Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ajụjụ nke Ụwa Ka Na-echeta Ruo Taa

Onye Ajụjụ nke Ụwa Ka Na-echeta Ruo Taa

Onye Ajụjụ nke Ụwa Ka Na-echeta Ruo Taa

● Olee ihe ị ga-achọ ka e jiri na-echeta gị? Olee ihe i chere ga na-agbata ndị mmadụ n’obi ma ha cheta gị? E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ka aha ha na-ede ude. Ọ bụ ya mere mgbe ha nọ ndụ, uche ha niile bụ ka ha bụrụ ọkà n’ihe gbasara sayensị, ọchịchị, egwuregwu ma ọ bụkwanụ nkà. Ma, olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na ihe a ga-eji na-echeta gị bụ ajụjụ ndị ị jụrụ?

Na narị afọ ise gara aga, e nwere otu chiif bi n’ebe dị nso n’Amerịka. Aha ya bụ Nicarao. Ọ bụ onye Nikaragua. A sị na ọ bụ n’aha ya ka e si nweta aha agbụrụ o si, aha obodo ya, na aha otu nnukwu mmiri dị n’obodo ha. Nwoke a jụrụ ọtụtụ ajụjụ mmadụ kwesịrị ichebara echiche taa.

Ndị agbụrụ nwoke a bi n’agbata mmiri abụọ. Otu bụ oké osimiri dị nso n’obodo ha, nke ọzọ abụrụ mmiri ahụ dị n’obodo ha. N’afọ 1523, e nwere otu ọchịagha chị ndị agha ya bịa obodo a. Aha ọchịagha ahụ bụ Gil González Dávila. Ya na ndị agha ya si Spen gaa ebe a na-akpọ Kọsta Rika ugbu a, sizie ebe ahụ bata obodo a. Tupu ha abịa, otu nwoke onye Spen bịara chọpụta obodo a. Aha nwoke ahụ bụ Columbus. Ọ bụ ya chọpụtakwara obodo Amerịka niile.

Chegodị echiche ụdị ụjọ ga na-atụ ọchịagha ahụ na ndị agha ya mgbe ha na-abata n’obodo a ha na-amaghị. Ma, ọ ga-abụ na obi mechara tọọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha na chiif Nicarao hụrụ n’ihi na ndị obodo a nabatara ha nke ọma, nyekwa ha onyinye. Otu n’ime ihe ndị ha nyere ha bụ nnukwute ọlaedo. Ruokwa taa, e ji ile ọbịa mara ndị obodo a.

O nwere ọtụtụ ajụjụ Nicarao nọ na-achọ onye ga-aza ya kemgbe. Mgbe ọchịagha ahụ na ndị agha ya bịara, ọ jụrụ ya ajụjụ ndị ahụ. O nwekwara ndị nke ọ jụrụ ya, ndị na-abụghị ndị nke ahụ o bubu n’obi. Ndị akụkọ kwuru na ọ jụrụ ọchịagha ahụ sị:

Ị̀ nụtụla na e nwere mgbe iju mmiri bibiri ma mmadụ ma anụmanụ nọ n’ụwa a? Chineke ọ̀ ga-eji mmiri mebie ụwa ọzọ? Mmadụ nwụọ, olee ebe ọ̀ na-aga? Anyanwụ, ọnwa na kpakpando hà kwụ otu ebe ka hà na-agagharị agagharị? Gịnị mere ha anaghị esi n’eluigwe ada? Mmadụ si n’ụwa gawa ebe ha dị, olee mgbe onye ahụ ga-eji eru? Olee ihe ọ ga-abụ ya mee, ha akwụsị inye ụwa ìhè? Olee ebe ifufe si apụta? Gịnị na-eme ka anyị na-enwe oge okpomọkụ na oge oyi? Gịnịkwa mere anyị ji enwe ehihie na abalị? Gịnị mere o ji abụ mgbe ụfọdụ, ehihie dịrị ogologo, abalị adịrị mkpụmkpụ ma ọ bụkwanụ ehihie dịrị mkpụmkpụ, abalị adịrị ogologo?

I lee ajụjụ ndị a Nicarao jụrụ anya nke ọma, ị ga-ahụ na ọ chọrọ ịma otú ihe si na-aga n’ụwa. Ajụjụ ndị ahụ ga-emekwa ka ị mata na o kweere na Chineke dị. Ha gosikwara na ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra taa churu ya ụra. Ajụjụ ahụ Nicarao jụrụ gbasara iju mmiri gosiri na ya na ndị obodo ha ma gbasara iju mmiri ahụ e nwere n’oge Noa.—Jenesis 7:17-19.

Ọ bụ eziokwu na ndị obodo Nicarao na-ekpere arụsị, jirikwa ndị mmadụ na-achụ àjà, akọnuche ya anabataghị ihe ndị ahụ ha na-eme. Ajụjụ ndị ahụ ọ jụrụ ọchịagha ahụ gosiri na ndị mmadụ nwere akọnuche na-agwa ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee, sị: ‘Akọnuche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.’—Ndị Rom 2:14, 15.

Ị gaa Nikaragua taa, ị ga-ahụ ebe a kpụrụ Chiif Nicarao. A sị na ọ bụ n’akụkụ ebe ahụ ka ya na ndị Spen nọ hụ mgbe ha bịara obodo ha. Otú o si chebara ihe ndị ọ na-ahụ echiche ma jụọ ajụjụ gbasara ha na-akụziri anyị na ọ dị mma ịjụ ajụjụ iji mata ihe ndị na-edoghị anyị anya.—Ndị Rom 1:20.

[Map dị na peeji nke 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Nikaragua

EBE NDỊDA AMERỊKA

OKÉ OSIMIRI ATLANTIK