Mmadụ Ịbụ Onye A Ma Ama Ọ̀ Dị Njọ?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Mmadụ Ịbụ Onye A Ma Ama Ọ̀ Dị Njọ?
N’ime ihe atọ a e dere ebe a, olee nke i chere kacha mma?
Ọ dị mma ka ․․․․․.
A. mmadụ bụrụ onye a ma ama n’ihe niile
B. mmadụ bụrụ onye a ma ama n’ihe ụfọdụ
CH. mmadụ ghara ịbụ onye a ma ama
NKE kacha ha niile mma bụ “B.” Maka gịnị? Maka na onye a ma ama na-eme ihe na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ. Ị manụ na ọ bụghị mgbe niile ka ihe mmadụ ịmasị ndị ọzọ dị njọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ “ìhè nke mba niile.” O kwukwara na ihe ha ga-amasị ndị mmadụ. (Aịzaya 42:6; Ọrụ 13:47) N’ihi ya, e nwere ike ịsị na a ma Ndị Kraịst ama.
Ị̀ ma na Jizọs bụ onye a ma ama mgbe ọ bịara n’ụwa? Baịbụl kwuru na mgbe ọ bụ nwatakịrị, o nwere “ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.” (Luk 2:52) Baịbụl kwukwara na mgbe ọ ghọrọ dimkpa, “oké ìgwè mmadụ si na Galili na Dikapọlis na Jeruselem na Judia na ofe Jọdan soro ya.”—Matiu 4:25.
Ihe mere nke Jizọs ji dị mma bụ na o jighị aka ya na-achọ ka ndị mmadụ mara ya. O jighị maka na ya chọrọ ka ihe ya masịwa ndị mmadụ mewe ihe na-adịghị mma. Kama, ọ na-eme ihe ziri ezi, bụ́kwanụ ihe mere ihe ya ji masị ndị mmadụ mgbe ụfọdụ. (Jọn 8:29, 30) Jizọs ma na ọ bụrụgodị na ndị mmadụ etoo ya taa, ha nwere ike gbanwee obi ha echi. O jidị ọnụ ya kwuo na ụmụ mmadụ ga-egbu ya.—Luk 9:22.
Nke Bụ́ Eziokwu Bụ: Mmadụ ịbụ onye a ma ama dị ka mmadụ inwe ego. Inwe ego adịghị njọ, kama, ihe na-abụ nsogbu bụ otú onye ahụ si na-achụ ya. Otú ahụkwa ka ọ dị ná mmadụ ịbụ onye a ma ama.
Kpachara anya ka ị ghara ịdị ka ọtụtụ ndị na-eto eto. Ha nwere ike mee ihe a sị emela ka ndị mmadụ wee mara ha. Ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe ndị mmadụ chọrọ, ka ha na ha nwee ike ịdị ná mma. O nwekwara ndị nke ọrụ ha bụ ịchọ okwu. Ha na-amanye ndị mmadụ ka ihe ha masị ha. Ha achọghịdị ịma ma ndị ahụ hà na-eme ihe ahụ ha chọrọ naanị iji gbaara nsogbu ha ọsọ. *
Na peeji so peeji a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ atọ ndị mmadụ si eme ka a mara ha. Abụọ n’ime ha adịghị mma, otu nke ọzọ bụ otú mmadụ kwesịrị isi mee ka a mara ya.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 E nwere ndị dịrị ndụ n’oge ochie. Baịbụl kpọrọ ha “ndị Nefilim.” Ọrụ ha bụ ịchọ ndị mmadụ okwu. Baịbụl kwukwara na ha bụ “ndị ikom a ma ama.” Mkpa ha bụ ka ndị mmadụ na-atụ ha ụjọ.—Jenesis 6:4.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18], 19
ỤZỌ ATỌ NDỊ MMADỤ SI EME KA A MARA HA
IME IHE NDỊ MMADỤ CHỌRỌ
Achọrọ m ka ihe m na-amasị ndị mmadụ.
Otú m ga-esi eme ya bụ ịna-akpa àgwà otú ha na-akpa.
“Mgbe m bidoro ịkpa àgwà otú ibe m na-akpa, o yiri ka mụ na ha ọ̀ malitere tọwa. Ma, emechara m chọpụta na mmadụ ekwesịghị ịgbanwe àgwà ọma ya ebe ọ na-achọ ka ihe ya masịwa ndị ọzọ.”—Nicole.
Ihe Baịbụl kwuru: N’Ọpụpụ 23:2, otu nsụgharị Baịbụl kwuru, sị: “Emekwala ihe naanị na ị hụrụ na ndị ọzọ na-eme ya. . . . I kwesịghị ikwe ka ndị mmadụ mee ka i mee ihe na-adịghị mma.”
ỊMANYE NDỊ MMADỤ AMANYE
Ihe m dị mbụ amasị ndị mmadụ, achọkwara m ka ọ dịgide otú ahụ.
Agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla gbanwee ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na m ga-amanye ha amanye.
“Ndị ọgbọ anyị ejighị ya n’egwu. Ha na-amanyekarị ndị mmadụ ka ha mee ihe ha na-achọghị ime. Ha gakwuru ndị ụjọ, ndị ahụ ekweta ihe ha kwuru ozugbo.”—Raquel.
Ihe Baịbụl kwuru: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”—Luk 6:31.
OTÚ DỊ MMA
1 Mara ihe i kwesịrị ime. Baịbụl sị na ‘a zụrụ ikike nghọta ndị tozuru okè azụ ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’—Ndị Hibru 5:14.
2 Agbanwela àgwà ọma gị. Kpebisie ike na ị ga-adị ka Jọshụa. Ọ bụ obi ike ka o ji kwuo, sị: “Họrọnụ taa onye unu ga-efe . . . Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.”—Jọshụa 24:15.
3 Obi sie gị ike na ụzọ a ị nọ bụ ezigbo ụzọ. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike.”—2 Timoti 1:7.
I soro ụzọ a dị mma, o nwere ike ọ gaghị abụ mmadụ niile ga-ama gị. Ma, ihe gị ga na-amasị ndị ezigbo mmadụ.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]
IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU
Melissa kwuru, sị: “Ị chọọ, i nwere ike na-eme otú ụmụ akwụkwọ ibe gị na-eme. Ma, ọ dịghịnụ mma otú ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-efe Chineke, nke gị ka mma. Ọ bụghị ya ga-eme ka ndị mmadụ gbawara gị ọsọ. Kama, ọ ga-emedị ka ihe gị na-amasị ha.”
Ashley kwuru, sị: “O nwere mgbe ọ naara abụ m nọrọ n’ụlọ akwụkwọ, ya adị m ka o nweghị onye ma m. Ma, m gaa ebe anyị na-amụ Okwu Chineke, mụ na ndị enyi m, ndị àgwà ọma m na-akpa na-amasị, anọrọ. Mụ na ha nọrọ, m na-echefu ihe niile gbasara ụmụ akwụkwọ anyị, anaghịkwa m echegbuwe onwe m otú m ga-esi mee ihe ga-amasị ha.”
Phillip kwuru, sị: “Ihe ga-eme ka ihe gị masị ndị mmadụ bụ igosi ha na ihe ha masịrị gị. Kemgbe a m malitere ịna-emere ndị enyi m ihe ọma, mụ na ha adịkwuola ná mma.”