Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?—Nkebi nke Abụọ

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?—Nkebi nke Abụọ

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi?​—Nkebi nke Abụọ

NÁ NKEBI NKE MBỤ, anyị kwuru ihe abụọ i kwesịrị ịma.

● Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ịgbawa gị obi ma ọ bụkwanụ gịnwa agbawaa ya obi.—Ilu 6:27.

● Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ime ka gị na ya gharazie ịdị ná mma. *Ilu 18:24.

N’ISIOKWU A, anyị ga-atụle

● Ihe nke atọ i kwesịrị ịma ma ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi

● Otú ị ga-esi mara mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị si n’ikute anwụrụ baa ime ahịa

IHE I KWESỊRỊ ỊMA: Ọ bụrụ na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa gị na ya dị ná mma erie gị obi mgbe ị na-achọwabeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ime ka i nwee aha ọjọọ. Ngozi * sịrị: “Ụfọdụ ụmụ okorobịa bụ anya ahụ nwaanyị, nwa agbọghọbịa ọ bụla ha hụrụ ha emete ya enyi. Nke ọ bụla n’ime ha ga na-eche na nwa okorobịa ahụ na-esogharị ya hụrụ ya n’anya. Ma, naanị ihe bụ mkpa nwa okorobịa ahụ bụ ka ha abụọ dịrị ná mma.”

Ajụjụ ị ga-echebara echiche:

● Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpachi anya, olee otú ndị mmadụ nwere ike isi na-ele gị anya?

Otu nwa agbọghọbịa aha ya bụ Adaeze kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-ezigara nwa okorobịa ozi n’ekwentị ma ọ bụ n’Ịntanet, o nwere ike ibutere gị aha ọjọọ. Ná mmalite, o nwere ike gị nọtụ, gị ezigara ya ozi. Ma, tupu gị amara ihe na-emenụ, i bidola zigawara ya ozi mgbe niile ma ọ bụdị bido zigawara ọtụtụ ndị ozi. Ị gaghị ama mgbe gị na ụmụ okorobịa atọ malitere ịkpa. Onye nke ọ bụla n’ime ha ga na-eche na ọ bụ yanwa ka ị hụrụ n’anya. Ma, ha mechaa chọpụta ihe ị na-eme, obi na-agbawa ha. Ihe ha ga-eji mara gị bụ na ị na-achụ ụmụ nwoke.”

Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.”—Ilu 20:11.

Ihe anyị na-ekwu bụ: Ọ bụghị ihe ọjọọ ma gị na ndị na-abụghị ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ibe gị dịrị ná mma. Ma, ọ bụrụ na i lezighị anya, i nwere ike ime ihe ga-agbawa gị obi. I nwekwara ike ime ihe ga-eme ka gị na onye ahụ ghara ịdị ná mma ma ọ bụkwanụ ihe ga-ewetara gị aha ọjọọ.

Olee otú ị ga-esi mara mgbe unu si n’ikute anwụrụ baa ime ahịa? Otu n’ime ụzọ ị ga-esi mara bụ ma ọ bụrụ na ọ bụ onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ka ị na-akọrọ ihe ị na-agaghị akọrọ onye ọzọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna sịrị: “Ọ bụrụ na gị na nwa okorobịa bụ enyi nkịtị, o kwesịghị ịbụ onye mbụ ị ga-achọ ịgwa okwu n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ onye mbụ ị ga-akọrọ ihe ndị dị mkpa. Ọ bụghịkwa obi jọhaala gị njọ, gị agakwuru ya ka ọ kasie gị obi.”

Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

● Gịnị mere i ji chee na o nweghị ihe o mere ma i nwee onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ị ga na-akọrọ ihe ị na-agaghị achọ ịkọrọ onye ọzọ? Ma, olee nsogbu ndị dị na ya?

Nneka kwuru, sị: “E nwere ụmụ okorobịa ndị mụ na ha dị ná mma, ma, mụ na ha anaghị akpachi anya. Mụ na ha anaghị ekwute okwu aka n’ekwentị otú mụ na ndị enyi m nwaanyị si ekwu. O nwekwara ihe ụfọdụ m na-anaghị akọrọ ha.”

Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya. Onye na-agbape ọnụ ekwu okwu—mbibi ga-abụ nke ya.”—Ilu 13:3.

Ị̀ ma na ịkọrọ onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ihe niile gbasara onwe gị nwere ike ịkpatara gị nsogbu? Ọ bụrụ na gị na ya emechaa see, ị̀ ga-asị na a sị na ị ma, ị garaghị akọrọ ya ihe ndị ahụ?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ezinne sịrị: “Ekwola na mmadụ abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gbawara ya ọsọ. Ma, aghọla onwe gị aghụghọ na-ekwu na gị na ya bụ enyi nkịtị ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ i buuru ya n’obi. Ị ga-ezere ọtụtụ nsogbu ma ọ bụrụ na ị na-ejide onwe gị.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ị chọọ ịgụkwu ebe a tụlere isiokwu a, gụọ Teta! Julaị–Septemba 2012, peeji nke 15-17.

^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe dị na peeji nke 11]

IHE MERE EME: Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nkechi kwuru, sị: “O nwere mgbe mụ na otu nwa okorobịa na-akpa. Ihe na-adabakwara mụ na ya. Ma, m chọpụtara na ka oge na-aga, nkata mụ na ya na-adịzi ogologo, na-abakwa ime ime. Mụ na ya bịara dị n’ezigbo mma nke na ọ na-akọrọ m ihe niile na-enye ya nsogbu. Otu ụbọchị, ya ezitere m ozi na kọmputa gwa m na ya hụrụ m n’anya. Ozi a o ziteere m riri m ọnụ. Ihe a o kwuru mere ka isi kopu m. O nweghị onye ọ na-anaghị adị mma ma a gwa ya na a hụrụ ya n’anya. Ma, obi ezughị m ike. M chọpụtara na enyi nkịtị a m chere na anyị bụ enweghị isi ebe ọ bụ na yanwa bu ihe ọzọ n’obi. Ama m na ọ ga-ewute ya ma m gwa ya na anyị etorubeghị ichewe ịbụ di na nwunye. Agwara m papa m na mama m ihe na-aganụ. Ha agwa m na mụ na ya ekwesịghị ịna-akpa. Ihe a merenụ mere ka o doo m anya na nwa agbọghọbịa na nwa okorobịa malitehaala ịkpa, ọ naghị esi ike ha esi n’ikute anwụrụ baa ime ahịa. Kemgbe ahụ, m na-akpachazi anya n’ihe ọ bụla gbasara mụ na nwa okorobịa, nke ka nke, ma mụ na-ede ozi m chọrọ izigara ya. Ọ na-adịkwa mma ka nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa na-anọ n’ebe ndị ọzọ nọ, kama ịnọ naanị ha. Ọ bụrụ na ha anọrọ n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ ga-eme ka mkparịta ụka ha ghara ịna-aba ime ime nakwa ka ha ghara ichewe ihe ọzọ.”

[Igbe dị na peeji nke 12]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Gakwuru papa gị na mama gị, jụọ ha ihe ha chere gbasara ajụjụ ndị ahụ a ga-echebara echiche. Ihe ha kwuru ọ̀ dị iche na nke gị? Olee ihe dị iche na ha abụọ? Gịnị mere ihe ha kwuru ji dị mma?—Ilu 1:8.

[Igbe/​Foto ndị dị na peeji nke 12]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Andre—Ọ bụrụ na gị na nwa agbọghọbịa na-anọkarị, unu ga-abịa hụ ibe unu n’anya, ya echee na ị chọrọ ịlụ ya. Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị ị chọrọ ibu ụzọ mee tupu gị alụọ nwaanyị, emela ka ị̀ chọwala ịlụ nwaanyị.

Cassidy—Mụ na ndị mmadụ dị n’ezigbo mma. M na-enwekarị mmasị ịnọ ebe ụmụ okorobịa nọ n’ihi na e nwere ọtụtụ ụmụ okorobịa n’ebe anyị bi. Ma, ị manụ na ọ naghị adịcha mma nwa agbọghọbịa na ụmụ okorobịa ịna-anọkarị. Anaghị m emeso ụmụ okorobịa ihe otú m si emeso ndị enyi m nwaanyị n’ihi na o nwere ike ime ka ha chewe ihe ọzọ. M na-ewere ha otú m si were ụmụnne m ndị nwoke.

[Igbe dị na peeji nke 13]

IHE NDỊ NNE NA NNA KWESỊRỊ ỊMA

Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa dịrị ná mma. Ma, ndị na-erubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị kwesịrị ịkpachara anya. * Ha na ndị na-abụghị nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ekwesịghị isi n’ikute anwụrụ baa ime ahịa.

Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa erie ibe ha obi mgbe ha na-achọwabeghị ịbụ di na nwunye? Obi nwere ike ịdị ha mma ná mmalite, ma ọ ga-emecha kpatara ha obi mgbawa. E nwere ike iji ya tụnyere ịnọ n’ụgbọala na-enweghị ụkwụ. Ha abụọ ga-emecha chọpụta na o nweghị ebe ha ji azụ aga. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike kpawa na nzuzo, bụ́kwanụ ihe nwere ike ime ka ha kpaa àgwà ọjọọ. Ndị ọzọ na-akwụsị ịkpa, nke ga-eme ka onye nke ọ bụla n’ime ha chewe na e mejọọla ya. O nwekwara ike ime ka obi na-ajọ ya njọ, ya ana-echegbu onwe ya. Olee otú unu ga-esi nyere nwa unu aka ka ya na onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ghara ịna-akpachi anya mgbe ọ na-etorubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị?—Ekliziastis 11:10.

Ihe ga-enyere unu aka bụ unu na nwa unu ịna-ekwurịta gbasara onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya dị ná mma. Ọ ga-eme ka unu mara ihe na-aganụ, marakwa mgbe unu kwesịrị inyere ya aka ma ya chọọ isi n’ikute anwụrụ baa ime ahịa.

Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị ama mgbe ha ji eme ka o siere nwa ha ike ịkọrọ ha otú ya na onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya si aga. Lee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto kwuru mgbe a gbara ha ajụjụ ọnụ.

“M na-achọkarị ịgwa mama m gbasara nwa okorobịa m hụrụ n’anya, ma anaghị m agwa ya n’ihi na o nwere ike ịkpasu ya iwe.”—Adamma.

“Ọ na-abụ m gwa mama m na o nwere nwa okorobịa mụ na ya dị ná mma, ya asị m atụla anya na ya ga-abịa agbamakwụkwọ anyị, kama ịsị m kọọrọ ya gbasara onye ahụ ma ọ bụkwanụ jụọ m ihe mere m ji hụ ya n’anya. A sị na mama m na-ajụ m gbasara onye ahụ, m gaara na-ege ya ntị.”—Nwakaego.

E nwekwara ndị na-eto eto ọ na-abụ ha na-agwa ndị mụrụ ha ihe bụ́ mkpa ha, ndị mụrụ ha ana-ege ha ntị. Lee ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru.

“Mgbe m gwara papa m na mama m na o nwere nwa okorobịa m hụrụ n’anya, ha ebidoghị bawara m mba. Ha ghọtara ihe mụ na ya na-alụ ma gwa m okwu ruru m n’obi. Nke a emeela ka ọ dịrị m mfe ịna-eme ihe ha gwara m, meekwa ka m na-akọrọ ha obi m.”—Obiageri.

“Mgbe papa m na mama m kọọrọ m gbasara onye ha hụrụ n’anya mgbe ha na-eto eto, nakwa ihe mere ha ji tisaa, o nyeere m aka ịghọta na o nweghị ihe o mere ma m kọọrọ papa m na mama m gbasara nwa okorobịa m hụrụ n’anya.”—Chioma.

Ma, cheta na e nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa kpawa mgbe ha na-erubeghị ịbụ di na nwunye. Lee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto kwuru.

“O nwere nwa okorobịa mụ na ya na-akpa na nzuzo. Ihe mere m ji kweta ka anyị kpawa bụ na ọ na-eme ihe ndị na-eme m obi ụtọ. Ọ na-egekwa m ntị ma m kwuwe okwu.”—Ulumma.

“E nwere nwa okorobịa ihe ya na-amasị m. Ihe mere ihe ya ji amasị m bụ na ọ na-ege m ntị ma m kọwara ya nsogbu m. Obi na-adị m ụtọ ma mmadụ na-ege m ntị otú a n’agbanyeghị ihe m na-agwa ya.”​—Oluchi.

“Obi na-adị m ụtọ ma papa m na mama m gwa m na m mara mma ma ọ bụkwanụ na ihe m yi dị m mma n’ahụ́. Ọ bụrụzie na mụ apụọ nwa okorobịa agwa m ụdị ihe a, anaghị m etinye ya obi.”—Chinyere.

Ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị:

Gịnị ka m ga-eme ka nwa m na-akpakwu m nso?—Ndị Filipaị 4:5.

M̀ bụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa”?—Jems 1:19.

Gịnị ka m ga-eme ka ọ dịrị nwa m mfe ịkọrọ m obi ya kama ịkọrọ ya ndị ọzọ?—Ndị Kọlọsi 3:21.

Ihe anyị na-ekwu bụ: Nyere nwa gị na-eto eto aka ịma ihe ọ ga-eme ka ya na nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa ya na ya dị ná mma ghara isi n’ikute anwụrụ baa ime ahịa. Ihe unu na-akụziri ya ga-abara ya uru ma ugbu a ma mgbe o toro.—Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 37 Gụọ isiokwu bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, “Mụ na Ya Ọ̀ Bụ Enyi Nkịtị Ka Ò Nwere Ihe Ọzọ M Bu n’Obi? Nkebi nke Mbụ,” nke gbara na Teta! Julaị–Septemba 2012 nakwa nkebi nke abụọ, nke dị na magazin a.

[Chaatị dị na peeji nke 11]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

IHE Ị GA-EME NA IHE Ị NA-AGAGHỊ EME

MEE EMELA

unu na ndị ọzọ na-anọ  X naanị gị na ya anọla

gbalịa mara ndị ọzọ  X akọrọla ya ihe nzuzo

gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka  X emela ka ị̀ ga-alụ ya

[Ihe Osise dị na peeji nke 12]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

UNU NA NDỊ ỌZỌ NA-ANỌ

EMELA KA Ị̀ GA-ALỤ YA

AKPATỤLA YA AKA

EJIDELA YA AKA

ESUSULA YA ỌNỤ