Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

4. Erila Nri N’ebe Ọ Bụla Ị Hụrụ

4. Erila Nri N’ebe Ọ Bụla Ị Hụrụ

4. Erila Nri N’ebe Ọ Bụla Ị Hụrụ

O nwere otu nwoke onye Amerịka aha ya bụ Jeff. Ọ dị afọ iri atọ na asatọ, ahụ́ gbasikwara ya ike. Ma, otu ụbọchị, ya na ndị ezinụlọ ya gara n’otu ụlọ nri dị n’obodo ha gaa rie nri. Mgbe otu ọnwa gachara, ịba ọcha n’anya gburu ya. E mechara chọpụta na ihe kpataara ya ọrịa ahụ bụ otu ihe e ji sie nri ahụ ha riri.

N’OTU obodo ndị ọcha, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara ndị bi n’obodo ahụ na-aga eri nri n’ụlọ nri. Ma, a chọpụtara na ọ bụ n’ụlọ nri ka ndị obodo ahụ na-akacha erite ọrịa.

Ị ma na ị gaa iri nri n’ụlọ nri, ọ bụghị gị zụrụ ihe e ji sie ya, ọ bụghị gị siri ya ma ya fọdụkwa ihicha ebe a nọ sie ya. Ma, ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ụdị ebe ị ga-eri nri, ụdị nri ị ga-eri, na ihe ị ga-eji buru ihe i rifọrọ ma ị lawa.

Chọpụta ma ebe ahụ ọ̀ dị ọcha.

Otu onye Brazil aha ya bụ́ Daiane kwuru, sị: “Mụ na ezinụlọ m gaa iri nri n’ụlọ nri ọ bụla, m na-ebu ụzọ lee otú tebụl ebe ahụ dị. M na-elekwa ma ákwà tebụl ha, efere ha, ngaji ha na fọk ha hà dị ọcha. Ihe ọzọ m na-ele bụ ndị na-ebutere ndị mmadụ nri. Ọ bụrụ na ha adịghị ọcha, anyị apụọ gawa ebe ọzọ.” Ná mba ụfọdụ, a na-enwe ndị ọrụ gọọmenti ndị na-aga ele otú ebe ndị a na-esiri ọhaneze nri dị. Ha mechaa, ha edepụta ihe ndị ha chọpụtara, mapawa ya ebe ọhaneze ga na-ahụ ya.

Kpachara anya ma ị chọọ iwere nri i rifọrọ laa.

Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ n’Amerịka kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-anọfe awa abụọ tupu ị laruo, ejila nri i rifọrọ ala.” Ọ bụrụ na i ji ya ala, lawa ozugbo. Ị laruo, tinye ya na friji.

I mee ihe anọ a anyị kwuru okwu ha na magazin a, ị gaghị na-erite ọrịa ná nri.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

IHE Ị GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ: Otu nwaanyị onye Filipinz aha ya bụ Noemi kwuru, sị: “Anyị na-agwa ụmụ anyị ka ha ghara iri ihe ga-ebutere ha ọrịa.”