Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Papa M na Mama M Agaghị Ahapụtụ M Aka?

Gịnị Mere Papa M na Mama M Agaghị Ahapụtụ M Aka?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Mere Papa M na Mama M Agaghị Ahapụtụ M Aka?

LEGODỊ IHE ATỤ A.

E nwere otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Jim. N’ihe dị ka elekere anọ n’otu mgbede Fraịdee, o jikeere chọwa ịpụ. Mgbe o mepere ụzọ ka ọ pụọ, ya asị papa ya na mama ya: “Ka m gaa bịa.” O chere na ha agaghị ajụ ya mgbe ọ ga-eji alọta.

Ma nke a abụghị nke mbụ ha na-ajụ ya ụdị ajụjụ ahụ.

Ka ọ kpụ okwu n’ọnụ, mama ya jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ị ga-eji alọta?”

Jim akwụrụ n’ọnụ ụzọ, si mama ya: “Em . . . em . . .  Amaghị m. Ihe ga-eme bụ, unu chọọ ịlakpu, gbachienụ ụzọ unu.” Ka o kwuchara mee ka ọ na-apụ, papa ya asị ya: “Bịa ebe a!”

Jim akwụrụ ebe ahụ, nụzie ka papa ya na-asị ya: “Burukwa n’obi na ị gaghị anọ n’èzí ya agafee elekere asatọ. Ụka a kpara akpa, e ji isi ekwe ya.”

Jim atụgharịa sị papa ya: “Ha! Papa! Ị̀ makwa na ọ na-emecha ihere ịnọkata sị ndị enyi m na mụ alawala naanị ka m hụkwa na m lọtara ebe a tupu elekere asatọ agafee?”

Ihe ahụ o kwuru agbasaghịdị papa ya. Kama, ya agwa ya ọzọ sị: “Ihe m ma bụ, anọla n’èzí elekere asatọ agafee.”

Ò NWETỤLA ụbọchị papa gị ma ọ bụ mama gị gwara gị ụdị ihe a? Ọ̀ gwara gị mgbe ị ga-eji alọta, sị na ya ekwuchaala? Ka ọ̀ gwara gị ụdị egwú ị ga na-ege, ụdị ndị gị na ha ga-abụ enyi, ma ọ bụkwanụ ụdị efe ị ga na-eyi? E nwere ndị na-eto eto ibe gị papa ha ma ọ bụ mama ha metụrụla ụdị ihe ahụ. Legodị ihe ha kwuru:

“Di mama m na-atụchakarị egwú ọ bụla m na-ege. O megidere ihe a, mụ etufusie egwú m niile.”—Onyebuchi. *

“Mama m na-abara m mba na mụ enweghị enyi. Ma, mgbe ọ bụla m gwara ya onye m chọrọ imete enyi, ya ajụ, sị na ya amaghị onye ahụ. Ihe a ọ na-eme na-agwụ m ike.”—Chiemezie.

“Papa m na nwunye ya anaghị ekwe ka m yiri efe, ọ gwụkwala ma ọ̀ dị owoghoro. N’anya papa m, efe ọ bụla na-erughị m n’ikpere agbadaghị agbada.”—Ulumma.

Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-esere gị na papa gị na mama gị okwu, olee ihe i nwere ike ime? Ùnu nwere ike nọdụ ala kwurịta ya? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Akudo kwuru, sị: “Ụdị ihe a sewere mụ na papa m na mama m okwu, ha anaghị achọ ka mụ na ha kwurịta ya.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ise, aha ya bụ Uzoma, sịrị: “Ya dị m ka papa m na mama m achọghị ịma ihe m chere, mụ emechiere ụwa m ọnụ.”

Ejila ike ekwubi na ha agaghị ege gị ntị. Ị gbalịa gakwuru ha, ha nwere ike gee gị ntị.

Echefula na Chineke na-ege ndị mmadụ ntị ma ha gwawa ya otú ọ dị ha n’obi. Dị ka ihe atụ, Jehova gere Mozis ntị mgbe ọ rịọrọ ya ka ọ gbaghara ụmụ Izrel mmehie ha.—Ọpụpụ 32:7-14; Diuterọnọmi 9:14, 19.

I nwere ike ịsị na otú papa gị na mama gị si eche echiche abụghịnụ otú Chineke si eche echiche. Anyị makwa na ihe Mozis gwara Jehova na ihe ị ga-achọ ịgwa papa gị na mama gị abụghị otu ihe. Nke Mozis bụ gbasara ndụ ụmụ Izrel niile, ma, nke gị nwere ike bụrụ gbasara oge ị ga-eji na-alọta. N’agbanyeghị ya, ihe i kwesịrị ịma bụ:

Ọ bụrụhaala na o nwere ihe dị ezigbo mkpa ị chọrọ ịgwa onye ka gị, onye ahụ nwere ike gee gị ntị. Ị manụ na papa gị na mama gị ka gị.

Ihe ga-enye aka eme ka ha gee gị ntị bụ otú i si gwa ha ya. Ihe ndị anyị ga-agwa gị mee ugbu a ga-enyere gị aka ịma otú ka mma ị ga-esi agwa ha ya:

1. Gịnị na-ese? N’okpuru ebe a, dee ihe ahụ na-esere gị na papa gị na mama gị.

․․․․․

2. Olee otú obi dị gị? Dee otú ihe papa gị na mama gị kwuru n’okwu ahụ dị gị n’obi. Ò were gị iwe? Ò yiri gị ka hà na-enyo gị enyo ka ọ̀ dị gị ka hà na-eleda gị anya? (Dị ka ihe atụ: N’akụkọ ahụ a kọrọ ná mbido, Jim sị na ọ ga-eme ya ihere ịnọkata bilie sị ndị enyi ya na ya alawala naanị ka ọ hụkwa na ya lọtara mgbe a sị ya lọta.)

․․․․․

3. Were ya na ị bụ papa ma ọ bụ mama. Weregodị na ihe ahụ i kwuru n’ajụjụ nke mbụ bụ ihe na-esere gị na nwa gị na-eto eto. Olee ihe nwere ike ịbụ ụjọ gị nke ga-eme ka ị sị nwa gị emela ihe ahụ? Dee ya n’okpuru ebe a. (Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na papa Jim na mama ya achọghị ka ihe ọ bụla mee ya, ọ bụ ya mere ha ji sie ọnwụ ka ọ lọta mgbe ahụ ha gwara ya.)

․․․․․

4. Lerukwuo anya n’ihe ahụ na-esenụ. Gbalịa zaa ajụjụ ndị a na-esonụ:

Ò nwere ezigbo ihe ị chọpụtara mere papa gị na mama gị ji gwa gị ihe ha gwara gị?

․․․․․

Gịnị ka i chere ị ga-eme ka obi nwee ike iru ha ala?

․․․․․

5. Gị na ha kwurịta nsogbu ahụ, kwuokwanụ ihe ga-ebi ya. Gbalịa mee ihe anọ ahụ anyị kwuru, gụọkwa ihe e kwuru n’igbe e dere “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka.” I mee otú ahụ, ị ga-ahụ na otú gị na papa gị na mama gị ga-esi ekwurịta ihe na-esere unu ga-adị ka ebe dimkpa na dimkpa na-akpa nkata. Ọ bụ ihe a ka nwa agbọghọ aha ya bụ Chetachi mere. Kemgbe ahụ, ya na papa ya na mama ya na-ekwurịtazi ihe na-esere ha n’enweghị nsogbu. Chetachi kwuru, sị: “Ọ baghị uru gị na papa gị na mama gị ịnọ na-azọ onye okwu ga-ebi n’ọnụ ya n’ihi na o mekataghị ka o bie n’ọnụ gị. Ihe m na-eme bụ iwepụta oge ka mụ na ha nọrọ kpaa ihe ahụ na-ese. Anyị kpawa ya, a ga-enwerịrị ebe anyị ga-ekwuru ya, okwu ahụ adaba, obi adị onye ọ bụla ụtọ.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe dị na peeji nke 19]

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

“Ọ ka mma ige ntị n’ihe papa gị na mama gị na-ekwu kama ịbawa mba. Ọ bụrụ na ị na-ege ha ntị ma ha na-agwa gị okwu, hanwa ga na-egekwa gị ntị ma ị na-agwa ha okwu.”​—Nwanneka.

Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.

“Asala papa gị na mama gị okwu. Mgbe mbụ, m na-asa papa m na mama m okwu, riekwanụ ihe ya na ya so ala. Ma, emechara m chọpụta na mụ na ha agaraghị na-enwe nsogbu anyị na-enwe ma a sị na m kwara ire m nga.”—Chinenye.

Gụọ Ilu 17:27; 21:23.

“Chere ka ihe jụọ oyi tupu i kwuwe otú obi dị gị n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka papa gị na mama gị ga-aka ege gị ntị.”—Ngozi.

Gụọ Ilu 25:11.

“Papa gị na mama gị chọrọ ịma ma ị̀ na-erubekwara ha isi. Ha chọkwara ịma ma ị̀ na-ege ntị n’ihe ha na-agwa gị. N’ihi ya, tupu ị gwawa ha ihe i chere n’okwu ahụ, mee ka ha ghọta nke ọma na ị nụrụ ihe ha kwuru nakwa na ị ghọtara ihe ha chọrọ ka ị na-eme.”—Ndidi.

Gụọ Ilu 23:22; Jems 1:19.

[Igbe dị na peeji nke 19]

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ọ bụghị ihe niile seere gị na papa gị na mama gị ka unu ga-abịa nọrọ ọdụ kwuwe. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike mee ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 4:4, bụ́ ebe sị: ‘Kwuo ihe ị chọrọ ikwu n’ime obi gị, ma gba nkịtị.’ Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugomma kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m cheta na o nweghị oké ihe dị n’ihe ahụ, mụ ahapụ ya ka ọ dịwa.”

[Igbe dị na peeji nke 20]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

I nwere ike jụọ papa gị na mama gị sị: “Mgbe unu hà ka m, olee otú unu na papa unu na mama unu si edozi ihe na-esere unu? Ya bụrụ ugbu a, ọ̀ bụ otú unu si dozie ya mgbe ahụ ka unu ga-esi edozi ya?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Wyndia—M na-agbalị ibu ụzọ chee echiche tupu mụ ekwuo okwu. Papa m na mama m kwuo ihe, mụ echebara ya echiche, kpeekwa ekpere gbasara ya, tupu mụ ekwuwe ihe ọ bụla. M chọpụta na ihe m chọrọ ikwu ga-apụ ụka, mụ emechie ọnụ. E mechazie mụ ekwuo ya otú ọ na-agaghị apụ ụka.

Ross—Ihe na-enweghị ihe ọ bụ wewe m iwe, m na-agbalị ijide onwe m ghara ịga sewe okwu n’enweghị isi na ọdụ. Otú a m si eme mere ka m ghara ịna-ewekarị iwe otú m naara ewe.

Ramona—Achọpụtara m na ọ kacha mma ibu ụzọ gee ntị n’ihe papa m na mama m na-agwa m. O nwere ike, ihe ha na-ekwu adịchaghị iche n’ihe mụnwa na-ekwu, ọ bụghịkwa ihe ga-esewere mụ na ha okwu.