Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ime ma Ọ Dị Gị Ka Ndụ Ọ̀ Gwụla Gị Ike

Ihe I Nwere Ike Ime ma Ọ Dị Gị Ka Ndụ Ọ̀ Gwụla Gị Ike

Ihe I Nwere Ike Ime ma Ọ Dị Gị Ka Ndụ Ọ̀ Gwụla Gị Ike

N’AMERỊKA, a na-enwe ọtụtụ ndị na-anwa igbu onwe ha kwa afọ. Ndị na-emekarị ụdị ihe ahụ na-asị na ndụ agwụla ha ike, Baịbụl kwukwara ihe kpatara ya. Akwụkwọ 2 Timoti 3:1 kwuru na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ Gbalụ gbalụ dị n’ụwa a abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, ọ na-arakwa ọtụtụ ndị ahụ́. (Ekliziastis 7:7) N’ihi ya, mmadụ nwere ike chewe echiche igbu onwe ya ma nsogbu nke ya kpaa ya aka ọjọọ. Ya bụrụ na ụdị ihe a abatawa gị n’obi, gịnị ka i nwere ike ime?

Cheta na Ọ Bụghị Naanị Gị Ka Ụwa Na-ara Ahụ́

Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị gị ka nsogbu gị enweghị ọgwụgwụ, cheta na ọ bụghị naanị gị ka nsogbu na-echi ọnụ n’ala. Onye ọ bụla ị hụrụ taa nwere nsogbu ya na ya na-alụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu.” (Ndị Rom 8:22) Ị na-ele otú ihe si dịrị gị ugbu a, o nwere ike ịdị gị ka ụwa nke gị ọ̀ gwụla. Ma ọtụtụ mgbe, ihe na-emecha gbanwee. Ka ọ dịgodị, olee ihe ga-enyere gị aka?

Kọọrọ dimkpa, bụ́ ezigbote enyi gị, otú obi dị gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) E nwere otu nwoke a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, aha ya bụ Job. Mgbe nsogbu ụwa zuru ya ahụ́, ọ kọọrọ ndị ọzọ otú obi dị ya. Ọ bụ otú ụwa si dịrị ya mere o ji sị na ya ‘kpọrọ ndụ ya asị.’ N’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru, sị: “M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 10:1) Ọ bụrụ na ị kọọrọ mmadụ otú obi dị gị, o nwere ike ime ka ahụ́ rutụ gị ala. O nwekwara ike mee ka ị chọpụta na ụwa gị adịchaghị njọ otú ahụ i chere.

Gwa Chineke ihe gị na ya na-alụ. Ụfọdụ ndị na-asị na Chineke anaghị aza ekpere. Ma, Baịbụl kwuru na ọ na-aza. Abụ Ọma 65:2 kwuru na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Akwụkwọ 1 Pita 5:7 sịkwa na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ O nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru na Chineke na-enyere ndị tụkwasịrị ya obi aka. Dị ka ihe atụ:

ILU 3:5, 6 kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”

ABỤ ỌMA 145:19 kwuru, sị: [Jehova] ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.”

1 JỌN 5:14 kwuru, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe [Chineke] nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”

ILU 15:29 kwuru, sị: “Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya, ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.”

Ọ bụrụ na ị gwa Chineke ihe gị na ya na-alụ, ọ ga-enyere gị aka. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị gị: ‘Tụkwasị ya obi mgbe niile. Wụpụ obi gị n’ihu ya dị ka mmiri.’—Abụ Ọma 62:8.

Ihe Ọzọ I Nwere Ike Ime

E nwere ọrịa mmadụ nwere ike ịna-arịa, ya emee ka obi na-ada ya mbà. * A chọpụtakwala na ọtụtụ ndị ji aka ha gbuo onwe ha nwere ụdị ọrịa ahụ kemgbe ma ha amaghị. Ihe a gosiri na ọ dị mkpa ka onye na-arịa ụdị ọrịa ahụ gaa hụ dọkịta n’ihi na ọrịa ahụ nwere ike ime ka o chewe echiche igbu onwe ya. Dọkịta nwere ike gwa onye ahụ ọgwụ ọ ga-aṅụ ma ọ bụkwanụ ya agwa ya ụdị nri ndị ọ ga na-eri ma ọ bụkwanụ ndị nke ọ ga-asọwa. Mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike gwa onye ahụ ka ọ na-emega ahụ́. E nweela ọtụtụ ndị ndị dọkịta nyeere aka mgbe ha nwere nsogbu a. *

Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ndị ga-enyere gị aka, kwuokwa ihe ndị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe ga-emecha dị mma. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Mkpughe 21:4, Baịbụl kwuru ihe Jehova Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Ọ bụrụ na i chebara nkwa a Chineke kwere echiche, o nwere ike inyere gị aka idi nsogbu gị.

Ọ bụ nkwa a Chineke kwere anyị ka Ndịàmà Jehova na-akọrọ ndị mmadụ n’ụwa niile. O meekwala ka obi sie ọtụtụ ndị ike na nsogbu ụwa a ga-emecha bie. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Ndịàmà Jehova gosikwuo gị nkwa ndị ọzọ Chineke kwere anyị, i nwere ike gaa n’ebe ha na-amụ ihe. I nwekwara ike jiri adres dị na peeji nke 5 na magazin a degara ha akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ị chọọ ịgụkwu ebe e kwuru gbasara ịda mbà n’obi, gụọ Teta! Bekee nke ọnwa Julaị 2009, peeji nke 3-9.

^ par. 13 Magazin a anaghị ekwu na ọ bụ ihe a ma ọ bụ ihe a ka onye nwere ọrịa ahụ ga-eme, ya agwọ ya. Onye ọ bụla kwesịrị iji aka ya kpebie otú ọ ga-esi agwọ ihe na-arịa ya. Ma, onye ahụ kwesịrị ịsa anya ná mmiri kpebie ihe ọ ga-eme.

[Igbe dị na peeji nke 20]

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

● ‘Echegbula onwe gị banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jiri ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe ị na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche site n’aka Kraịst Jizọs.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.

● “Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m, ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.”—Abụ Ọma 34:4.

● “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

● “Ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” —Abụ Ọma 147:3.

[Igbe dị na peeji nke 21, 22]

Ọ BỤRỤ NA I CHEWE ECHICHE IGBU ONWE GỊ . . .

Kọọrọ dimkpa, bụ́ ezigbote enyi gị, otú obi dị gị

Gwa Chineke ihe gị na ya na-alụ

Gakwuru dọkịta ka o nyere gị aka

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

IHE NDỊ ENYI ONYE AHỤ NA NDỊ EZINỤLỌ YA NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na mmadụ echewe echiche igbu onwe ya, ọ na-abụkarị ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya na-ebu ụzọ ama. Ha nwere ike inyere onye ahụ aka. Ha kwesịrị imeda obi gee ya ntị mgbe ọ na-akọrọ ha otú obi dị ya. Ha kwesịkwara ime ka ọ mata na ha ghọtara na ihe ya na ya na-alụ abụghị obere ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Gwanụ ya ihe ọ ga-eme ga-enyere ya aka, nyekwaranụ ya aka hụ na o mere ya.