Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụla M Ndị Hụrụ M n’Anya n’Eziokwu, Obi Eruokwala M Ala

Ahụla M Ndị Hụrụ M n’Anya n’Eziokwu, Obi Eruokwala M Ala

Ahụla M Ndị Hụrụ M n’Anya n’Eziokwu, Obi Eruokwala M Ala

Akụkọ Egidio ahakbria kọrọ

Mgbe m dị obere, o nweghị onye hụrụ m n’anya, o nweghịkwa onye lekọtara m. Ma, ugbu a, e nwere ndị hụrụ m n’anya, obi eruokwala m ala. Olee otú ihe si gbanwee? Ngwa, ka m kọọrọ gị ihe merenụ.

A MỤRỤ m n’afọ 1976 n’otu obodo a na-akpọ Ist Timọ. Obodo a dị n’elu ugwu. N’oge ahụ, ọ bụ Indonisha na-achị obodo anyị. Papa m na mama m bụ ogbenye ọnụ ntụ. Ha mụrụ ụmụ iri. Abụ m nwa ha nke asatọ. Papa m na mama m anaghị akpatali ihe na-ezuru anyị niile. N’ihi ya, ha kpọgaara m nwa nwanne papa m ka mụ na ya biri ma hapụ ejima m n’ụlọ.

Indonisha bidoro ịchị obodo anyị na Disemba afọ 1975. Nke a mere ka ndị obodo anyị malite ịgba ọchịchị ha mgba okpuru. Ha megidere ihe a ruo ihe karịrị afọ iri abụọ. Esi m na nwata tawa ahụhụ, ihe m na-ahụkwa ebe niile bụ tigbuo zọgbuo. Echetara m otú ndị soja si bịa n’obodo anyị na-egbusi ndị mmadụ, onye ọ bụla achọrọ ụzọ. Mụ na nwa nwanne papa m na ọtụtụ ndị obodo anyị agbaga n’ugwu.

Ma, ọ dịghị anya ndị soja amata ebe ahụ anyị gbagara, bido tụwa bọmbụ ebe ahụ aghara aghara. Anaghị m echefu ụdị ọnwụ ike ndị mmadụ nwụrụ n’oge ahụ na otú e si mebisie ihe ha. Ihe ndị a niile mere ka m chịrị obi n’aka mgbe anyị mechara lọghachi n’obodo anyị. E nwere ọtụtụ ndị agbata obi anyị e gburu, nwee ndị nke ọ na-enweghị onye ma otú ha si gaa ruo taa. Ụjọ nọzi na-atụ m na ihe ahụ mere ha nwekwara ike mee m.

Mgbe m dị afọ iri, nwa nwanne papa m ahụ bidoro ịrịa ọrịa, mechaa nwụọ, papa m na mama m akpọgazie m na nke nne nne m. Papa ukwu m anọghị ndụ mgbe ahụ, ya emee obi anaghị adị nne nne m mma. Ị hụ otú o si ezi m ozi, ị ga-eche ma m̀ bụ ohu, ọ naghịkwa achọ iji anya ahụ m. E nwere ụbọchị ahụ́ na-adịghị m, nwaanyị a akụọ m ihe tinka kụrụ pan, tọgbọ m na-eche ka m nwụọ. Ihe ọma meere m ụbọchị ahụ bụ na nwa nwanne mama m bịara kpọrọ m ka mụ na ya biri.

Ebidoro m ịga akwụkwọ mgbe m dị afọ iri na abụọ. Ọ dịghị anya nwunye nwa nwanne mama m ahụ arịawa ọrịa. Ọrịa nwunye ya rịawara mere ka ike ụwa gwụ ya. Esi m n’ụlọ ahụ gbapụ n’ihi otú ihe si dịrị ha n’oge ahụ, sorozie ndị soja Indonisha biri n’ọhịa. M na-asara ha ákwà, na-esiri ha nri, na-edewekwara ha ebe ha bi ọcha. Obi ruru m ala ebe ahụ n’ihi na ha na-elezi m anya. Ma, ọnwa ole na ole m nọrọ ebe ahụ, ndị ebe anyị amata ebe m nọ, bịa gwa ndị soja ahụ ka ha kpọlata m.

Ịgba Ọchịchị Mgba Okpuru

Mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, abanyere m mahadum dị n’isi obodo anyị bụ́ Dili. N’ebe ahụ, ahụrụ m ọtụtụ ndị na-eto eto ụwa mụ na ha bụ otu. Anyị kpebiri na anyị ga na-agba ọchịchị mgba okpuru, ka ndị Indonisha nwee ike hapụ anyị ka anyị chịwa onwe anyị. Ụmụ akwụkwọ anyị gara ngagharị iwe ọtụtụ ugboro. Nke a kpatakwara ọgba aghara ọtụtụ mgbe n’obodo ahụ. E gburu ụfọdụ ndị enyi m, ọtụtụ emerụọkwa ahụ́.

N’afọ 2002, obodo anyị nweere onwe ya. Ma, ebe niile ka ghịghara aghịgha. E gbuola ọtụtụ ndị, ọtụtụ ndị agbaakwa ọsọ ndụ. Echeburu m na ihe ga-adịwazi mma, ma, otu abụghị n’ezi. Ọgba aghara ekweghị akwụsị, ọrụ adịghị, ọtụtụ ndị dakwara ogbenye.

Otú M Si Gbanwee Okpukpe M Na-ekpebu

N’oge ahụ, ọ bụ mụ na ụfọdụ ndị ikwu anyị bi. Aha otu n’ime ha bụ Andre. Ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ma, mụnwa na-ekpe Katọlik, obi adịghịkwa m mma na Andre na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Ma, achọrọ m ịma ihe dị na Baịbụl, mgbe ụfọdụkwa, m na-agụ Baịbụl Andre ma ọ pụọ. Ihe ndị m gụtara mere ka m chọọ ịmụwa Baịbụl.

N’afọ 2004, Andre nyere m akwụkwọ e ji na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ekwetara m ịga, ma, elerughị m anya n’ebe e dere oge a ga-eji amalite ya. N’ihi ya, m gara ebe ahụ nọọ awa abụọ tupu ndị mmadụ abịawa. Mgbe Ndịàmà Jehova rutere, ha bịara na-ekwe m n’aka, ma ndị obodo anyị ma ndị si mba ọzọ. Otú ha si nabata m mere ka ahụ́ ruo m ala, obi atọọkwa m ụtọ. M dere amaokwu Baịbụl niile a gụrụ n’ụbọchị ahụ n’akwụkwọ. Mgbe m laruru gụọ ha na Baịbụl Katọlik m nwere, mụ achọpụta na ihe niile e kwuru n’ụbọchị ahụ bụ eziokwu.

N’izu sochiri izu ahụ, agara m Mas na chọọchị anyị. Ma, abịaghị m n’oge, e nwekwara ụfọdụ ndị mụ na ha bịara otu mgbe. Ka anyị na-abata, ụkọchukwu anyị weere ụtarị chụpụ anyị. Anyị nọzi n’èzí chọọchị agbasaa. Tupu chọọchị agbasaa, ụkọchukwu gwara ndị bịara chọọchị, sị: “Ka udo nke onyenwe anyị dịnyere unu.” Otu nwaanyị katara obi asị ya: “Udo ọ̀ ga-adị mgbe ị chụpụrụ ndị bịara chọọchị?” Ụkọchukwu ahụ atụpụrụghị ya ọnụ. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka m kwụsịrị ịga chọọchị.

Mgbe m kwụsịrị ịga chọọchị, mụ na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl, mụ esoro Andre na-aga ọmụmụ ihe ha. Amaghị m onye gara gwa ndị ebe anyị, ha ebido inye anyị nsogbu. Nne nne Andre gwadịrị anyị na ya ga-eli anyị ná ndụ ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị iso Ndịàmà Jehova. Ma, ihe a o kwuru emeghị ka anyị kwụsị, kama, o mere ka obi sikwuo anyị ike.

Otú M Si Gbanwee Àgwà Ọjọọ M

Anaghị m eme ebere, mmadụ mehaala m ihe, mụ emegwara. O nweghị onye m tụkwasịrị obi. Ma, Baịbụl m na-amụ mere ka m mata ihe bụ́ ịhụnanya, Ndịàmà Jehova nyekwaara m ezigbo aka. Mgbe m dara ọrịa, ndị ebe anyị abịaghị leta m. Ma, Ndịàmà Jehova bịara leta m, nyekwara m aka. Ịhụnanya ha abụghị “n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.”—1 Jọn 3:18.

Ọ na-abụ ndị mmadụ hụ m, ụjọ abịa ha. Ma, ihe banyere m metụrụ Ndịàmà Jehova n’obi, ha egosikwa m “ịhụnanya ụmụnna.” (1 Pita 3:8) Kemgbe a mụrụ m, ọ bụ ugbu a ka m hụrụ ndị hụrụ m n’anya. Eji m nwayọọ nwayọọ na-agbanwe, bidokwa ịhụ Chineke na mmadụ ibe m n’anya. Na Disemba afọ 2004, m nyefere Chineke onwe m, e meekwa m baptizim. E mechakwara mee Andre baptizim.

Otú Chineke Si Gọzie M n’Oge E Nwere Ọgba Aghara

Mgbe e mechara m baptizim, m chọrọ otú m ga-esi enyere ndị a na-emegbu emegbu aka. N’ihi ya, ebidoro m ikwusa ozi ọma oge niile. Izi ndị mmadụ ozi ọma dị na Baịbụl ka ime ngagharị iwe mma okpukpu iri. Otú a ka m sizi bido inyere ndị mmadụ aka.

N’afọ 2006, ọgba aghara malitere ọzọ n’obodo anyị. N’ihi esemokwu dị n’obodo anyị kemgbe, agha dara na Dili. Nke a mere ka ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo anyị bịa biri na Dili gbalaa. Mụ na Ndịàmà Jehova ndị ọzọ gbagara Bọkọ. Obodo a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Dili. Ọ dị otu narị kilomita na iri abụọ ma e si Dili gawa ya. Ọsọ ndụ anyị gbagara n’ebe ahụ rụpụtara ihe ọma. A bịara nwee ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Ọgbakọ a bụ nke mbụ e nwere n’obodo ọzọ na-abụghị Dili.

Mgbe afọ atọ gara, ya bụ n’afọ 2009, a kpọrọ m ka m gaa otu ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile na-aga. Ebe anyị gara ya bụ na Jakata dị n’Indonisha. Ndịàmà Jehova bi ebe ahụ nabatara m ka nwanne ha. Otú ha si mesoo m gosiri na ha hụrụ m n’anya. Ọ bịara doo m anya na anyị bụ otu ezinụlọ, ndị Baịbụl kpọrọ “òtù ụmụnna.” Ịgwa gị eziokwu, ha lekọtara m nke ọma.—1 Pita 2:17.

Ahụ́ Emechaala Ruo M Ala

Mgbe m si ụlọ akwụkwọ ahụ lọta, alaghachiri m Bọkọ. M ka bi ebe ahụ. Obi na-atọ m ụtọ inyere ndị mmadụ aka ka ha na Chineke dịrị ná mma otú ahụ e nyeere mụnwa. Dị ka ihe atụ, n’otu ime obodo dị n’ebe a m bi, mụ na ụfọdụ ụmụnna anyị gara kụziere mmadụ iri abụọ Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ha akaala nká, ha amaghịkwa akwụkwọ. Ha niile na-eso anyị abịa ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla. Atọ n’ime ha aghọọla Ndịàmà Jehova, e meekwa ha baptizim.

Ọtụtụ afọ gara aga, e nwere otu nwa agbọghọ obi ruru ala mụ na ya matara. Aha ya bụ Felizarda. Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl, e mechaakwa mee ya baptizim. Anyị lụrụ n’afọ 2011. Ihe ọzọ na-eme m obi ụtọ bụ na Andre nwanne m na-arụzi ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova e nwere n’Ist Timọ. Ọtụtụ ndị ebe anyị anaghịzi enye m nsogbu. Nne nne Andre, onye kwuburu na ya ga-eli mụ na Andre ná ndụ, anaghịzi enye anyị nsogbu.

Mgbe mbụ, iwe na-ejukarị m obi. O nweghị onye hụrụ m n’anya, echeghịkwa m na e nwere onye ga-emekata hụ m n’anya. Ma ugbu a, Jehova enyerela m aka mụ ahụ ndị hụrụ m n’anya n’eziokwu. Obi eruokwala m ala.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ihe a bụ mgbe m naara agba ọchịchị mgba okpuru

[Foto dị na peeji nke 26]

Ihe a bụ foto mụ na nwunye m na ọgbakọ e nwere na Bọkọ sere