Ihe Na-agaziri Onye Na-akwụwa Aka Ọtọ
Ihe Na-agaziri Onye Na-akwụwa Aka Ọtọ
“Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” —Luk 12:15.
EGO dị ezigbote mkpa ná ndụ. Ọ bụ ya ka anyị na-eji egbo mkpa anyị na mkpa ndị ezinụlọ anyị. Chineke nyedịrị anyị iwu ka anyị na-egboro ezinụlọ anyị mkpa ha.—1 Timoti 5:8.
Ma, ego ekwesịghị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. O kwesịrị ịbụ naanị ihe i ji eme mkpa gị. Ego bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị, o nwere ike ime ka i gwuwe wayo ma ọ bụ nawa aka azụ. Ụdị ihe ahụ emeela ọtụtụ ndị. Ha anaghịdị ama na ego eriela ha isi otú ahụ ruo mgbe ha banyere ná nsogbu. Baịbụl kwukwara na onye hụrụ ego n’anya na-enwe ọtụtụ ihe mgbu.—1 Timoti 6:9, 10.
N’okpuru ebe a, o nwere mmadụ anọ ndị kọrọ akụkọ. Ihe ha kọrọ gosiri na ọ bụghị naanị ego mmadụ kpatara ka e ji ama ma ihe ọ̀ gazierela ya.
Ị Ga-enwe Ùgwù
Otu nwoke bi n’Amerịka, aha ya bụ Don, kwuru, sị: “O nwere mgbe otu nwoke bịakwutere m gwa m ka m zụpụtara ụlọ ọrụ ha otu ihe na-ada ezigbote ọnụ. A sị na m zụpụtaara ha ihe ahụ, m gaara enweta ezigbote ego na ya. Ma mgbe mụ na ya na-akpa nkata, ọ gwara m na ọ bụrụ na mụ azụpụtara ha ihe ahụ, na m ga-enye yanwa ọkara uru m gaara enweta. Agwara m ya na ihe ahụ o kwuru adịghị mma, nakwa na m ga-ada iwu obodo anyị ma m mee ya.
“Ajụrụ m ya, sị: ‘Ọ bụrụ na onye wayo abịakwute gị, gwa gị ka i nye ya ihe niile gbasara ego i nwere n’ụlọ akụ̀, ị̀ ga-ekwe?’ M gwaziri ya na ọ bụrụ na o mechaa gbanwee obi ya, ya bịa ka m zụpụtara ha ihe ahụ. Ruo taa, ahụbeghị m nwoke ahụ.
“A sị na m kwetara mee ihe ahụ o kwuru, ndị mmadụ gaara na-enyo m enyo ma a chọpụta. Ọ gakwaara eme ka a ghara ịna-akwanyere m ùgwù, meekwa ka nwoke ahụ jiri m na-eme ihe ọ bụla masịrị ya.”
Obi Ga-eru Gị Ala
N’isiokwu mbụ dị na magazin a, anyị kọrọ akụkọ gbasara Danny, onye bi na Họng Kọng. Cheta na mgbe ọ gara ụlọ ọrụ na-emepụta ngwá ahịa ha na-ere, manịja ụlọ ọrụ ahụ nyere ya ego ka ọ ghara ikwu otú ihe ha na-emepụta dị. Ị̀ ma ihe o mere mgbe e nyere ya ego ahụ?
O kwuru, sị: “Ekelere m ya maka nri ahụ o nyere m, nyeghachikwa ya ego ahụ. Ọ gbara mbọ ka m were ya, kwedị m nkwa na ọ bụrụ na ụlọ ọrụ anyị ekweta ịna-azụ ha ihe, ha ga-enye m ego ka nke ahụ. Ma, ekweghị m.
“A sị na m naara ya ego ahụ, obi agaraghị ezu m ike. Ụjọ gaara na-atụ m na manịja anyị ga-achọpụta. Mgbe manịja anyị mechara mata ihe ahụ merenụ, obi tọrọ m ezigbo ụtọ na anataghị m ego ahụ. Ihe gbatara m n’obi mgbe ahụ bụ Ilu 15:27, ebe kwuru, sị: ‘Onye na-eri uru na-ezighị ezi na-ewetara ụlọ ya nsogbu, ma onye kpọrọ iri ngo [ma ọ bụ ịna aka azụ] asị ga-adịrị ndụ.’”
Obi Ga-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ
Otu nwoke bi n’Amerịka, aha ya bụ Durwin, kwuru, sị: “M na-arụ ọrụ aka. M chọọ, m ga na-egwu ndị m na-arụrụ ọrụ wayo. O nwekwara ihe m ga-eme, mụ aghara ịna-akwụ gọọmenti ụtụ ndị m kwesịrị ịna-akwụ ha. Ma, anaghị m eme otú ahụ. Obi dịkwa mụ na ezinụlọ m ụtọ na m na-akwụwa aka ọtọ n’ihe m na-eme.
“Mmadụ kwesịrị ịna-ekwu eziokwu n’ihe niile ọ na-eme ná ndụ, ọ bụghị naanị n’ihe gbasara ọrụ ma ọ bụ ego. Ọ bụrụ na nwaanyị amara na di ya na-ekwu eziokwu n’ihe niile ọ na-eme, ọ ga na-atụkwasị ya obi. Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ma nwoke chọpụta na nwunye ya na-ekwu eziokwu. Onye nke ọ bụla ga-ama na ọ bụghị ihe siwe ike, ibe ya emebie iwu Chineke.
“Mmadụ nwere ike nwee ụlọ ọrụ ọ na-enweghị nke hà ka ya n’ụwa, ma ọ bụghị ya ga-eme ka nsogbu ghara ịdị n’ezinụlọ ya. Abụ m Onyeàmà Jehova, achọpụtakwala m na ime ihe Baịbụl kwuru anaghị eme ka ụwa raa mmadụ ahụ́. Ana m ewepụta oge ka mụ na ezinụlọ m na-anọkọ. Anaghị m ekwe ka ego ụwa na-akpụgharị m, abụghịkwa m onye anyaukwu.”
Gị na Chineke Ga-adị ná Mma
O nwere otu nwaanyị bi na Filipinz, aha ya bụ Raquel. O kwuru, sị: “N’ụlọ ọrụ anyị, ọ bụ mụnwa na-azụ ihe ndị e ji arụ ọrụ. Mgbe ụfọdụ, ndị m na-azụkarị ihe n’aka ha na-esepụrụ anyị ego, gwa m ka ha nye m ụfọdụ n’ime ego ahụ ha sepụụrụ anyị. Ọ bụrụ na m kweta nara ha ya, ọ pụtara na mụ ezuola ụlọ ọrụ anyị ohi.
“Ego a na-akwụ m ehichaghị nne. M chọọ, m ga na-anara ha ego ahụ. Ma, o nweghị ihe mmadụ ga-enwe n’ụwa a ya akarịa onye ahụ na Chineke ịdị ná mma. O nweghịkwa ihe karịrị mmadụ ịnọ, obi ya aghara ịna-ama ya ikpe. Ọ bụ ya mere m ji agba mbọ ime ihe e kwuru ná Ndị Hibru 13:18, bụ́ ebe sịrị: ‘Na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
Amaokwu Baịbụl Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịkwụwa Aka Ọtọ
A bịa n’ịchụ ego, mba ọ bụla nwere otú ha si eme. Ma, Baịbụl kwuru ụzọ ihe isii ọ ga-abụ ị na-eme, ya abụrụ na ị na-akwụwa aka ọtọ. Ihe ndị ahụ o kwuru ga-abakwara gị uru n’agbanyeghị mba i bi. Legodị ụzọ ihe isii ahụ:
Na-ekwu eziokwu
Amaokwu Baịbụl: “Adịla na-aghara [mmadụ ibe gị] ụgha.”—Ndị Kọlọsi 3:9.
Abụla Ò Kwu Ọzọ Eme Ọzọ
Amaokwu Baịbụl: ‘Ka Ee i kwuru bụrụ Ee, ka Ee e i kwuru bụrụ Ee e.’—Matiu 5:37.
Bụrụ Onye A Ga-atụkwasị Obi
Amaokwu Baịbụl: “Ekpughekwala okwu nzuzo onye ọzọ.”—Ilu 25:9.
Anala Aka Azụ
Amaokwu Baịbụl: “Erila ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya.”—Ọpụpụ 23:8.
Mee Mmadụ Ihe Ị Ga-achọ Ka E Mee Gị
Amaokwu Baịbụl: ‘Ya mere, ihe niile ị chọrọ ka ndị mmadụ na-emere gị, gịnwa meere ha otú ahụ.’—Matiu 7:12.
Adala Iwu Obodo
Amaokwu Baịbụl: ‘Na-enye mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọ ya ụtụ isi.’—Ndị Rom 13:7.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ihe Ị Ga Na-eme Ka I Nwee Ike Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Achụmnta Ego
● Chọpụta Ihe Ka Gị Mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ inwe ego ka gị mkpa ka ọ̀ bụ gị na Chineke ịdị ná mma?
● Buru Ụzọ Kpebie Ihe Ị Ga-eme. Chee echiche ihe ndị ọ ga-abụ ya mee, ya esiere gị ike ịkwụwa aka ọtọ. Kpebizie ihe ị ga-eme ma ihe ahụ mee.
● Mee Ka A Mara Ebe Ị Kwụ. Mgbe ọ bụla gị na mmadụ chọrọ imekọ ihe ego, mara otú ị ga-esi etinyere ya okwu ka ọ mara na ọ banyehaala n’ihe igwu wayo na iri ngarị, aka gị adịghị ya.
● Gwa Ndị Ọzọ Ka Ha Tụọrọ Gị Aro. Ọ bụrụ na ihe esiwere gị ike, nke na obi gị na-agwa gị ka i gwuo wayo ma ọ bụkwanụ nara aka azụ, gakwuru onye na-atụ Chineke egwu ka ọ tụọrọ gị aro ihe i nwere ike ime.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ọ bụrụ na ị na-akwụwa aka ọtọ, obi ga na-eru gị ala