Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ekpe Ekpere?
Echiche Baịbụl
Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ekpe Ekpere?
CHINEKE meere anyị ihe ọma na-enweghị atụ. O nyere anyị ohere ka anyị na-akọrọ ya ihe na-akpa anyị. Ma, e nwere ọtụtụ ndị na-amaghị otú e si ekpe ekpere, nweekwa ndị nke chọrọ ịmụta otú ka mma ha ga-esi na-ekpe ekpere. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ka ọ kụziere ha otú ka mma ha ga-esi na-ekpe ekpere. N’ihi ya, otu n’ime ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ kụziiri ha ekpere a na-akpọkarị Ekpere nke Onyenwe Anyị. Ekpere a dị mma, ọ naghịkwa ara ahụ́ mmụta. Ọ na-enyere anyị aka ịgwa Chineke okwu otú ga-adị ya mma, na-enyekwara anyị aka ịghọta isi ihe Baịbụl na-akụzi.
Ekpere nke Onyenwe Anyị
Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa; gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ. Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’”—Matiu 6:9-13.
Ị̀ chọpụtara na Jizọs sịrị: “Kpeenụ ekpere otú a”? Gịnị mere o ji kwuo ya? Ọ bụ maka na ọ chọghị ka ndị na-eso ụzọ ya na-ekwughachi ihe ndị ahụ ọ gaje ikwu ma ha na-ekpe ekpere nke ha. Tupu o kwuo ihe ahụ, o bu ụzọ gwa ha ka ha ghara ịna-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro ma ha kpewe ekpere. (Matiu 6:7) Ọ pụtaziri na ihe Jizọs kwuru n’Ekpere nke Onyenwe Anyị bụ ihe ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi hazie ihe ndị anyị ga-ekpe n’ekpere. Jizọs chọrọ ka anyị mata na anyị kwesịrị ibu ụzọ kpee ekpere maka ihe ndị dị Chineke ezigbo mkpa, ọ bụghị ihe ndị dị anyịnwa mkpa. Ka anyị nwee ike ịghọta ihe ndị ahụ dị Chineke mkpa, anyị kwesịrị ilebara okwu ndị ahụ Jizọs kwuru anya nke ọma. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe o bu n’obi kwuo ihe ndị ahụ o kwuru. Ka anyị lebazie ha anya otu otu.
Ihe Ekpere nke Onyenwe Anyị Pụtara
“Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” Jizọs kpọrọ Chineke “Nna” n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị otú ahụ nna mmadụ na-eme. O nwekwara aha, aha ya bụ Jehova. Ọ bụ eziokwu na e nwere aha ndị a na-etu ya, ndị dị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na Onyenwe Anyị, ma, ihe ndị ahụ abụghị ezigbo aha ya. * (Abụ Ọma 83:18) Ma, olee ihe mere Jizọs ji gwa anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ? Ọ bụ maka na e kwutọọla aha Chineke, bookwa ya ebubo.
Ihe siwere ụfọdụ ndị ike, ha asị na ọ bụ Chineke kpatara ya. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ọ bụ ụmụ mmadụ na-eji aka ha akpatara onwe ha nsogbu. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-abụ ihe ndabara. (Ilu 19:3; Ekliziastis 9:11) Ndị ọzọkwa na-asị na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị dị ka ala ọma jijiji. Ma, Baịbụl kwuru na ‘e nweghị ike iji ihe ọjọọ nwaa Chineke nakwa na ya onwe ya anaghị anwa onye ọ bụla.’ (Jems 1:13) Ọtụtụ ndị chọọchị na-akụzikwara ndị òtù ha na Chineke na-ata ndị ọjọọ ahụhụ n’ọkụ mmụọ. Ihe a ha na-akụzi na-ewe Chineke ezigbote iwe n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. (Jeremaya 19:5; 1 Jọn 4:8) Akwụkwọ Ndị Rom 6:23 ekwughị na ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ịta ahụhụ n’ọkụ mmụọ kama ọ sị na ọ bụ ọnwụ. *
“Ka alaeze gị bịa.” Alaeze Chineke bụ ọchịchị. Daniel 7:14 kwuru na e nyere Jizọs ọchịchị na ùgwù na alaeze. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amalite ịchị ụwa. Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ihe anyị na-ekwu bụ ka ọ bịa gbooro ụmụ mmadụ mkpa ha, ka ọ bịa wepụ ọchịchị ndị dị ugbu a, nakwa ka ọ bịa chịwa ụmụ mmadụ.—Daniel 2:44.
Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze Alaeze ahụ. Akwụkwọ“Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Alaeze Chineke chịwa ụwa, ụmụ mmadụ ga na-eme uche Chineke. N’ihi ya, udo ga-adị ebe niile, ụmụ mmadụ ga na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya. Ọ bụ ihe a ka Baịbụl na-ekwu n’akwụkwọ Mkpughe 21:3, 4. Ebe ahụ sị: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”
“Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.” Mgbe Jizọs kwuchara na anyị kwesịrị ibu ụzọ kpee ekpere maka aha Chineke na Alaeze ya, o kwuziri na anyị kwesịrị ịrịọ Chineke mkpa anyị. Ihe o kwuru gosiri na ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke bụ naanị nri anyị ga-eri n’ụbọchị nke ọ bụla. Nke a pụtara na arịrịọ anyị ga-arịọ Chineke ga-adị ka nke ahụ dị n’Ilu 30:8, bụ́ ebe sịrị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m.”
“Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.” Ụgwọ Jizọs na-ekwu okwu ya ebe a bụ mmehie. Anyị niile kwesịrị ịna-erubere Chineke isi. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị enupụrụ ya isi, ọ pụtara na anyị ejidela ya ụgwọ. Ma, Jehova ga-agbaghara anyị ụgwọ ahụ anyị ji ya ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị.—Matiu 18:21-35.
“Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” “Ajọ onye ahụ” bụ Setan Ekwensu. Baịbụl kpọkwara ya “Onye Ọnwụnwa.” (Matiu 4:3) Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka imeri Setan na ndị mmadụ o ji arụ ọrụ. Ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-arịọ ya arịrịọ a bụ maka na anyị ezughị okè.—Mak 14:38.
Ka Ekpere nke Onyenwe Anyị nyere gị aka ịma ihe ndị i kwesịrị ibu ụzọ kpee n’ekpere. Nke a ga-eme ka ị na-ekpe ekpere otú ka mma. Ma, oleekwanụ otú Ekpere nke Onyenwe Anyị si enyere anyị aka ịghọta isi ihe Baịbụl na-akụzi? Ọ bụrụ na i leruo anya n’otú a Jizọs kụziri ka e si na-ekpe ekpere, ị ga-achọpụta na isi ihe Baịbụl na-akụzi bụ otú a ga-esi doo aha Chineke nsọ, otú a ga-esi wepụ ihe ọjọọ n’ụwa, na otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa. Ị́ hụghị na e nwere ọtụtụ ihe Jizọs ji Ekpere nke Onyenwe Anyị kụziere anyị?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Mgbe e dere Baịbụl, asụsụ Hibru na asụsụ Grik so n’asụsụ ndị e ji dee ya. Mgbe ahụ, aha Chineke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa. Ọ dị mwute ikwu na a na-ejizi aha ndị a na-etu Chineke edochi aha ya na Baịbụl ndị a na-asụgharị ugbu a.
^ par. 9 Ndị mmadụ na-asị na onye nwụọ, ya agaa ebe ọzọ gaa dịrị ndụ. Ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu n’ihi na Jizọs sị na onye nwụrụ anwụ dị ka onye na-ehi ụra. Baịbụl kwukwara na onye “nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị,” kama, ọ nọ n’ili na-echere mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; 11:11-13; Ekliziastis 9:5.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
● Olee ihe mere Jizọs ji sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a”?—Matiu 6:9.
● Olee ihe ndị anyị kwesịrị ibu ụzọ kpee n’ekpere?—Matiu 6:9, 10.
● Gịnị bụ “ụgwọ anyị ji” Chineke, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịgbaghara ndị mejọrọ anyị?—Matiu 6:12.
[Foto dị na peeji nke 13]
Ihe Jizọs kwuru n’Ekpere nke Onyenwe Anyị ga-enyere gị aka ịma ihe ndị dị Chineke mkpa i kwesịrị ibu ụzọ kpee n’ekpere