Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwụwa Aka Ọtọ

Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwụwa Aka Ọtọ

Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwụwa Aka Ọtọ

Otu nwoke bi n’Amerịka, aha ya bụ Stephen, kwuru, sị: “Ịkwụwa aka ọtọ bụ omenala ndị mgbe ochie. Onye kpọchiekwanụ ntị na-eme ya taa, ọ gaghị ahụ tụrụ rachaa.”

IHE a onye a kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ gwuo ibe ha wayo, ego abata ha aka. Ọ bụ ya mere ndị nke na-agbalị ịkwụwa aka ọtọ ji na-eche na àgwà ọma ha enweghị isi. Ihe ndị anyị ga-ekwu okwu ha ugbu a so n’ihe mere ndị mmadụ anaghịzi akwụwa aka ọtọ.

Ego Na-adọ Ha Akpịrị. O nweghị onye ihe ọma na-adịghị mma. N’ihi ya, o nwere ike isiri mmadụ ike ịkwụwa aka ọtọ ma ọ hụ na ime otú ahụ ga-anapụ ya ego chọrọ ịbata ya aka.

● Otu nwoke aha ya bụ Franz kwuru, sị: “N’ụlọ ọrụ anyị, ọ bụ mụnwa na-ekpebi ndị a ga-enye ọrụ ngo. Ndị mmadụ na-achọkarị inye m aka azụ ka m nye ha ọrụ. Ị manụ na ego a na-ataghị ahụhụ kpata na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ.”

Ha Chọrọ Ka Akpa Ha Ju. Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ụbọchị ọjọọ na-akpa ụlọ ọrụ dị iche iche aka. Ha na-agbalịkwa ka ha jiri ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị a na-arụpụta ugbu a na-arụ ọrụ. O nweghịkwa ụlọ ọrụ chọrọ ka ibe ya ka ya mma. Ndị e were n’ọrụ nweziri ike na-eche na ọ bụrụ na ha enyeghị ndị mmadụ aka azụ, o nweghị otú ha ga-esi eme ka akpa ụlọ ọrụ ha ju otú ahụ ndị nwe ya na ndị isi ha si chọọ.

● Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Amerịka kọrọ gbasara nwoke ndị uwe ojii jidere maka aka azụ ọ na-enye ndị mmadụ iji nwetara ụlọ ọrụ ha ọrụ ngo. Aha nwoke ahụ bụ Reinhard Siekaczek. Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ, o kwuru, sị: “Anyị chere na ụlọ ọrụ anyị agaghị na-enweta ọrụ ma ọ bụrụ na anyị anaghị enye aka azụ.”

Ndị Ọzọ Na-agwa Ha Mewe Otú Ahụ. Mgbe ụfọdụ, onye ya na mmadụ na-arụ ọrụ nwere ike gwa ya ka ọ na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ. Ndị ahịa mmadụ nwekwara ike gwa ya ka o mewe otú ahụ. E nwedịrị ike mee mmadụ ihe ga-eme ka ọ ghọwa aghụghọ otú ndị ọzọ na-aghọ.

● O nwere otu nwoke bi na Saụt Afrịka, aha ya bụ Johan. Nwoke a kwuru, sị: “O nwere ụbọchị manịja ụlọ ọrụ na-enyehi m ọrụ nne gwara m na ya ga-anara m ọrụ o nyere m ma ọ bụrụ na mụ enyeghị ya òkè nke ya. Ihe ọ na-ekwu bụ: M chọọ ka ha na-enye m ọrụ, m ga-enyerịrị ya aka azụ.”

O Si n’Omenala Ha. N’ebe ụfọdụ, mmadụ na-enye onye o si n’aka ya nweta ọrụ onyinye. N’ụdị ebe ahụ, ihe na-ekpebi otú a ga-esi ele onyinye ahụ anya bụ ihe onye nyere ya bu n’obi nye ya na otú onyinye ahụ hà. N’ọtụtụ mba, ndị ọrụ gọọmenti anaghị akwụwa aka ọtọ. Ha na-achọ ka mmadụ buru ụzọ nye ha ego tupu ha emeere ya ihe ha kwesịrị imere ya. O nwee ihe ọma ọ bụla ha meere mmadụ, ha achọọ ka onye ahụ kwụọ ha ụgwọ ya.

● Otu nwoke bi na Kolumbia, aha ya bụ William, kwuru, sị: “O siri ike ịma ihe dị iche n’ego mmiri oyi na aka azụ.”

Ọ Bụ Otú Ndị Ebe Ha Si Eme. Inye aka azụ na-akacha arị ibe ya elu n’ebe ndị mmadụ na-ahụghị tụrụ rachaa ma ọ bụ ná mba ebe ọ na-esiri ndị mmadụ ike ime ihe iwu obodo kwuru. N’obodo ndị ahụ, a na-ele ndị na-akwụwa aka ọtọ anya ka ndị ịkpa afọ ezinụlọ ha nyịrị.

● Ná mba Kọngo Kinshasa, otu nwoke aha ya bụ Tomasi kwuru, sị: “A na-ewere onye ghọgburu mmadụ ka ezigbo mmadụ ma ọ bụrụhaala na e jideghị ya.”

Ihe Mere Ịkwụwa Aka Ọtọ Ji Laa

N’agbanyeghị ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ anaghịzi akwụwa aka ọtọ, nke bụ́ eziokwu bụ na o mebiela ọtụtụ ihe. Mgbe a gbara ndị manịja iri bi n’Ọstrelia ajụjụ ọnụ, mmadụ itoolu n’ime ha kwetara na inye aka azụ dị njọ, kama na o nweghị otú a ga-esi kwụsị ya. Ha kwukwara na ha ga-eme ihe ọ bụla iji hụ na ha nwetaara ụlọ ọrụ ha ọrụ na ezigbo uru.

Ndị na-ana aka azụ na ndị na-enye aka azụ na-asị na ha na-akwụwa aka ọtọ. Gịnị mere ọnụ ji aka ha ikwu otú ahụ? Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ha na-aghọ onwe ha aghụghọ, na-ekwu na ha na-akwụwa aka ọtọ.” Ihe ha na-eme bụ: Ọ bụrụ na ha achọghị ka obi ha maa ha ikpe maka wayo ha chọrọ igwu mmadụ ma ọ bụkwanụ maka aka azụ ha chọrọ ịnara ya, ha etee okwu ha mmanụ.

Dị ka ihe atụ, mmadụ chọọ ka onye ọzọ nye ya aka azụ, ya asị ya: “Gbapụrụ m ihe” ma ọ bụkwanụ “Tie m aka n’obi.” Mmadụ nwekwara ike gwuo mmadụ ibe ya wayo, ya mechaa ya agwa onwe ya na ya hụrụ ụzọ.

Ndị ọzọ na-eme ha gwuo mmadụ wayo ma ọ bụ nara aka azụ, ha kwuwe gbasara ya, ha ekwuo ya ka à ga-asị na ọ bụ ihe ọma. O nwere otu nwoke na-arụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ gbasara ego. Aha ya bụ Tom. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ na-egwu ndị ọzọ wayo ma é nwebeghị onye jidere ya, ndị ọzọ na-ewere ya ka onye na-akwụwa aka ọtọ.” Otu nwoke bụ́bu ọchụnta ego, aha ya bụ David, kwuru, sị: “Mmadụ gwuo wayo, e jide ya, ndị mmadụ na-ewere ya ka onye ọjọọ. Ma, onye nke a na-ejidebeghị bụ ezigbo mmadụ. A na-asị na onye ọ bụla a na-ejidebeghị bụ onye hụrụ ụzọ.”

Ọtụtụ ndị na-ekwudị na ụwa ga-ara mmadụ ahụ́ ma ọ na-akwụwa aka ọtọ. Otu nwoke bụ́ aka ochie n’achụmnta ego kwuru, sị: “Ihe jiri ndị mmadụ n’olu, ha emee ihe ọ bụla ruru ha aka iji nweta ihe ha chọrọ.” Ma, ọ̀ dịnụ mma ime otú ahụ? Ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị akwụwa aka ọtọ ma na-ekwu na ha na-akwụwa aka ọtọ, í cheghị na ha “na-aghọgbu onwe ha”? (Jems 1:22) Ị gụọ isiokwu na-esonụ, ị ga-ahụ uru mmadụ ịkwụwa aka ọtọ bara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Ọ bụrụ na mmadụ na-egwu ndị ọzọ wayo ma é nwebeghị onye jidere ya, ndị ọzọ na-ewere ya ka onye na-akwụwa aka ọtọ”

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ụwa ga-ara mmadụ ahụ́ ma ọ na-akwụwa aka ọtọ