Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?—Nkebi nke Mbụ

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?—Nkebi nke Mbụ

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?​—Nkebi nke Mbụ

Ò NWERE ONYE GBATARA GỊ N’OBI MGBE Ị HỤRỤ AJỤJỤ A DỊ N’ELU?

EE MBA

↓ ↓

YA BỤRỤ OTÚ AHỤ, Ị KA NWERE IKE ỊGỤ ISIOKWU A.

GỤỌ ISIOKWU A OZUGBO, Ọ GA-ENYERE GỊ AKA KA ADỊM

Ọ GA-ABARA GỊ EZIGBO URU. NÁ MMA GỊ NA ỤMỤ NWOKE

GHARA ỊBANYE N’IHE ỌZỌ.

Kanye ✔ n’eziokwu ma ọ bụkwanụ n’ụgha n’ihe a e kwuru n’okpuru ebe a:

Mmadụ ekwesịghị inwe ihe ga-ejikọ ya na onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ruo mgbe onye ahụ dị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị.

․․․․․ EZIOKWU ․․․․․ ỤGHA

Ị̀ ma na o nwere ụmụ nwaanyị ndị ha na Jizọs dị ná mma n’agbanyeghị na o bughị n’obi ịlụ nwaanyị? (Matiu 12:46-50; Luk 8:1-3) O nwekwara ike ịbụ na o nwere ndị nke ha na Timoti dị ná mma. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji gwa ya, sị: “Na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne gị ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.”—1 Timoti 5:1, 2.

Pọl ma na Timoti ga-aga inyere ọgbakọ dị iche iche aka, marakwa na ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ agbọghọ n’ebe ndị ahụ. (Mak 10:29, 30) Ọ̀ pụtara na o nweghị ihe ga-ejikọ ya na ụmụ agbọghọ ndị ahụ? Mba. Ma, ebe ọ bụ na o bughị n’obi ịlụ nwaanyị n’oge ahụ, ọ ga-akpachara anya n’otú ya na ha si eme ka ọ ghara ime ka onye ọ bụla n’ime ha chewe na ọ chọrọ ịlụ ya ma ọ bụkwanụ mee ihe ga-agbawa onye ahụ obi.—Luk 6:31.

Gịnwakwanụ? Ị̀ chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị?

Ọ bụrụ na ị sị EE, gị na ndị na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ịkpa nwere ike inyere gị aka ịchọta onye ị ga-alụ.—Ilu 18:22; 31:10.

Ọ bụrụkwanụ na ị sị MBA, ọ pụtara na ị ga-akpacharanụ anya n’otú gị na ha si akpa. (Jeremaya 17:9) Ma, ịkpachara anya anaghị adịcha mfe. Ọ bụ ya mere nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Njideka * ji sị: “Ọ dịghị mfe nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa ịbụ enyi nkịtị. Ma ha akpachaghị anya, ha nwere ike si n’ikute anwụrụ banye ime ahịa.”

Gịnị mere o ji dị mma ka ị kpachara anya? Ọ bụ maka na i nwere ike mewaa mmadụ obi ma ọ bụkwanụ e mewaa gịnwa obi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA: Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ịgbawa gị obi ma ọ bụkwanụ gịnwa agbawaa ya obi. Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Nkechi kwuru, sị: “Ụdị ihe a mere m ugboro abụọ. Otu bụ mgbe otu nwa okorobịa riri m obi. Nke ọzọ abụrụ mgbe m riri otu nwa okorobịa obi. Nke m adịrịghị m mfe, nke nwa okorobịa a adịrịghịkwa ya mfe. Ihe a mere m anaghị apụ m apụ n’obi.”

Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

Olee mgbe ọ ga-adị mma ma gị na ndị na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọkọọ? Oleekwa mgbe ọ na-agaghị adị mma?

Gịnị mere ọ dịghị mma ka a na-ahụkarị gị na otu onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị? Gịnị ka onye ahụ nwere ike iche na i bu n’obi? Gịnị ka gịnwa nwere ike ibu n’obi?

Nwa agbọghọ aha ya bụ Adaku kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-aghọ onwe m aghụghọ, na-asị na o nweghị oké ihe jikọrọ mụ na nwa okorobịa. A jụọ m, mụ asị na eweere m ya ka nwanne m. Ma, m hụ ya na nwa agbọghọ ọzọ, iwe abịa m ka à ga-asị na o kwere nkwa ịlụ m.”

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA: Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ime ka gị na ya gharazie ịdị ná mma. Nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Ogechi kwuru, sị: “E nwere otu nwa okorobịa mụ na ya dị ná mma. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ụbọchị niile ka anyị na-eji ekwentị ezigara ibe anyị ozi. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, okwu adagharịa. Otu ụbọchị, ya ezitere m ozi, sị na ya ga-achọ ka mụ na ya lụọ. Ma, mụnwa achọghịkwanụ ịlụ ya. Mgbe m gwara ya na achọghị m ịlụ ya, iwe abịa ya. Ya akwụsịzie ịna-ekwuru m okwu. Otú a ka mụ na ya si kwụsị ịbụ enyi.”

Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

N’akụkọ ahụ Ogechi kọrọ, ònye ka e mewara obi? Gịnị mere e ji mewaa ya obi? Gịnị ka i chere Ogechi na nwa okorobịa ahụ gaara eme ka ihe ahụ merenụ ghara ime?

Mgbe ị na-ezigara mmadụ ozi n’ekwentị, olee ihe i nwere ike ide onye ahụ echewe na ị chọrọ ịlụ ya?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chetachi kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-agbara ụmụ nwoke ọsọ. Ọ bụ eziokwu na gị na ha dịrị ná mma, ha ga-enyere gị ezigbo aka. Ma, achọghị m ime ihe ga-eme ka onye ọ bụla n’ime ha chee na m chọrọ ka ọ lụọ m mgbe m na-achọwabeghị ịlụ di.”

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu14:15.

Ihe anyị na-ekwu bụ: Ọ bụghị ihe ọjọọ ma gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị dịrị ná mma. Ma, ọ bụrụ na ị chọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, i kwesịrị ịkpachara anya n’otú gị na ya si akpa.

NÁ NKEBI NKE ABỤỌ N’ISIOKWU A, ANYỊ GA-ATỤLE . . .

Otú mmadụ nwere ike isi nwee aha ọjọọ ma ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa ya na ya dị ná mma erie ya obi mgbe ọ na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

GỊNỊ KA Ị GAARA EME?

IHE MERE EME: Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chinasa kwuru, sị: “O nwere otu nwa okorobịa mụ na ya dị ná mma. I si ebe anyị bi gawa ebe ha bi, ị ga-agba ihe karịrị otu puku kilomita na narị ise. Ọ na-eji ekwentị ezitere m ozi otu ugbo n’izu ma ọ́ dịghị ihe ọzọ. Ya zitere m, mụ ezigara ya. Ebughị m n’obi ịlụ ya, echeghịkwa m na yanwa bu n’obi ịlụ m. Ma, otu ụbọchị, ihe o dere n’ozi o ziteere m bụ: ‘Ọ̀ dị m n’obi, ndaakwanụ? Agụụ ịhụ gị agụgbuola m.’ Ihe ahụ o dere juru m anya. Mụ agwa ya na eweere m ya naanị ka enyi. Ihe o ziteziiri m bụ: ‘Hapụwazie.’ Kemgbe ahụ, o zitebereghị m ozi ọzọ.”

● Ọ bụrụ na ị chọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, gịnị ka ị ga-eme ma nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa zitere gị ụdị ozi ahụ e ziteere Chinasa?

● Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa, ò nwere ihe ị hụrụ dị njọ n’ozi ahụ e ziteere Chinasa? Ya bụrụ na o nwere, gịnị dị njọ na ya? Ọ bụrụkwanụ na o nweghị, gịnị mere i ji chee na ọ dịghị njọ?

● A sị gị kwuo, olee nke n’ime ụzọ abụọ a ga-akacha eme ka onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị rie gị obi: Ọ̀ bụ i ji ekwentị ezigara ya ozi ka ọ bụ gị na ya ịkpa ihu na ihu? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Gakwuru papa gị na mama gị, jụọ ha ihe ha chere gbasara ajụjụ ndị ahụ dị n’ebe e dere “Ajụjụ Ndị Ị Ga-echebara Echiche.” Ihe ha kwuru ọ̀ dị iche na nke gị? Olee ihe dị iche na ha abụọ? Gịnị mere ihe ha kwuru ji dị mma?—Ilu 11:14.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Joshua—Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-anọkarị, ọ gaghị ara ahụ́ onye ahụ erie gị obi.

Natasha—I buru n’obi na ọ bụ enyi nkịtị ka gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị bụ, ma, naanị gị na ya ana-anọ mgbe niile, i nwere ike iri ya obi ma ọ bụkwanụ ya erie gị obi.

Kelsey—Ọ bụrụgodị na gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị bụ enyi nkịtị ná mmalite, egwú nwere ike dagharịa ma naanị gị na ya na-anọkarị. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwoke na nwaanyị nwere ike ịbụ enyi nkịtị, ma, ha kwesịrị ịkpachara ezigbo anya.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ịkpatara gị nsogbu