Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ịga n’Ụlọ Okpukpe Kpee Ekpere Tupu Chineke Anụ Ya?

Ì Kwesịrị Ịga n’Ụlọ Okpukpe Kpee Ekpere Tupu Chineke Anụ Ya?

Echiche Baịbụl

Ì Kwesịrị Ịga n’Ụlọ Okpukpe Kpee Ekpere Tupu Chineke Anụ Ya?

Ọ NA-ABỤ ọtụtụ ndị chọọ ikpegara Chineke ekpere, ha agaa n’ụlọ okpukpe ha. Ndị ọzọ na-aba ụgbọelu gaa ala nsọ ikpe ekpere. Ì chere na ị ga-agarịrị n’ụlọ okpukpe tupu i kpegara Chineke ekpere? Ka ì chere na i nwere ike ịnọ n’ebe ọ bụla kpegara ya ekpere mgbe ọ bụla ị chọrọ? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Mgbe Chineke kere Adam na Iv, e nweghị ụlọ okpukpe ọ bụla n’ụwa. Ha bi n’ubi mara ezigbo mma. (Jenesis 2:8) Ha na-anọ n’ebe ahụ agwa Chineke okwu. Ka oge na-aga, ụmụ mmadụ bịara hie nne, e nweekwa ndị ezi omume “so ezi Chineke jee ije.” Otu n’ime ha bụ Noa. O nweghị nke ọ bụla n’ime ha na-aga n’ụlọ okpukpe ekpegara Chineke ekpere. (Jenesis 6:9) Ha hụrụ Chineke n’anya, na-ekpegakwara ya ekpere n’agbanyeghị na ha anaghị aga n’ụlọ okpukpe. Ha na ya dịkwa ná mma.

Chineke Anaghị Ebi n’Ụlọ E Ji Aka Wuo

Ndị fere Chineke n’oge ochie ma na ọ bụ ya kere eluigwe na ala, nakwa na ọ naghị ebi n’ụlọ e ji aka wuo. Eze Sọlọmọn jụrụ, sị: “Chineke ọ̀ ga-eso ụmụ mmadụ biri n’elu ala n’ezie?” O kwuru, sị “Lee! Eluigwe, ee, eluigwe nke eluigwe apụghị ịba gị.” (2 Ihe E Mere 6:18) Ụmụ Izrel nwere ụlọikwuu, mechaakwa nwee ụlọ nsọ, bụ́ ebe Chineke gwara ha ka ha na-aga eme ememme ndị ha na-eme kwa afọ. (Ọpụpụ 23:14-17) Ma, ha na-ekpegara Chineke ekpere mgbe ọ bụla ha chọrọ. Dị ka ihe atụ, ha na-ekpe ekpere mgbe ha nọ n’ọhịa na-azụ atụrụ ha, mgbe ha nọ ọrụ n’ubi ha, mgbe ha na ndị ezinụlọ ha nọ, ma ọ bụkwanụ mgbe ha nọ naanị ha.—Abụ Ọma 65:2; Matiu 6:6.

Anyị nwekwara ike ịnọ n’ebe ọ bụla kpegara Chineke ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Onye anyị na-eso ụzọ ya bụ́ Jizọs Kraịst na-agakarị n’ebe dị jụụ ndị mmadụ na-anọghị ma ọ chọọ ikpe ekpere. (Mak 1:35) Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe “ọ pụrụ gaa n’ugwu ka o kpee ekpere, o wee nọgide n’abalị ahụ dum na-ekpeku Chineke ekpere.”—Luk 6:12.

Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye Juu, ọ gara ememme ndị ahụ a na-anọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem eme. (Jọn 2:13, 14) Ma, o kwuru na oge ga-abịa mgbe ndị mmadụ na-agaghịzi na-aga efe Chineke n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ụlọ nsọ ndị Sameria dị n’elu ugwu. Mgbe Jizọs nọ n’akụkụ ugwu ahụ na-agwa otu nwaanyị Sameria okwu, ọ gwara ya, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ọ na-agaghị abụ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem ka unu ga-anọ fee Nna m ofufe.” O kwukwara na ndị na-efe ezi ofufe ‘ga-efe Nna ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.’—Jọn 4:21, 23.

Ihe dị Jizọs mkpa abụghị ụlọ ebe a ga-anọ na-efe Nna ya, kama ọ bụ ka ndị na-efe Nna ya jiri obi ha niile na-efe ya. Ma, ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst, agaghị na-aga efe Chineke n’ụlọ okpukpe? (Ọrụ Ndịozi 11:26) Mba. E nwere ihe mere anyị ji sị mba.

Ndị Ohu Chineke Bụ Otu Ezinụlọ

Ezigbo ndị ohu Chineke bụ otu ezinụlọ. (Luk 8:21) Ezinụlọ udo dị na-emekọ ọtụtụ ihe ọnụ. Dị ka ihe atụ, ha na-erikọ nri ọnụ, nke a na-emekwa ka ha na ibe ha dịkwuo ná mma. Ọ bụ otú a ka Ndị Kraịst na-eme. Ha na-anọkọ ọnụ mụọ Okwu Chineke. Nke a na-eme ka ha na-akpa àgwà ọma, meekwa ka ha na ụmụnna ha dị ná mma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ezigbo Ndị Kraịst ma na izukọ na-amụ Okwu Chineke na-abara ha uru. Ọ na-enyere onye ọ bụla n’ime ha aka ịmụta àgwà ọma ndị ọ na-agaghị amụta ma ọ na-akpa iche. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị a bụ ịhụnanya, ịgbaghara ndị ọzọ, obiọma, ịdị nwayọọ, na udo.—2 Ndị Kọrịnt 2:7; Ndị Galeshia 5:19-23.

Olee ebe Ndị Kraịst oge ochie na-anọ efe Chineke? Ha na-ezukọkarị n’ụlọ ndị mmadụ. (Ndị Rom 16:5; Ndị Kọlọsi 4:15) Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl degaara Faịlimọn akwụkwọ ozi, o kelere ‘ọgbakọ dị n’ụlọ ya.’ *Faịlimọn 1, 2.

Taa, ọ bụghị iwu na Ndị Kraịst ga-anọ ná nnukwu ụlọ a chọrọ oké mma na-efe Chineke, kama, ihe dị ha mkpa bụ ebe ha ga-anọ amụ ihe ahụ́ eruo ha ala, ya abaakwa ndị niile bịaranụ. Ndịàmà Jehova na-anọ n’ụdị ebe ahụ amụ ihe. Ha na-akpọ ya Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ naghịkwa ebu oké ibu. O nwere ike ịbụ na ọ dị n’obodo unu. Anyị anaghị egbu oge ebe ahụ ma anyị gaa ịmụ ihe. Ọ na-abụ anyị ruo, anyị abụọ abụ, kpee ekpere, ma mụọ Baịbụl.

Ndịàmà Jehova anaghị eji ekpere egwu egwu. Ha na-ewepụta oge n’ụbọchị ọ bụla kpegara Chineke ekpere ma mgbe ha na ndị ezinụlọ ha nọ ma mgbe ha nọ naanị ha. Jems 4:8 kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Okwu Grik e si sụgharịta “ọgbakọ” pụtara ndị gbakọrọ na-efe Chineke, ọ pụtaghị ụlọ okpukpe.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Chineke ọ̀ na-ebi n’ụlọ e ji aka wuo?—2 Ihe E Mere 6:18.

● Olee ebe Jizọs nọ kpegara Chineke ekpere n’abalị?—Luk 6:12.

● Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst ji agbakọ?—Ndị Hibru 10:24, 25.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

È nwere ebe ị ga-anọ kpee ekpere tupu Chineke anụ ya?