Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inye Aka Azụ Zuru Ụwa Ọnụ

Inye Aka Azụ Zuru Ụwa Ọnụ

Inye Aka Azụ Zuru Ụwa Ọnụ

O nwere otu nwoke bi n’obodo a na-akpọ Họng Kọng. Aha ya bụ Danny. * Ọ na-arụ n’otu nnukwute ụlọ ahịa e nwere n’obodo ahụ. Otu ụbọchị, nwoke a gara n’ụlọ ọrụ na-emepụta ngwá ahịa ha na-ere, gwa ha na ha ga-achọ ka ngwá ahịa ha ga na-emepụtara ha bụrụ ọkpọka. Mgbe ha na ya kwurịtachara, ndị nwe ụlọ ọrụ ahụ kpọọrọ ya gaa iri nri. Ka ha nọ na-eri nri, manịja ụlọ ọrụ ahụ kpakwụnyere ya envelopu n’aka. Mgbe o mepere ya, ọ hụrụ nnukwute ego hà ka ego a na-akwụ ya n’otu afọ. Ego ahụ e nyere ya bụ ego e ji chọọ imechi ya ọnụ.

● Ọ bụghị naanị Danny ka ụdị ihe a metụrụla. N’ụwa niile, otú ndị mmadụ si na-enye aka azụ taa abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ akụkọ ndị Amerịka kwuru na n’agbata afọ 2001 na 2007, otu nnukwute ụlọ ọrụ ndị Jamanị nyere ọtụtụ ụlọ ọrụ aka azụ ka ha nwee ike nye ha ọrụ ha ga-arụrụ ha. Akwụkwọ akụkọ ahụ sị na ihe ndị e nwetara n’ụlọ ikpe gosiri na ụlọ ọrụ ahụ mefuru otu ijeri dọla na narị nde dọla anọ (ya bụ, ihe dị ka narị ijeri naịra abụọ na ijeri naịra iri na abụọ na narị nde naịra asatọ).

Ọ bụ eziokwu na ụdị aka azụ a emeela ka e mee iwu ka a ghara ịna-enye aka azụ, ihe ka na-aka njọ. Nchọpụta otu ụlọ ọrụ mere n’afọ 2010 gosiri na iri ngarị zuru ụwa niile ọnụ. O gosikwara na ọ bụ kemgbe afọ atọ gara aga ka o bidoro kawa njọ.

Gịnị mere ọtụtụ ndị anaghịzi akwụwa aka ọtọ? Mmadụ ịkwụwa aka ọtọ taa ọ̀ badịrị uru? Ọ bụrụ na ọ bara, gịnị na gịnị ka anyị ga na-eme ya abụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ? Baịbụl ò nwere ike inyere anyị aka?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.