Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1. Lezie Anya Mgbe Ị Na-azụ Ihe

1. Lezie Anya Mgbe Ị Na-azụ Ihe

1. Lezie Anya Mgbe Ị Na-azụ Ihe

Ị̀ BỤ onye ọrụ ugbo? Ọ bụrụ na ị bụghị, ọ pụtara na ị na-azụ ọtụtụ ihe ị na-eri n’ahịa. Ị gaa ahịa, gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịzụ ihe ndị ga-akpatara gị ọrịa?

Mara oge i kwesịrị ịzụ ihe ụfọdụ.

Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri n’Ọstrelia kwuru, sị: “Buru ụzọ zụọ ihe ndị na-agaghị emebi ngwa ngwa ma ọ bụ ihe ndị a gbara ná mkpọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ihe ndị e tinyere na friji, zụọ ha mgbe ị zụchara ihe ndị ọzọ chọwa ịla.” Ị chọọ ịzụ nri e siri esi, zụrụ nke dị ọkụ ma ị lawa.

Gbalịa na-azụ ihe mgbe ọ ka dị ezigbo mma.

Mgbe ọ bụla ị gara ahịa, jisie ike hụ na ị zụrụ ihe ndị ka dị ezigbo mma. * Otu nwaanyị onye Naịjirịa aha ya bụ Ruth kwuru, sị: “M na-agakarị ahịa n’isi ụtụtụ mgbe ndị ọrụ ubi ka si n’ubi ha bupụta ihe m chọrọ ịzụ.” Nwaanyị Meksiko aha ya bụ Elizabeth kwukwara, sị: “M gaa ahịa, m na-ahọrọ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị ka dị ezigbo mma. M na-azụkwa anụ ndị e gburu ụbọchị ahụ. E nwee ihe ndị m zụrụ m na-agaghị esi ụbọchị ahụ, mụ etinye ha na friji.”

Leruo ihe ị chọrọ ịzụ anya.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a m chọrọ ịzụ ò mebiwela? Anụ a m chọrọ ịzụ ò siwela ísì?’ Ọ bụrụ na a fụchiri ihe ahụ ị chọrọ ịzụ afụchi, leruo anya n’ihe e ji fụchie ya. Ọ bụrụ na ihe e ji fụchie ya dọkara adọka, nje nwere ike isi ebe ahụ ọ dọkara banye ya.

Otu nwoke onye Họng Kọng aha ya bụ Chung Fai kwuru na ya gaa ịzụrụ nri a gbara ná mkpọ, na ya na-ebukarị ụzọ ele ebe e dere mgbe ọ ga-emebi. Gịnị mere nwoke a ji eme otú a? Ndị ọkachamara n’ihe gbasara nri kwuru na nri a gbara ná mkpọ gafehaala mgbe a sị na ọ ga-emebi, o nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. Ya sọkwa ya ya bụrụ na o siwebeghị ísì, ụtọ ya emebibeghị ma ọ bụkwanụ na ọ ka dị mma n’anya, mmadụ ekwesịghị iri ya.

Etinyela ihe niile ị zụrụ n’otu akpa.

Mgbe ọ bụla ị lọtara ahịa, jiri mmiri ọkụ na ncha saa akpa i ji zụọ ihe. Etinyela anụ na azụ̀ friji n’akpa i tinyere ihe ndị ọzọ ị zụrụ, ka nje dị na ha ghara ịbanye n’ihe ndị ọzọ ị zụrụ.

E nwere otu nwoke onye Ịtali aha ya bụ Enrico. Ya na nwunye ya na-aga ahịa dị ha nso. Ha kwuru na ihe mere ha ji azụ ihe n’ahịa ahụ bụ ka ha laruo ngwa ngwa, ka ihe ha zụrụ ghara imebinahụ ha n’ụzọ. Ọ bụrụ na ọ ga-ewe gị ihe karịrị nkeji iri atọ tupu gị alaruo, tinye ihe dị ka anụ na azụ̀ friji ị zụrụ n’ihe ga-eme ka ha ghara ikporo ọkụ.

N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ekwu ihe ị ga-eme ma ị lọta ahịa, ka ihe ị zụrụ ghara ịkpatara ndị ga-eri ya ọrịa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Gụọ Teta! Eprel–Jun 2011, peeji nke 4. Isiokwu ya bụ, “Na-elebara Ihe Ị Na-eri Anya.”

[Igbe dị na peeji nke 4]

IHE Ị GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ: Otu nwaanyị onye Naịjirịa aha ya bụ Ruth kwuru, sị: “Ụmụ m chọọ ịga zụọ ihe, m na-agwa ha ka ha buru ụzọ lee ebe e dere mgbe ọ ga-emebi.”