwa ụmụ Izrel ka Jehova nyere ya. Ma, ebe ọ bụ na Chineke sị na “ọ bụ ihe arụ,” o gosiri otú o si ele ya anya, ma ọ̀ bụ onye Juu mere ya ma ọ̀ bụ onye na-abụghị onye Juu. Ndị agbata obi ụmụ Izrel na-eme omume a na omume ndị ọzọ Iwu Mozis sị emela, dị ka mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ ma ọ bụkwanụ ịgba n’èzí. Ọ bụ ya mere Chineke ji sị na ha adịghị ọcha. (Levitikọs 18:24, 25) Chineke ò mechaziri gbanwee obi ya mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere? Legodị ihe amaokwu Baịbụl a kwuru:

“Chineke [nyefere] ha n’aka agụụ mmekọahụ na-eme ihere, n’ihi na ụmụ nwaanyị ha hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị wee na-enwe mmekọahụ nwaanyị na nwaanyị; otú ahụkwa ka ọbụna ụmụ nwoke hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị, ahụ́ wee na-ere ha ọkụ ka ha na ibe ha na-enwe mmekọahụ, ụmụ nwoke na ụmụ nwoke, na-eme ihe rụrụ arụ.”Ndị Rom 1:26, 27.

Olee ihe mere Baịbụl ji sị na nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ bụ ihe rụrụ arụ? Ọ bụ maka na ọ bụghị otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ si na-enwe mmekọahụ. E mekataghị ka e si n’ụdị mmekọahụ a mụta nwa. Otú Chineke si were ụdị mmekọahụ a ka o si were nke ahụ ndị mmụọ ozi na ụmụ nwaanyị nwere tupu e jiri mmiri mebie ụwa n’oge Noa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi ahụ mechara ghọọ ndị mmụọ ọjọọ. (Jenesis 6:4; 19:4, 5; Jud 6, 7) N’anya Chineke, ihe ahụ ha mere na ihe a ndị mmadụ na-eme ugbu a adịghị mma.

Ihe Ndị A Sị na Ọ Bụ Ha Mere E Ji Enwe Ya

Ụfọdụ ndị na-asị na ihe mere ha ji eme omume a bụ na ọ bụ ihe a na-eme n’ebe ha nọ too. Ndị ọzọ na-asị na ọ bụ maka na mmadụ dinara ha n’oge ha dị obere. O nwekwara ndị nke na-asị na ụdị mmekọahụ a dị ha n’ọbara. Ma, o nweghị ihe kwesịrị ime ka mmadụ na-enwe ya. Ka e were ya na mmadụ na-aṅụ oké mmanya n’ihi na ọ dị ya n’ọbara otú ndị sayensị na-ekwu ma ọ bụkwanụ n’ihi na a mụrụ ya n’ezinụlọ ndị aṅụrụma. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ga na-emetere onye ahụ ebere, ma, o nweghị onye ga-asị ya jisie ike na-aṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ sị ya hapụ mbọ ọ na-agba ịkwụsị ya.

Otú ahụkwa, Baịbụl asịghị na ndị na-agba mbọ ịkwụsị omume a kwesịrị ọnwụ. Ma, ọ naghị asị na ha mee ya, ha mere ihe dị mma, ọ sọkwa ya bụrụ maka na ọ dị ha n’ọbara otú ahụ ha na-ekwu ma ọ bụkwanụ na o nwere ihe ọzọ mere ha ji mee ya. (Ndị Rom 7:21-25; 1 Ndị Kọrịnt 9:27) Kama, Baịbụl kwuru ihe onye ahụ nwere ike ime, ya enyere ya aka ịkwụsị ya.

Gịnị Ka Chineke Chọrọ Ka Ndị Na-eme Omume A Mee?

Baịbụl sị na uche Chineke bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ adịghị mma, o kwughị na e kwesịrị ịkpọ ndị na-eme omume a asị.

N’agbanyeghị ya, Chineke ka kwụ ebe ọ kwụ n’okwu a. N’akwụkwọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10, Baịbụl kwuru hoo haa na “ndị ikom na-edina ndị ikom” ga-eso ná ndị ‘na-agaghị eketa alaeze Chineke.’ Ma, amaokwu nke iri na otu kwuru ihe ọzọ na-akasi obi. Ọ sịrị: “Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu, ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.”

Ihe Pọl na-ekwu bụ na ndị niile kwụsịrị omume ọjọọ ha, fewe Chineke otú o kwuru ka e si na-efe ya, a nabatara ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge gboo. Taakwa, ndị niile chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma ga-agba mbọ na-efe ya otú ọ chọrọ, ọ bụghị ịsị ka a kọwaa Baịbụl otú ọ ga-adaba n’ihe ha na-eme.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ?​—Ndị Rom 1:26, 27.

● Baịbụl ò kwuru ka a kpọọ ndị na-eme omume a asị?—1 Timoti 2:4.

● Mmadụ ò nwere ike ịkwụsị ime omume a?—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

[Foto dị na peeji nke 31]

È kwesịrị ịkọwa ihe Chineke kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ otú ọ ga-adaba n’ihe ndị mmadụ na-eme taa?