A Naghị Etofe Ịbụ Enyi Chineke Etofe
A Naghị Etofe Ịbụ Enyi Chineke Etofe
Akụkọ Olavi J. Mattila kọrọ
Otu Onyeàmà Jehova jụrụ m, sị: “Ị̀ ma na ị ka nwere ike ịmata ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke, onye kere eluigwe na ụwa?” Ihe a ọ jụrụ m mere ka m chee ezigbote echiche n’ihi na mgbe ahụ, agafeela m afọ iri asatọ. N’oge ahụ, e nwere ọtụtụ ndị nnukwu mmadụ mụ na ha na-akpa, mụ na ndị ọchịchị na-atọkwa. Ma, ihe m nọ na-eche mgbe ọ jụchara m ajụjụ ahụ bụ: ‘M̀ nwere ike ịmara Chineke ugbu a, mụ na ya abụrụ enyi?’
A MỤRỤ m n’obodo Haịvinka, Finland n’ọnwa Ọktoba afọ 1918. Adị m nnọọ obere mgbe m bidoro inyere papa m aka ịzụ ụmụ anụmanụ ya. Anyị na-azụ ehi, ịnyịnya, ọkụkọ na ụgbala bekee. Adịghị m umengwụ, ọrụ a m so papa m na-arụ na-atọkwa m ezigbo ụtọ.
Ka m na-eto, papa m na mama m gwara m ka m tinye isi n’akwụkwọ. Ọ bụ ya mere m ji banye mahadum mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. M malitekwara ịgba ọsọ egwuregwu, nke na mụ na onyeisi òtù ndị na-asọ mpi egwuregwu n’ala anyị bịara ghọọ enyi. Aha nwoke ahụ bụ Urho Kekkonen. Amaghị m na ọ ga-emecha ghọọ praịm minista ala anyị, ma ya fọdụkwa onyeisi ala. A gụkọọ afọ ole ọ nọrọ n’ọkwa abụọ a, o ruru afọ iri atọ. O nweghịkwa otú m si chetụwa n’echiche na nwoke a ga-etinye m n’ọrụ ga-eme ka m na-aga ebe dị iche iche n’ụwa.
Otú M Si Ghọọ Onye A Ma Ama
N’afọ 1939, mba anyị na Sọviet Yuniọn nwere nghọtahie. N’ihi ya, n’ọnwa Nọvemba afọ ahụ, e denyere aha m ná ndị ga-aga agha. Ọrụ mbụ m rụrụ bụ ịzụ ndị agha, e mechazie mụ aghọọ ọchịagha. Ebe ndị obodo anyị na ndị Sọviet Yuniọn nọ na-akwa mgbọ bụ na Kerilịa. Obodo a dị n’ókè obodo anyị na Sọviet Yuniọn. N’afọ 1941, ọgụ ahụ biiri ọkụ, anyị lụkwaara ya ruo obodo Vibọg. N’oge okpomọkụ afọ ahụ, a tụrụ bọmbụ, ya emerụọ m ezigbote ahụ́ nke na e bugara m n’ụlọ ọgwụ a na-agwọ ndị agha. Ahụ́ ahụ m merụrụ mere agaghịzi m agha ọzọ.
A kwụsịrị m ọrụ n’ọnwa Septemba afọ 1944, mụ alaghachizie mahadum, bidoghachikwa ịgba ọsọ egwuregwu. Aghọrọ m ọkaibe n’ọsọ ugboro atọ ná mba anyị. Enwetakwara m akara ugo mmụta n’ihe ọmụmụ tekinọlọgi na ịkọnọmiki.
N’oge a ihe a niile na-eme, enyi m nwoke ahụ aghọọla nnukwu mmadụ na gọọmenti. Mgbe ọ ghọrọ praịm minista, ọ gwara m n’afọ 1952 ka m bụrụ onye na-anọchite anya mba anyị n’obodo Chaịna. Ọ bụ ebe ahụ ka m nọ mata onye na-achị ndị Chaịna aha ya bụ Mao Tse-tung. Ọ bụ eziokwu na amatara m ọtụtụ ndị ọchịchị mgbe ahụ, onye kacha mụ mkpa n’ime ndị m matara bụ nwata nwaanyị aha ya bụ Annikki. Ọ na-arụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta anyị na ndị obodo ọzọ. Ahụrụ m nwata nwaanyị a n’anya, mụ na ya lụkwara n’ọnwa Nọvemba afọ 1956.
N’afọ sochiri ya, e wegara m n’obodo Ajentina ka m gaa bụrụ onye na-anọchi anya obodo anyị n’ebe ahụ. Ọ bụ n’obodo ahụ ka anyị nọ mụọ ụmụ abụọ mbụ anyị mụrụ. Ha abụọ bụcha ụmụ nwoke. N’ọnwa Jenụwarị afọ 1960, anyị lọghachitere n’obodo anyị. Ọ dịghị anya, anyị amụọ nwa nke atọ. Onye nke a bụ nwaanyị.
Otú M Si Ghọọ Onye Ukwu na Gọọmenti
N’ọnwa Nọvemba afọ 1963, enyi m ahụ, bụ́ onyeisi ala anyị ugbu a, gwara m ka m bụrụ onye ga na-ahụ maka ahịa anyị na mba ndị ọzọ na-azụkọ. O nyere m ọkwá a n’agbanyeghị na o nwetụbeghị òtù ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị m so na ya. N’ime afọ iri na abụọ ọzọ sochirinụ, o nyere m ọrụ ugboro isii ịbụ minista na-ahụ maka ụlọ ọrụ dị iche iche. Ugboro abụọ ka m bụ minista na-ahụ maka mmekọrịta anyị na mba ndị ọzọ. N’oge ahụ, anaara m eche na ọ bụ ụmụ mmadụ ga-eme ka ụwa dị mma. Ma, emechara m chọpụta na ọ bụghị ha n’ihi na ihe bụ́ mkpa ha bụ ka ha na-achị ọ bụghị ime ka ihe dị mma. Eji m anya m abụọ hụ nsogbu aghụghọ na anyaụfụ na-akpata.—Ekliziastis 8:9.
Ọ bụ eziokwu na ahụrụ m ndị ọchịchị ji obi ha niile chọọ ime ka ihe dị mma, ma, ha enwelighị ike ime ya n’ihi na ha ezughị okè. Ha meekwa elu mee ala, ọ naghị enwe isi.
N’oge okpomọkụ afọ 1975, anyị gara nnọkọ na Helsinki. Ndị bịara ya si iri mba atọ na ise, ha niile bụcha ndị isi ala. Ihe mere e ji nwee nnọkọ ahụ bụ ka e leba anya n’otú a ga-esi na-ahụ na udo na ịdị n’otu dị na Yurop. N’oge ahụ, ọ bụ mụnwa bụ minista na-ahụ maka mmekọrịta anyị na mba ndị ọzọ, abụkwa m onye na-enye onyeisi ala anyị ndụmọdụ. A gwara m ka m hazie otú nnọkọ ahụ ga-esi aga, ya emee mụ amara ndị isi ala niile bịara nnọkọ ahụ.
Ụbọchị ole na ole ahụ e nwere nnọkọ ahụ adịrịghị m mfe. O siiri m ezigbote ike ime ka ndị bịara nnọkọ ahụ nọrọ ebe ndị ha kwesịrị ịnọ. Ma, mgbe e nwechara ya, ihe bịara katụ mma n’ihi na tigbuo zọgbuo nọ na-ada n’oge ahụ belatara. E nwekwara nnọkọ ndị ọzọ ndị anyị gara mgbe a gachara nke ahụ.
Otú M Sizi Mụwa Baịbụl
Alara m ezumike nká n’afọ 1983, sizie obodo anyị kwaga Frans ebe nwa m nwaanyị bi. Ebe ahụ ka ebelebe nọ gbuo. N’ọnwa Nọvemba afọ 1994, nwunye m rịawara ọrịa kansa. N’afọ ahụkwa, o nwere ahịa m gara tinye aka, e gwuo m wayo. Kemgbe ụwa m, m na-agbalị ka ihe ọ bụla ghara imebi aha m. Ma, ahịa a m tinyere aka tere aha m unyi.
Kemgbe ụwa m, ana m ahụ Ndịàmà Jehova. Ha bịakwa na nke m, m na-abata ha, narakwa ha magazin ha. Ma, anaghị m enwe ohere mụ na ha ịbịa nọrọ kwuwe Baịbụl sịkwa Baịbụl asịghị. Si n’afọ 1994 ruo n’afọ 2000, ọrịa kansa ekweghị ahapụ nwunye m aka, anọkwa m na-elekọta ya. N’otu ụbọchị n’ọnwa Septemba afọ 2002, Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ m. Ọ bụ ya jụrụ m ajụjụ ahụ m kwuru okwu ya ná mbido akụkọ a. Mgbe ọ jụrụ m ya, ajụrụ m onwe m, sị: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na m nwere ike ịmata ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke n’afọ ndụ m a? Mụ na Chineke ò nwere ike ịbụ enyi ugbu a?’ Agara m wepụta Baịbụl m ebe m dewere ya kemgbe, mụ na Ndịàmà Jehova amalite ịmụ Baịbụl.
N’ọnwa Jun afọ 2004, nwunye ọma m hapụrụ, ya afọ naanị m. Ọ bụ eziokwu na ụmụ m nọ na-enyere m aka ka m chefuo ọnwụ nwunye m, o nwere ọtụtụ ajụjụ dị m n’obi m na-amaghị azịza ha. Ajụjụ ndị ahụ bụ gbasara ihe na-eme mmadụ ma onye ahụ nwụọ. Agakwuuru m ndị ụkọchukwu chọọchị Luta, jụọ ha ajụjụ ahụ na-anyịgbu m kemgbe. Ihe ha zara m bụ, “Ihe i kwesịrị ịghọta bụ na ajụjụ ndị a siri ike.” Ihe ahụ ha zara m ejughị m afọ. Mgbe ahụ ka ọ bịara dokwuo m anya na m kwesịrị ịmata ihe Baịbụl na-akụzi.
Ka mụ na Ndịàmà Jehova na-amụkwu Baịbụl ka m na-amụtakwu ihe Baịbụl na-akụzi, bụ́kwanụ ihe m na-achọ achọ kemgbe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na onye nwụrụ anwụ enweghị ihe ọ ma. Ọ dị ka onye nọ n’ụra. Baịbụl kwukwara na Chineke nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ. (Jọn 11:25) Ihe a m mụtara mere ka m nwee olileanya na m ga-ahụ nwunye m ọzọ, ọ kasikwara m obi.
Ọ raghị ahụ́ mụ agụcha Baịbụl, site na Jenesis ruo Mkpughe. Amaokwu Baịbụl kacha tọọ m ụtọ bụ Maịka 6:8, bụ́ ebe sịrị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” Ihe e kwuru ebe ahụ dị mfe nghọta, ọ bụ ya mere o ji tọọ m ụtọ. Amaokwu Baịbụl ahụ gosikwara na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi.
Enwere M Olileanya na Echi Ga-aka Mma
Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl nyeere m aka inwe ezigbo okwukwe na Chineke. O mekwara ka mụ na Chineke, onye kere m, dịkwuo ná mma. Ihe e dere n’akwụkwọ Aịzaya 55:11 na-atọ m ụtọ ma m cheta ya. Ebe ahụ sịrị: “Otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị. Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.” O nweghị nkwa Chineke kwere ọ na-anaghị eme, ọ ga-emekwa ndị nke ọ na-emebeghị. Ọchịchị mmadụ enwebeghị ike igbo mkpa ụmụ mmadụ n’agbanyeghị nnọkọ elu na ala ha garala. Ma, Chineke ga-eme ihe niile ahụ ha na-enwebeghị ike ime kemgbe ụwa. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Abụ Ọma 46:9 kwuru, sị: “Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.”
Ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova m na-aga abaarala m ezigbote uru. Ọ bụ ebe ahụ ka m hụrụ ihe a na-akpọ mmadụ ịhụ Onye Kraịst ibe ya n’anya, bụ́kwanụ ihe Jizọs sị na e ji ama ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:35) Ịhụnanya ha anaghị akpa ókè agbụrụ, o nweghịkwa ebe ị ga-aga n’ụwa a hụ ụdị ịhụnanya ahụ ma ọ́ bụghị n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova.
Ezigbote Ihe Ọma Meerela M
Akarịala m afọ iri itoolu, abụkwa m Onyeàmà Jehova ugbu a. O nweghịkwa ihe ọma meerela m karịrị ya. A bịa n’Okwu Chineke, abụghịzi m itibọrịbọ. Amatala m ihe Chineke bu n’uche kee mmadụ na ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke.
Obi dị m ụtọ na m na-eso Ndịàmà Jehova ibe m ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị afọ ole m dị ugbu a. Ana m agakwa ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe. Ọ bụ eziokwu na mụ na ọtụtụ ndị ukwu n’ụwa akpaala, enweekwala ọtụtụ ọrụ ndị m rụrụla, o nweghị nke n’ime ha m ga-eji tụnyere ịma onye Jehova Chineke bụ. O nweghịkwa nke m ga-eji tụnyere ịbụ enyi onye kere m. M na-ekele ya kwa ụbọchị, m na-etokwa ya maka na o kwere ka m soro ná ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.’ (1 Ndị Kọrịnt 3:9) A naghị etofe ịbụ enyi Chineke etofe n’ihi na ọ bụ yanwa kere anyị.
[Foto dị na peeji nke 25]
N’afọ 1975 mgbe anyị gara nnọkọ ahụ e nwere na Helsinki. Ọ bụ mụ na onyeisi ala anyị na prezident Amerịka n’oge ahụ guzo
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na onyeisi ala anyị na onyeisi ala Sọviet Yuniọn
[Foto dị na peeji nke 26]
Anaghị m eji izi ndị mmadụ ozi ọma egwu egwu
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 25]
Ebe e si nweta foto nke dị n’aka ekpe bụ: Ensio Ilmonen/Lehtikuva; nke aka nri bụ: Esa Pyysalo/Lehtikuva