Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị M Ga-achọ Ịdị Ka Ha?

Ole Ndị M Ga-achọ Ịdị Ka Ha?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ole Ndị M Ga-achọ Ịdị Ka Ha?

N’isiokwu a, ị ga-ama

IHE MERE i kwesịrị iji nwee ndị ị ga-achọ ịdị ka ha

EBE ị ga-ahụ ha

IHE Ị GA-EME ka ị dị ka ha

IHE MERE I KWESỊRỊ IJI NWEE NDỊ Ị GA-ACHỌ ỊDỊ KA HA

NKE BỤ́ EZIOKWU BỤ NA ọ bụrụ na ihe mmadụ amasị gị, ị ga-achọ ịdị ka ya ma ọ̀ bụ ezigbo mmadụ ma ọ̀ bụ ajọ mmadụ.

Ndị ị ga-achọ ịdị ka ha kwesịrị ịbụ ndị na-akpa àgwà ọma.—Ndị Filipaị 3:17.

Nsogbu ọtụtụ ndị na-enwe bụ na ha na-achọ ịdị ka ndị a ma ama, dị ka ndị na-akụ egwú, ndị na-agba bọl, ma ọ bụ ndị na-eme fim, a sịgodị na àgwà ha adịghị mma.

Ihe ị ga-echebara echiche: Baịbụl ji àgwà anyị tụnyere uwe. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ọ bụrụ na ị gara ịzụ uwe ma hụ na ejiji onye na-ere ya adịghị mma, ị̀ ga-achọ ka ọ họtara gị nke ị ga-azụ? Gịnịzi mere ị ga-eji kwere ka onye àgwà ya na-adịghị mma na-agwa gị ihe ị ga na-eme naanị maka na ọ bụ onye a ma ama? Kama ịna-eme otú ahụ ma ọ bụ na-eme ka ndị na-anaghị akpa ezigbo àgwà, ọ bụrụ na i nwee ezigbo mmadụ ị ga-achọ ịdị ka ya, ọ ga-enyere gị aka (1) ịma àgwà ọma ndị ị ga na-akpa. (2) Ọ ga-enyekwara gị aka ịkpa àgwà ka onye ahụ.

EBE Ị GA-AHỤ HA

Kanye n’eziokwu ma ọ bụkwanụ n’ụgha n’ihe a e kwuru n’okpuru ebe a:

1. Onye ị ga-achọ ịdị ka ya kwesịrị ịbụ onye gị na ya hụtụrụla ihu na ihu.

Eziokwu Ụgha

2. Onye ị ga-achọ ịdị ka ya kwesịrị ịna-emete ihe niile.

Eziokwu Ụgha

3. I nwere ike inwe ọtụtụ ndị ị ga-achọ ịdị ka ha.

Eziokwu Ụgha

Azịsa Ha

1. Ụgha. Ndị ị ga-achọ ịdị ka ha nwedịrị ike ịbụ ndị dịrị ndụ n’oge ochie. E kwuru banyere ọtụtụ n’ime ha na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ị gụọ Ndị Hibru isi iri na otu, ị ga-ahụ na Pọl onyeozi kpọrọ aha mmadụ iri na isii anyị kwesịrị ịdị ka ha. N’isi nke iri na abụọ, ọ gwara Ndị Kraịst ka ha “na-elegide anya” n’ebe Jizọs nọ ma na-eme ka ya. (Ndị Hibru 12:2) Jizọs bụ onye mbụ anyị kwesịrị ịdị ka ya.—Jọn 13:15. *

2. Ụgha. A bịa ná ndị niile anyị kwesịrị ịchọ ịdị ka ha, ọ bụ naanị Jizọs zuru okè. (Ndị Rom 3:23) N’agbanyeghị na Ịlaịja bụ onye amụma obi kara, Baịbụl kwuru na ọ bụ “mmadụ ibe anyị.” (Jems 5:17, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Otú ahụkwa ka ọ dị Miriam, Devid, Jona, Mata, na Pita. Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ha mejọrọ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe dị mma ha mere, nke mere ka ha bụrụ ndị e ji ama atụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị ka ha.

3. Eziokwu. I nwere ike inwe ọtụtụ ndị ị ga-achọ ịdị ka ha. O nwere ike ịbụ na otu onye n’ime ha na-arụsi ọrụ ike, onye nke ọzọ abụrụ onye na-edi ihe. O nwekwara ike ịbụ na n’agbanyeghị otú ihe si sie ike, onye nke ọzọ na-enwe olileanya na ihe ga-emecha dị mma. (1 Ndị Kọrịnt 12:28; Ndị Efesọs 4:11, 12) Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’àgwà ọma ndị mmadụ nwere, ị ga-ahụ àgwà ọma ndị ị ga-achọ ịmụta.—Ndị Filipaị 2:3.

IHE Ị GA-EME KA Ị DỊ KA HA

1. Na-ele otú ndị ị ga-achọ ịdị ka ha si eme ihe. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst n’oge ochie, sị: ‘Na-elegidenụ anya ná ndị na-eje ije dị ka ihe nlereanya anyị hapụụrụ unu si dị.’—Ndị Filipaị 3:17.

2. Gị na ha na-akpa. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, na-agakwuru ndị ahụ ị ga-achọ ịdị ka ha ka gị na ha na-anọrị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.

3. Chebara àgwà ọma ndị ha na-akpa echiche. Baịbụl kwuru, sị: “Tụleenụ otu ndụ ha siri dị. Na-eṅomikwanụ okwukwe ha.”—Ndị Hibru 13:7, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ugbu a, ka anyị kwuo otú ị ga-esi eme ya. N’okpuru ebe a, dee gbasara onye ị ga-achọ ịdị ka ya.

Ihe Ị Ga-eme

Họrọ otu àgwà ị ga-achọ ịmụta. Dị ka ihe atụ, ị̀ ga-achọ ka gị na ndị mmadụ dịkwuo ná mma? Ị̀ ga-achọ ịna-emesapụkwu aka? Ị̀ ga-achọ ịna-arụsikwu ọrụ ike? Ị̀ ga-achọ ịna-edikwu ihe? Ị̀ ga-achọ ka a na-atụkwasịkwu gị obi?

․․․․․

Họrọ otu onye nwere àgwà ị ga-achọ ịmụta. *

․․․․․

Ọ bụrụ na i nwee ezigbo mmadụ ị ga-achọ ịdị ka ya, ọ pụtaghị na ị ga na-eme ka onye ahụ n’ihe niile. Ị ka ga-enwekwa àgwà ọma ndị e ji mara gị. Ma, ọ bụrụ na i nwee ezigbo mmadụ ị ga-achọ ịdị ka ya, ọ ga-enyere gị aka ma ugbu a ị na-eto eto ma mgbe ị ghọrọ dimkpa. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ị na-eme ka ya, ndị ọzọ ga-achọkwa ịdị ka gị.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwekwara ọtụtụ ndị taa i nwere ike ịdị ka ha. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịdị ka papa gị ma ọ bụ mama gị, nwanne gị, nwanna nọ n’ọgbakọ unu ma ọ bụkwanụ nwanna ọzọ àgwà ya dị mma. O nwere ike ịbụ na ị ma onye ahụ ma ọ bụkwanụ na ị gụrụ banyere ya n’akwụkwọ.

^ par. 32 I nwekwara ike ịmalite na nke ikpeazụ. Buru ụzọ họrọ onye ị ga-achọ ịdị ka ya. Jụzie onwe gị, sị, ‘Olee àgwà ọma onye ahụ nwere, nke mere ka ọ bụrụ onye m ga-achọ ịdị ka ya?’ I chee na i kwesịrị ịdị ka onye ahụ, gbalịa mụta àgwà ahụ ọ na-akpa.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 17]

Gịnị mere ị ga-eji kwere ka onye àgwà ya na-adịghị mma na-agwa gị ihe ị ga na-eme naanị maka na ọ bụ onye a ma ama?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Layla—O nwere otu enyi m aha ya bụ Sandra. E nwee nsogbu, obi na-esi ya ike na ihe ga-adị mma. Ọ makwa Baịbụl nke ọma. N’ihi ya, o yiri ka ọ na-ama ihe a ga-eme mgbe ọ bụla e nwere nsogbu. Ọ bụ ya mere mgbe ọ bụla m nwere nsogbu, mụ agaa kọọrọ ya.

Terrence—Kyle na David bụ ndị enyi m. Ha anaghị eleghara nsogbu ndị mmadụ anya. Mmadụ jiri nsogbu ya bịakwute ha, ha na-ahapụgodi nsogbu nke ha nyere onye ahụ aka. M ga-achọ ịdị ka ha.

Emmaline—M chọrọ ịdị ka mama m. Ọ ma Baịbụl nke ọma. Ọ na-agwakwa onye ọ bụla ọ hụrụ ihe ọ mụtara na Baịbụl. Ọ naghị eji ozi ọma egwu egwu n’ihi na ọ ma na ọ bụ ihe ùgwù. M ga-achọ ịdị ka ya.

[Igbe dị na peeji nke 19]

IHE ỌZỌ I NWERE IKE IME

Ị̀ chọrọ ịma otú ị ga-esi achọta ndị dị mma ị ga-adị ka ha? Gụọ Ndị Hibru isi 11 ma họrọ otu n’ime ndị a kpọrọ aha ebe ahụ nke ị ga-achọ ịdị ka ya. O nwere ike ịbụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị gbasara àgwà ọma ndị onye ahụ nwere, gbalịakwa mụta àgwà ọma ndị ahụ.

Ị gụọ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nke mbụ na nke abụọ, ị ga-ahụ ndị ọzọ kpara àgwà ọma, ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ị gaa n’ime azụ mkpo akwụkwọ ndị ahụ, ị ga-ahụ isiokwu bụ́ “Ebe E Dere Ndị M Ga-eṅomi.” Ọ bụ ebe ahụ ka e dere aha ụfọdụ n’ime ndị ahụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ abụọ ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 19]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA?

Gakwuru papa gị na mama gị jụọ ha ndị ha chọrọ ịdị ka ha mgbe ha hà ka gị, jụọkwa ha ndị ha chọrọ ịdị ka ha ugbu a. Olee uru inwe ndị ha chọrọ ịdị ka ha baara ha?