Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nri Ị Na-eri Ọ̀ Na-akpatara Gị Ọrịa?

Nri Ị Na-eri Ọ̀ Na-akpatara Gị Ọrịa?

Nri Ị Na-eri Ọ̀ Na-akpatara Gị Ọrịa?

Otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi kwuru na ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ́ ike na Jamanị mechiri otu ụlọ akwụkwọ n’ihi na a chọpụtara na ụmụ akwụkwọ nọ na ya ritere ọrịa ná nri e siiri ha.

N’otu akwụkwọ akụkọ, e kwuru na e nwere ọrịa ndị mmadụ rịara na steeti ise dị n’Amerịka. Ha ritere ọrịa ahụ n’akwụkwọ nri ha riri.

Na Japan, otu akwụkwọ akụkọ kwuru na e nwere ehi isii e gburu, kesaa anụ ha n’obodo itoolu dị ná mba ahụ. Ma, a maghị na ehi ndị ahụ butere ọrịa n’ahịhịa ha tara.

N’AFỌ gara aga, ihe ndị a e dere n’elu gbara n’akụkọ n’ime izu abụọ. Ndị na-achọpụta ihe ndị na-eme n’ụwa kwuru na ná mba ndị mepere emepe, mmadụ atọ n’ime mmadụ iri ọ bụla na-erite ọrịa ná nri kwa afọ.

Olee otú obi na-adị gị ma ị nụ ụdị akụkọ a? Otu nwoke onye Họng Kọng aha ya bụ Hoi kwuru, sị: “Ọ na-ewe m iwe, na-echukwa m ụra. Amụrụ m ụmụ abụọ. M chọọ ịzụrụ ha nri, mkpa m na-abụkarị otú e si mee nri ahụ na ebe e mere ya.”

Ná mba ndị na-emepechaghị emepe, ọrịa ndị a na-erite ná nri na ndị nke a na-aṅụta ná mmiri na-egbu ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ, nke ka nke, ụmụaka. Otu nwaanyị onye Naịjirịa aha ya bụ Bola kwuru, sị: “N’ahịa anyị, ijiji na-ebe ná nri ndị a na-ere ere, mmiri na-ama ha, uzuzu ana-ekpokwa ha. M gụọ akwụkwọ akụkọ gụta ebe a kọrọ gbasara ọrịa a na-erite ná nri ma ọ bụkwanụ nụ ebe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya, ụjọ abịa m. Ana m agba mbọ ka ụmụ m ghara ịrịa ọrịa ndị ahụ.”

Ò nwere ihe mmadụ ga-eme ka nri ya na ezinụlọ ya na-eri ghara ịkpatara ha ọrịa? Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri na Kanada, sịrị: “Ndị mmadụ gaa zụrụ nri n’ahịa rite ọrịa, ụwa niile anụ ya. Ma, ọtụtụ ndị amaghịdị na ihe ha na-eme mgbe ha na-esi nri nwekwara ike ịkpatara ha ọrịa.”

Gịnị ka ị ga-eme ka gị na ezinụlọ gị ghara irite ọrịa ná nri? Na peeji ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ụzọ ihe anọ i nwere ike ime.

[Igbe dị na peeji nke 3]

Ole Ndị Na-eritekarị Ọrịa Ná Nri?

Ndị na-eritekarị ọrịa ná nri bụ:

● Ụmụaka na-erubeghị afọ ise

● Ndị dị ime

● Ndị gaferela afọ iri asaa

● Ndị ahụ́ ha na-anaghị alụso ọrịa ọgụ nke ọma

Ọ bụrụ na gịnwa ma ọ bụ onye ezinụlọ gị so ná ndị a anyị kwuru, unu kwesịrị ilezi anya mgbe unu na-esi nri, mgbe unu na-ekupụta nri, nakwa mgbe unu na-eri nri.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ihe a e kwuru bụ n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nri na Niu Saụt Wels dị n’Ọstrelia.