Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?

Oleedị ihe mere o ji dị mma ka ị na-amụ Baịbụl? Legodị ihe a e sere n’okpuru ebe a:

Baịbụl ga-eme ka i nweta ihe karịrị ọlaedo. Ọ bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha azụ n’ụwa.

● Ọ ga-agwa gị otú ị ga-esi na-ebi ezigbo ndụ

● Ọ ga-akọrọ gị ihe ndị mere n’oge ochie na ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. O nweghịkwa akwụkwọ ọzọ ga-akọrọ gị ihe ndị a

● Baịbụl ga-enyere gị aka ịma ụdị onye ị bụ, nyekwara gị aka ịghọ ezigbo mmadụ *

ỊMỤ Baịbụl adịghị mfe. Ma, i jisie ike na-amụ ya, ọ ga-abara gị ezigbote uru. Ị chọọ ịma otú ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị si na-amụ ya, chakapụta peeji so peeji a ma pịajie ya. Ị pịajichaa ya, ọ ga-adị peeji anọ. Na peeji ndị ahụ, e kwuru ụfọdụ ihe ndị nwere ike ime ka ịmụ Baịbụl na-esiri gị ike nakwa otú ndị na-eto eto ibe gị sirila merie ha. E kwukwara aro ha tụrụ, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ka ịmụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Valerie * kwuru, sị: “O nweghị onye ga-amụ Baịbụl ghara ịmụta ihe ga-abara ya ezigbo uru ná ndụ. O nwere ọtụtụ ihe dị na Baịbụl mmadụ nwere ike ịmụ, o nweghịkwa onye ga-emekata sị na ya amụchaala ha.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ị chọọ ịma otú Baịbụl ga-esi emere gị ihe ndị a, gakwuru Ndịàmà Jehova bi n’obodo unu. I nwekwara ike jiri adres kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 degara ha akwụkwọ ozi.

^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 15, 16]

OTÚ E SI AMỤ BAỊBỤL

Nsogbu gị bụ: Ọ NAGHỊ AGỤ GỊ AGỤỤ

Nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna kwuru, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-agụ m agụụ ịnọrọ ọdụ ihe dị ka otu awa na-amụ Baịbụl.”

Ihe ga-enyere gị aka bụ: ỊMA URU Ị GA-ERITE

Ka ịmụ Baịbụl nwee ike ịtọ gị ụtọ, i kwesịrị ịma uru ị ga-erite. Ị̀ chọrọ ịma ihe ị ga-eme ka gị na Chineke bụrụ ezigbo enyi? Ị̀ chọrọ ịma ihe mere ụwa anyị a ji dewe imi na anya otú a o dewere? Ị̀ chọrọ ịmụta otú ị ga-esi na-akpakwu ezigbo àgwà? Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ ka Baịbụl ga-akọwara gị ma ị gbaa mbọ na-amụ ya.

Nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Bethany kwuru, sị: “Elela ịmụ Baịbụl anya ka ọ̀ bụ ọrụ ma ọ bụkwanụ ka à ga-asị na ị na-akwadebe ile ule n’ụlọ akwụkwọ. Kama, were ya na ọ bụ ihe ị ga-eme ka gị na Chineke bụrụ ezigbo enyi. Ị manụ na o nweghị enyi mmadụ ga-enwe ga-aka Jehova mma.”

Nwa agbọghọ aha ya bụ Iheoma kwuru, sị: “Oge mmadụ ji amụ Baịbụl bụ oge onye ahụ na Jehova ji akparịta ụka. Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-akparịta ụka naanị mgbe papa gị na mama gị nọ ya, ọ pụtara na onye ahụ abụghị enyi gị, kama ọ bụ enyi papa gị na mama gị. Jehova ga-abụ enyi gị ma ọ bụrụ na i wepụta oge na-amụ Baịbụl n’onwe gị.”

Cheta na Baịbụl kwuru, sị: “Ihe nile e dere n’Akwụkwọ Nsọ si n’obi Chineke pụta. Ọ bakwara úrù iji zi ihe, na iji tụ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche na omume mmadụ guzozie, na iji nye mmadụ ọ̀zụ̀zụ̀ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16, Bible Nsọ Ọhụụ) Ihe a bụcha ihe Baịbụl ga-emere gị.

Nwa okorobịa aha ya bụ Max kwuru, sị: “M mụwa Baịbụl, ihe m na-ebu n’obi bụ uru ọ ga-abara m. Ọ bụrụ na e nwere àgwà na-adịghị mma m na-akpa, ọ bụ oge ahụ ka m ji elebara onwe m anya, mara otú m ga-esi kwụsị ya.”

Jụọ onwe gị, sị:

Olee ihe ga-eme ka ịmụ Baịbụl gụwa m agụụ?

Nsogbu gị bụ: ỊMỤ IHE NA-AGWỤ GỊ IKE

Nwa agbọghọ aha ya bụ Nneka kwuru, sị: “M mụọ ihe ruo nkeji iri, ike ebido ịgwụ m. M jisie ike mụruo ya nkeji iri abụọ, obi m apụọ n’ihe m na-amụ. M siekwanụ ọnwụ mụruo ya nkeji iri atọ, ike agwụnyụọ m anya.”

Ihe ga-enyere gị aka bụ: ỊMA IHE Ị GA-EME KA UCHE GỊ NA-ADỊ N’IHE Ị NA-AMỤ

Chọpụta ihe mere o ji eme gị otú ahụ. Ihe mere o ji na-eme gị otú ahụ nwere ike ịbụ ụdị ihe ị na-amụ, otú i si na-amụ ya ma ọ bụkwanụ ebe ị nọ na-amụ ya.

Ifeanyi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ihe na-edochaghị gị anya, wepụta oge mee nchọnchọ n’ihe ahụ. I mee otú ahụ, obi ga-atọ gị ezigbo ụtọ ma i mechaa ghọta ya.”

Nwa okorobịa aha ya bụ Steven kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-agụ akụkọ dị na Baịbụl, were ya na ị nọ ebe ihe ahụ na-eme. Mee ka à ga-asị na ọ bụ gịnwa ka a na-akọ akụkọ ya ma ọ bụkwanụ gị emee ka onye nọ na-ele ihe ahụ ka ọ na-eme. Gbalịa mee ka à ga-asị na ọ bụ n’ihu gị ka ihe ahụ ị na-agụ na-eme.”

Alexandra kwuru, sị: “Chọọ ihe ị ga-eji eme ka ọmụmụ ihe na-atọ gị ụtọ. I nwere ike gaa n’úkwù osisi ebe ikuku ndụ ga-efesa gị nọrọ mụọ ihe. I nwekwara ike jiri mmanya ọtọ bịrịbịrị na ihe dị ka biskit na-emegharị ọnụ. Mụnwa na-eme otú ahụ. Echeghị m na o nwere onye na-agaghị achọ iji ihe ndị ahụ na-emegharị ọnụ ma ọ na-amụ ihe.”

Cheta na ọ bụ otú i si were ihe ị na-amụ ga-ekpebi ma ihe ahụ ị na-amụ ọ̀ ga-agwụ gị ike. N’ihi ya, kama ịsị na ihe ị na-amụ na-agwụ gị ike, kwuo na ike agwụla gị. Kweta na ọ bụ gịnwa nwere nsogbu, ọ bụghị ihe ahụ ị na-amụ. I mee otú ahụ, ọ ga-eme ka ị mara otú ị ga-esi merie nsogbu ahụ.—Ilu 2:10, 11.

Obiageri kwuru, sị: “Ịmụ ihe anaghị agwụ ike. Kama, ọ bụ otú mmadụ chọrọ ka ọ dịrị ya ka ọ ga-adịrị ya.”

Jụọ onwe gị, sị:

Gịnị ka m ga-eme ka uche m na-adị n’ihe m na-amụ?

Nsogbu gị bụ: Ị NAGHỊ ENWE OHERE

Nwa agbọghọ aha ya bụ Maria kwuru, sị: “Achọrọ m ịna-amụ Baịbụl, ma nsogbu m bụ mere nke a mere nke ọzọ. Anaghị m enwe ohere ịnọrọ ọdụ mụọ ihe.”

Ihe ga-enyere gị aka bụ: ỊMA IHE KA MKPA

Otu n’ime ihe e ji ama na mmadụ aghọwala dimkpa bụ onye ahụ ‘ịchọpụta ihe ndị ka mkpa.’—Ndị Filipaị 1:10.

Ifunanya kwuru, sị: “Mama m mere ka m ghọta na o nweghị otú oge ga-esi apụtara onwe ya, kama na ọ bụ mụnwa ga-ewepụta oge mụọ ihe. Mgbe ịmụ Baịbụl bidoro gụwa m agụụ, ewepụtaara m ya oge.”

Nwa agbọghọ aha ya bụ Yolanda kwuru, sị: “Ugbu a m tolitetụrụla, achọpụtala m na ọ bụ mụnwa ga-eji aka m wepụta oge mụọ ihe. Anaghị m ekwe ka ihe ọ bụla mee ka m ghara ịmụ ihe mgbe m kwuru m ga-amụ ya.”

Diana kwuru, sị: “I buru ụzọ na-amụ ihe tupu gwuwe egwu, o doro m anya na ịmụ ihe ga na-atọkwu gị ụtọ. Ihe ọzọkwa bụ, ị mụchaa ihe tupu gwuwe egwu, obi agaghị ama gị ikpe.”

Cheta na ọ bụrụ na ị naghị ebu ụzọ eme ihe ndị ka mkpa, ị gaghị emecha ihe ndị ị chọrọ ime. Gbaa mbọ wepụta oge ị ga-eji na-amụ ihe, ọ ga-abara gị uru.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Nwa okorobịa aha ya bụ Jordan kwuru, sị: “Mere nke a mere nke ọzọ dị n’ụlọ akwụkwọ anaghị enye m ohere. Ma, ịmụ Baịbụl so n’ihe mbụ m na-agba mbọ eme.”

Jụọ onwe gị, sị:

Olee ihe ndị m kwesịrị ịna-amụ n’ụbọchị?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 15]

ARO NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ TỤRỤ

Zachary—Ọ bụghị naanị ihe papa gị na mama gị ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-amụ ka ị ga na-amụ. Ọ bụ mgbe i ji aka gị na-amụ ihe ị chọrọ ịmụ ka ị ga-asị na ị na-amụ ihe n’onwe gị.

Kaley—Mgbe ị na-ebido ebido, amụla ihe buru oké ibu. O nwere ike bụrụ naanị nkeji ise ka i ji na-amụ ihe, ma, gbalịa na-amụ ya ụbọchị niile. Ka oge na-aga, i nwere ike si ná nkeji ise mụruo ya nkeji iri, sikwa nkeji iri mụruo ya nkeji iri na ise ma ọ bụkwanụ karịa. Nwayọọ nwayọọ otú ahụ, ọ ga-amalite tọwa gị ụtọ.

Daniela—E nwere ụmụ irighiri ihe i nwere ike ịna-eme, ka ihe ị na-amụ na-atọ gị ụtọ. I nwere ike zụrụ obere akwụkwọ ị ga-eji na-ede ihe ndị i metere na nchọnchọ.

Jordan—Ọ bụrụ na ihe m na-amụ bụ ihe na-atọ m ụtọ, ike anaghị agwụ m. M na-achọkwa ịnọ ebe ụzụ na-adịghị. Anaghị m anọli ebe ụzụ dị amụ ihe.

[Ihe Osise dị na peeji nke 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Si otú a chakapụta ya

Si otú a pịajie ya