Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Ekwu Ihe M Na-emecha Kwaa Mmakwaara?

Gịnị Mere M Ji Ekwu Ihe M Na-emecha Kwaa Mmakwaara?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Mere M Ji Ekwu Ihe M Na-emecha Kwaa Mmakwaara?

Isiokwu a ga-enyere gị aka ịma

IHE MERE i ji agwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ụfọdụ

IHE Ị GA-EME ma ị gwa mmadụ okwu ọjọọ

OTÚ ị ga-esi na-achịkwa ire gị

“M na-akpachara anya ka m ghara ịgwa mmadụ okwu ọjọọ. Ma, mgbe ụfọdụ, m na-ekwu ihe ọ na-abụ m kwuchaa, ya adị m ka ala mepee ka m daba.​—Chase

“Mgbe ụfọdụ, m na-ekwu ihe onye ọ bụla bu n’obi, ma, o nweghị onye chọrọ ka o si n’ọnụ ya pụta.”​—Allie

IHE MERE I JI EME YA

Amaokwu Baịbụl nke ga-enyere gị aka: “Ọ bụrụ na onye ọbụla anaghị emehie n’okwu, onye ahụ bụ onye tozuru okè.” (Jems 3:2, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Gịnị ka ihe a amaokwu Baịbụl a kwuru pụtara? Ọ pụtara na o nweghị onye nọ n’ụwa a ga-asị na ọ na-achịkwa ire ya mgbe niile. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Oluchi * kwuru, sị: “Ire m anaghị ekwe m njite, m na-ekwu ihe ọ bụla batara m n’ọnụ.” Otú a ọ dị Oluchi ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị.

Ihe mere eme: “O nwere enyi m gwara m na ya ga-achịrị efe ndị m na-anaghịzi eyi. Mụ agwa ya na ha agaghị aba ya. Echeghị m echiche kwuo ihe ahụ m kwuru. Ya asị m, ‘Ihe ị na-ekwunụ bụ na m bụ akpa akpụ.’”—Corrine.

Ihe anyị ga-agwa gị mee ugbu a ga-enyere gị aka ịma ihe mere i ji agwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ụfọdụ.

● Kanye na nke ọ bụla i chere bụ́ nsogbu gị.

․․․․․ M na-ekwu ihe ọ bụla batara m n’ọnụ ma iwe bịahaala m

․․․․․ M na-ekwu okwu n’echeghị echiche

․․․․․ Anaghị m ege ntị n’ihe mmadụ na-ekwu tupu mụ azaghachi ya

․․․․․ Ihe ọzọ 

Ihe atụ: “M na-egwukarị oké egwu, ọ dịghịkwa mma. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ama na okwu m gwara ha bụ okwu egwuregwu.”—Alexis.

Kanye n’onye nke ọ bụla ọ dị gị ka ì nwere ike ịgwa okwu ọjọọ.

․․․․․ Papa m ma ọ bụ mama m

․․․․․ Nwanne m

․․․․․ Enyi m

․․․․․ Onye ọzọ ․․․․․

Ihe atụ: Otu nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ, aha ya bụ́ Christine, kwuru, sị: “Ọ bụ ndị m kacha hụ n’anya ka m na-agwakarị okwu ọjọọ. Ihe m chere kpatara ya bụ na ahụ́ na-eru m ala ma mụ na ha nọrọ, ya emee anaghịzi m echebara ihe m na-agwa ha echiche.”

IHE Ị GA-EME MA I MEE YA

Amaokwu Baịbụl nke ga-enyere gị aka: “Na-achụso ihe na-eweta udo.” (Ndị Rom 14:19) Otu n’ime ụzọ ị ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru bụ ịrịọ onye ọ bụla ị gwara okwu ọjọọ mgbaghara.

Ihe mere eme: “Mama m nwụrụ mgbe m dị ọnwa iri, ọ bụghịkwa papa m zuru m, kama, ọ bụ nwanne mama m na di ya. Otu ụbọchị, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na otu, m nọ na-eche ọnwụ mama m, obi ajọ m njọ. Ka m nọ na-eche ụwa m, nwanne mama m bịara zie m ozi, iwe abịa m. Ka a na-eme ka a na-eme, ihe pụziri m n’ọnụ bụ: ‘Ihe gị na-ewe m iwe. Ihe mere i ji emegbu m bụ na ọ bụghị gị mụrụ m.’ Ozugbo m kwuru ihe ahụ, nwaanyị akwụrụ ọtọ kpọnwụọ. Ya abanye n’ime ụlọ ya, gbachie ụzọ, bewe ákwá. Onwe m agbụọ m. Legodị ụdị okwu ọjọọ m gwara nwaanyị bidoro mgbe m dị ntakịrị zụwa m, na-emere m ihe nne na-emere nwa ya. Di ya mechara gwa m okwu maka ihe ahụ merenụ, jiri Baịbụl gosi m ihe mere o ji dị mma ka m na-achịkwa ire m. Emechaziri m gakwuru ya rịọ ya mgbaghara n’ihi na achọpụtara m na emejọrọ m ya.”—Karen.

N’okpuru ebe a, dee otu ihe nwere ike ime ka ọ na-esiri gị ike ịrịọ onye ị gwara okwu ọjọọ mgbaghara.

․․․․․

Olee ihe mere ịrịọ onye ahụ mgbaghara ga-eji eme ka obi ruo gị ala?

․․․․․

Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ilu 11:2 na Matiu 5:23, 24, chebakwara ihe ha kwuru echiche.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mma ka ị ghara imete ihe ọ bụla ga-eme ka ị rịọwa mmadụ mgbaghara. Ma, olee otú ị ga-esi eme ya?

OTÚ Ị GA-ESI NA-ACHỊKWA IRE GỊ

Amaokwu Baịbụl nke ga-enyere gị aka: “[Bụrụ] onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Lee ihe ndị ga-enyere gị aka ime ihe a amaokwu Baịbụl a kwuru.

Gụọ amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe a, gụọkwa ihe ndị ahụ ndị mmadụ kwuru n’aka nri. N’igbe dị n’akụkụ amaokwu Baịbụl nke ọ bụla, denye nọmba okwu nke ya na amaokwu Baịbụl ahụ kwekọrọ.

Ilu 12:16

Ilu 17:14

Ilu 26:20

Ekliziastis 7:9

Ndị Filipaị 2:3

1 “Ọ bụrụ na onwe gị ahaghị gị ka elu na ala, ị gaghị na-ewekarị iwe n’obere ihe ọ bụla metụrụnụ.”—Amadi.

2 “Iwe wewe m, m na-esi ebe ahụ pụọ gaa ebe m ga-anọ naanị m ruo mgbe obi jụụrụ m.”—Uzoamaka.

3 “Mgbe m bụ nwata, mmadụ anaghị agwa m okwu ọjọọ mụ agba ya nkịtị. Ma ugbu a, amụtala m na ọ bụghị ụka niile ka a na-asa asa.”—Nkiru.

4 “Ọ bụrụ na mmadụ na-akparị gị ma ọ bụ na-abara gị mba, gị agbachi ya nkịtị, onye ahụ ga-emecha mechie ọnụ. Naanị nwee ndidi, emekwala ihe ga-eme ka nsogbu ahụ ka njọ.”—Chiamaka.

5 “Ọtụtụ mgbe, mmadụ na-akpasu m iwe, mụ agba ya nkịtị. Ihe m ga-agwa onye ahụ na-adị m n’obi, ma agaghị m ekwu ya. M hapụ ikwu ihe ahụ mgbe ahụ, m na-emecha chọpụta na ọ garaghị enwe isi ikwu ya. Amụtala m na mmadụ ekwesịghị ikwu ihe ọ bụla batara ya n’obi ma a kpasuo ya iwe.”—Onyedika.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22]

Allie—M chọọ ikwu ihe ọ bụla, m na-ebu ụzọ jụọ onwe m, sị: ‘Ihe a m chọrọ ikwu ọ̀ ga-eme ka ihe ka mma? Olee otú ihe a m chọrọ ikwu ga-adị onye m na-agwa ya?’ Ọ bụrụ na ị maghị otú ihe ị chọrọ ikwu ga-adị onye ị na-agwa ya, ọ ka mma ka ị ghara ikwu ya.

Chase—M chọọ ikwu okwu, m na-agbalị chee echiche otú ihe ahụ m chọrọ ikwu ga-adị ndị nụrụ ya. Ka m na-etokwu ka m na-amụtakwu ịchịkwa ire m. Mmadụ na-esi n’ihe mere ya amụta ihe.

[Igbe dị na peeji nke 29]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Ebe ọ bụ na Jems kwuru na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro,” nke ahụ gosiri na anyị niile ezughị okè. Jụọ papa gị na mama gị otú ha si gbaa mbọ na-achịkwa ire ha mgbe ha hà ka gị.​—Jems 3:2.

[Foto dị na peeji nke 28]

“Ị pịpụtahaala ihe e ji asa ezé, o nweghịzi mpịghachi. Otú ahụkwa ka okwu a gwara mmadụ dị. Ị gwahaala mmadụ okwu ọjọọ, ị gwachaala ya.”—James.