Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe I Nwere Ike Ime Ka Gị na Onye Kpasuru Gị Iwe Kpezie?

Olee Ihe I Nwere Ike Ime Ka Gị na Onye Kpasuru Gị Iwe Kpezie?

Echiche Baịbụl

Olee Ihe I Nwere Ike Ime Ka Gị na Onye Kpasuru Gị Iwe Kpezie?

BAỊBỤL kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) E nwere ihe karịrị ijeri mmadụ asaa n’ụwa a, o nweghịkwa onye n’ime ha zuru okè. N’ihi ya, ndị mmadụ na-emejọkarị ibe ha. Ma, ọ bụrụ na mmadụ akpasu anyị iwe, olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị na onye ahụ kpezie?

Baịbụl ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. O kwuru na Jehova, onye kere anyị, bụ “Chineke nke udo.” (Ndị Hibru 13:20; Abụ Ọma 83:18) Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na ibe ha na-adị n’udo. O nweghịkwa onye ka yanwa eme udo. Mgbe ya na Adam na Iv sere okwu n’ihi isi ha nupụụrụ ya, o mere ihe ozugbo iji hụ na ya na ụmụ mmadụ dịghachiri ná mma. (2 Ndị Kọrịnt 5:19) Legodị ihe atọ i nwere ike ime ma mmadụ mejọọ gị.

Jiri Obi Gị Niile Gbaghara Ya

Ihe Baịbụl kwuru “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe mere o ji ara ahụ́ O nwere ike ịbụ na onye ahụ mejọrọ gị n’eziokwu, gị ekpebie na o nweghịzi ihe jikọrọ gị na ya. O nwekwara ike bụrụ na ị na-atụ anya ka ọ bịa rịọ gị mgbaghara. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ amaghịdị na ya mejọrọ gị, ma ọ bụkwanụ na o weere na ọ bụ gịnwa mejọrọ ya, ị manụ na ọ ga-esi ezigbo ike tupu unu ekpezie.

Ihe i nwere ike ime Jiri obi gị niile gbaghara ya otú ahụ Baịbụl kwuru, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ihe ahụ abụghị oké ihe. Cheta na ọ bụrụ na Chineke na-agụkọrọ anyị mmehie anyị niile, ụwa gaara ara anyị ezigbo ahụ́. (Abụ Ọma 130:3) Baịbụl kwuru na “Jehova dị ebere, na-emekwa amara, ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:8, 14.

Akwụkwọ Ilu 19:11 kwukwara ihe ọzọ ga-enyere gị aka. Ọ sịrị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.” Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere mmadụ ji gwa anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee anyị ihe were anyị iwe, ọ ga-adịrị anyị mfe ịgbaghara ya. N’ihi ya, ihe ị ga-ajụ onwe gị bụ, ‘Ọ̀ bụ ike ọgwụgwụ mere onye a ji mee m ihe a o mere m, ka ọ̀ bụ na ahụ́ adịghị ya? Ọ̀ ga-abụ na o nwere ihe ya na ya na-alụ?’ Ị mata ihe mere mmadụ ji mee ihe o mere, ọ ga-eme ka i leghara ihe ụfọdụ o mere gị anya, ọ bụghịkwa ihe niile o mere ga na-ewe gị iwe.

Gakwuru Ya

Ihe Baịbụl kwuru ‘Ọ bụrụ na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru.’—Matiu 18:15.

Ihe mere o ji ara ahụ́ Ụjọ, iwe, ma ọ bụ iche na onye ahụ ga-emenye gị ihere ma ị gakwuru ya nwere ike ime ka o siere gị ike ịgakwuru ya ka unu kpezie. I nwekwara ike na-akọsara ndị mmadụ ihe ahụ e mere gị, ka ndị ị na-akọrọ ya dụnyere gị úkwù. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ihe ka njọ.

Ihe i nwere ike ime Ọ bụrụ na ihe onye ahụ mere gị abụghị obere ihe, ị chọghịkwa ileghara ihe ahụ anya, gakwuru ya ka unu kwurịta ya. Lee otú ị ga-esi eme ya:

(1) Gaa ozugbo: Asịla e mechaa. Ọ bụrụ na ị gaghị ozugbo, nsogbu ahụ nwere ike ịka njọ. Gbalịa mee ihe Jizọs kwuru na Matiu 5:23, 24. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”

(2) Agakwala ka unu sewe okwu: Ihe mere i ji agakwuru ya abụghị ịga kwuwe onye chọrọ okwu na onye na-achọghị okwu. Kama, ị na-aga ka unu kpezie. N’ihi ya, ị gakwuru ya, ọ ga-aka mma ịgwa ya ihe mere ihe ahụ o mere ji na-ewute gị kama ịgwawa ya na o mere gị ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: ‘Na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe unu elu.’—Ndị Rom 14:19.

(3) Akọsala ya: Gbalịa ka ị ghara ịkọrọ ndị ọzọ nsogbu ahụ. Akwụkwọ Ilu 25:9 kwuru, sị: “Gị na mmadụ ibe gị kpezie okwu, ekpughekwala okwu nzuzo onye ọzọ.”

Nweere Ya Ndidi

Ihe Baịbụl kwuru “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ma, ‘ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.’”—Ndị Rom 12:17, 20.

Ihe mere o ji ara ahụ́ Ọ bụrụ na onye ahụ ekweghị ka gị na ya kpezie mgbe mbụ ị gakwuuru ya, i nwere ike kpebie na o nweghịzi ihe ga-ejikọ gị na ya.

Ihe i nwere ike ime Nweere ya ndidi. Onye ọ bụla nwere otú o si ewe iwe nke ya, anyị niile nwekwara otú anyị si aghọta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ha. O nwere ndị ọ na-ara ahụ́ iwe apụọ ha n’obi, nweekwa ndị nke na-agbalị ka ha na-eme ihe ha na-amụta na Baịbụl. Ụdị onye ọ sọrọ onye ahụ ya bụrụ, medaa obi na-eso ya, hụkwa ya n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.—Ndị Rom 12:21.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka onye anyị na ya sere okwu kpezie, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi. Anyị kwesịkwara ịchọpụta ihe mere mmadụ ji mee ihe o mere, kwesịkwa inwere onye ahụ ndidi ma hụ ya n’anya. Mbọ ọ bụla anyị gbara ka anyị na onye ahụ kpezie alaghị n’iyi.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị ga-enyere gị aka ka i jiri obi gị niile gbaghara onye mejọrọ gị?​—Ndị Kọlọsi 3:13.

● Gịnị ga-enyere gị aka ịgakwuru onye mejọrọ gị ka unu abụọ kpezie?​—Matiu 5:23, 24.

● Olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na onye mejọrọ gị ekweghị ka unu kpezie mgbe ị gakwuuru ya?​—Ndị Rom 12:17-21.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”—ILU 19:11