Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?

Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?

Echiche Baịbụl

Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?

ỌTỤTỤ ndị taa na-eche na ha nweere onwe ha, ma, ha amaghị na ha bụ ndị ohu. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere. E nwekwara ndị nke na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ha na-emefu oké ego, jiri ya na-azụ ihe ha ji achụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, na-eche na ọ bụ ya ga-eme ka obi dị ndị nwụrụ anwụ mma. Ndị ọzọ na-atụ ọnwụ ezigbo ụjọ. Ha chere na onye nwụrụ anwụ anwụbeghị, kama na o nwere ike nọrọ n’ala mmụọ na-ata ahụhụ. Ò nwere ihe ga-enyere ndị a aka ka ha nwere onwe ha, ghara ịna-atụ ụjọ ha na-atụ, ghara ịna-echegbu onwe ha ma ọ bụkwanụ na-emefusị ego ha gaara eji eme ihe ndị ọzọ bara uru? Ee, o nwere. Jizọs Kraịst sị na ọ bụ eziokwu ga-eme ka ha nwere onwe ha. Olee eziokwu nke ọ na-ekwu? Ọ̀ bụ mmadụ ikwu eziokwu ka è nwere ụdị eziokwu ọzọ o bu n’obi?

Jizọs kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịma azịza ajụjụ ndị a. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, . . . unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) ‘Okwu’ Jizọs bụ ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa. Ihe ndị ahụ dịkwa na Baịbụl.

Mgbe Jizọs kwuru na ‘eziokwu ahụ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị,’ ihe ọ na-ekwu bụ na eziokwu ahụ ga-eme ka anyị ghara ịbụkwa ohu mmehie na ọnwụ. Ma, o nwere ihe ndị ọzọ anyị na-agaghị abụ ohu ha ma anyị mara eziokwu Baịbụl na-akụzi. Anyị agaghị ekwere ozizi ụgha, anyị agaghịkwa na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ ma ọ bụkwanụ na-atụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi na ọdụ. Olee otú Baịbụl ga-esi mee ka anyị nwere onwe anyị n’ihe ndị a?

1. Ọ ga-eme ka anyị ghara ikwere ozizi ụgha. Ọtụtụ ndị na-asị na ọ bụrụ na ikwiikwii anọrọ n’akụkụ ụlọ mmadụ na-ebe ubé, ọ pụtara na e nwere onye ga-anwụ n’ebe ahụ. Ha na-asịkwa na mmadụ kpọbiri ụkwụ ma ya na-aga ihe, ọ pụtara na onye ahụ ga-enwe chi ọma ma ọ bụ chi ọjọọ n’ụbọchị ahụ. E nwekwara ndị ọ na-abụ ha nwee ihe ha chọrọ ime, ha eburu ụzọ gaa jụọ ndị dibịa afa ase.

Otú eziokwu Baịbụl na-akụzi ga-esi mee ka ha nwere onwe ha: N’oge ochie, e nwere mgbe ndị Izrel bidoro ikwere ozizi ụgha, nke mere ka ha fewe chi ha kpọrọ “chi Ihu Ọma” na nke ha kpọrọ “chi Akara Aka.” Olee otú Chineke si lee omume ahụ anya? Ọ gwara ha, sị: “Unu nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m.” (Aịzaya 65:11, 12) Otú ahụ o si lee ndị na-efe chi Ihu Ọma na chi Akara Aka anya ka o sikwa lee ndị na-ajụ ndị dibịa afa ase. Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase . . . bụ ihe arụ n’anya Jehova.”—Diuterọnọmi 18:11, 12.

Ozizi ụgha na ịjụ ndị dibịa afa ase jọgburu onwe ha n’ihi na ha bụ ‘atụmatụ aghụghọ Ekwensu,’ onye Jizọs kpọrọ “nna ụgha.” (Ndị Efesọs 6:11; Jọn 8:44) Ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ ime, ị̀ ga-agakwuru onye ụgha ka ọ gwa gị otú ị ga-esi eme ya? Ebe ọ bụ na ị gaghị agakwuru ụdị onye ahụ, ọ dịnụ mma ka ị gbaa mbọ hụ na o nweghị ihe ga-ejikọ gị na “nna ụgha.”

Ihe ga-enyere mmadụ aka ịna-ekpebi ihe dị mma bụ amamihe Chineke na-enye. Otú e sikwanụ enweta ya bụ ịmụ Okwu Chineke. Mmadụ mụọ ya, ya amata iwu Chineke, marakwa ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere Ilu 2:6 ji sị: “Jehova na-enye amamihe; ihe ọmụma na nghọta na-esi n’ọnụ ya apụta.”

2. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ọtụtụ ndị kweere na mmadụ nwụọ, ya aghọọ mmụọ. Ha na-asịkwa na ndị nna nna ha nwụrụ anwụ nwere ike inyere ha aka ma ọ bụkwanụ nyewe ha nsogbu. Ọ bụ ya mere ha ji achụrụ ha àjà, na-eche na ọ bụ ya ga-eme ka obi dị ndị nwụrụ anwụ mma. Ụfọdụ na-agadị ebiri ndị ọzọ nnukwu ego ka ha nwee ike ịchụ àjà ndị ahụ, kpọọkwa ọtụtụ ndị oriri.

Otú eziokwu Baịbụl na-akụzi ga-esi mee ka ha nwere onwe ha: Baịbụl gwara anyị eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na onye ahụ “na-arahụ ụra.” (Jọn 11:11, 14) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ekliziastis 9:5 ga-enyere anyị aka ịghọta ya. Ebe ahụ sịrị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Onye nwụrụ anwụ dị ka onye nọ n’ezigbote ụra. Mmadụ nọrọ n’ezigbote ụra, ọ naghị ama ihe na-emenụ. N’ihi ya, onye nwụrụ anwụ enweghị ike inyere mmadụ aka ma ọ bụkwanụ nye ya nsogbu.

Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na o nwere ebe ha gara hụ onye ha nwụrụ anwụ ebe ọ na-agagharị. Gịnị mere ndị mmadụ ji eche na onye ahụ ha hụrụ bụ onye ha nwụrụ anwụ? Baịbụl gwara anyị ihe kpatara ya. O kwuru na n’oge gboo, e nwere ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. (2 Pita 2:4) Ndị mmụọ ozi ahụ ka Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ọjọọ. Ha anaghị emere ụmụ mmadụ ebere, ha na-emekwa ike ha niile ịhụ na ha duhiere anyị. (1 Timoti 4:1) Otu n’ime ụzọ ha si eduhie ụmụ mmadụ bụ ime onwe ha ka ha yie ndị anyị nwụrụla anwụ, ka ọ ga-abụ anyị hụ ha, anyị ekwere na mmadụ nwụọ ya aghọọ mmụọ.

3. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịtụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi. Ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ bụ eziokwu. Ọ sị na ọnwụ bụ onye iro. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ọ bụ ya mere anyị ji atụ ụjọ ọnwụ, o nweghịkwa onye ọnwụ na-agụ. Ma, nke ahụ ekwesịghị ime ka anyị tụwazie ọnwụ ụjọ na-enweghị isi na ọdụ.

Otú eziokwu Baịbụl na-akụzi ga-esi mee ka ha nwere onwe ha: Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ anwụọla, o kwukwara na Chineke bu n’obi ịkpọlite ha n’ọnwụ. Jizọs sịrị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Kraịst] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

Olee otú ha ga-adị ma a kpọlite ha n’ọnwụ? Ha ga-adị otú ahụ ha dị mgbe ha dị ndụ. Ihe mere anyị ji mara bụ na mgbe Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ, ha dị otú ahụ ha dị tupu ha anwụọ. (Mak 5:35-42; Luk 7:11-17; Jọn 11:43, 44) Ihe a anyị kwuru dabara n’ihe mbilite n’ọnwụ pụtara. Okwu Grik e si sụgharịta “mbilite n’ọnwụ” pụtara ibili ọtọ. Ọ bụ ya mere Chineke ji gwa Daniel bụ́ ohu ya, sị: “Ị ga-ezukwa ike [nke pụtara na ị ga-anwụ], ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” (Daniel 12:13) Ihe a Chineke gwara Daniel mere ka ụjọ ọnwụ ghara ịtụ ya. O mekwara ka obi ruo ya ala.

Otu n’ime ihe Jizọs ji maka ya bịa n’ụwa bụ ikwusara “ndị e ji eji [ya bụ, ndị e ji ozizi ụgha megharịa anya] na ha enwerela onwe ha.” (Luk 4:18, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ebe ọ bụ na ihe ndị ahụ ọ kụziri dị na Baịbụl, ha ka na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha taa. Anyị nwere olileanya na eziokwu Baịbụl na-akụzi ga-eme ka i nwere onwe gị ruo mgbe ebighị ebi.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

Olee otú eziokwu Baịbụl na-akụzi si eme ka anyị

● ghara ikwere ozizi ụgha?—Aịzaya 8:19, 20; 65:11, 12.

● ghara ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ?—Ekliziastis 9:5; Jọn 11:11, 14.

● ghara ịtụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi?—Jọn 5:28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Eziokwu Baịbụl na-akụzi na-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere ozizi ụgha, ghara ịna-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ ma ọ bụkwanụ na-atụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi