Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ndị Ga-akwụsị?

Olee Nsogbu Ndị Ga-akwụsị?

Olee Nsogbu Ndị Ga-akwụsị?

“Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha.”

“Ọ dịghị onye bi na [Paradaịs] nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”

“Ọnwụ agaghị adị ọzọ.”

IHE ndị a e kwuru n’elu nwere ike ịdị ụfọdụ ndị ka hà bụ akụkọ ifo. Ma, ha abụghị akụkọ ifo. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ maka na nkwa ndị a dị na Baịbụl. * Ọ bụghị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwere ha. Ị manụ na ha agaghị emeli ka ụwa anyị a dị mma.

Ọtụtụ ndị chere na Baịbụl bụ akwụkwọ mgbe ochie nke na-agbasaghị anyị taa. Ì chere na ihe a ha na-ekwu bụ eziokwu? Ọ́ gaghị adị mma ma ị marakwuo ihe dị na Baịbụl? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị Baịbụl bụ akwụkwọ kọrọ otú mmadụ si malite. O kwukwara ihe ndị na-esonụ:

● Otú ihe si malite isiri ụmụ mmadụ ike.—Ndị Rom 5:12.

● Otú Chineke ga-esi mee ka ihe dị mma.—Jọn 3:16.

● Ihe mere na ọchịchị ụmụ mmadụ agaghị emeli ka ụwa anyị a dị mma.​—Jeremaya 10:23.

● Ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-eme ka ihe dị mma.—Jọshụa 23:14.

Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke ga-akwụsị agụụ, agha, ọrịa, na ọnwụ n’ụwa a? Ọ gaghị esiri gị ike ikweta na ọ ga-akwụsị ha ma ọ bụrụ na i kweta na ihe ndị na-esonụ bụ eziokwu:

1. Ọ bụ Chineke kere anyị.

2. Ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.

3. Ọ ga-akwụsịli ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa a.

4. O bu n’obi ịkwụsị ha.

Ò nwere ihe ndị gosiri na ihe anọ a bụ eziokwu? Ọ bụrụ na gị na Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebipụta magazin a, amalite ịmụ Baịbụl, ị ga-amara ihe mere ihe anọ a ji bụrụ eziokwu.

O nwere ike ịbụ na i nwere Baịbụl, ma, ị naghị agụ ya mgbe niile, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị naghịdị agụ ya. O nwere ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl, ma, ha asị na ha anaghị aghọta ya. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu, gwa Ndịàmà Jehova ka gị na ha malite ịmụ Baịbụl. Ha na ọtụtụ ndị na-amụ Baịbụl n’ụwa niile. Olee otú ha si eme ya?

Ị chọọ, otu Onyeàmà Jehova ma ọ bụ Ndịàmà Jehova abụọ nwere ike ịbịa ka gị na ha nọrọ n’ụlọ gị na-amụ Baịbụl kwa izu. Ha nwekwara ike ịna-abịakwute gị n’ebe ọ bụla ọzọ ị chọrọ. Ha agaghịkwa ana gị ego ọ bụla. Gị na ha malite ịmụ Baịbụl, ị ga-amata azịza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere anyị ji ata ahụhụ? Gịnị mere o ji esiri ndị ọchịchị ike ime ka ihe dị mma? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Oleekwa otú Alaeze ahụ ga-esi meere anyị ihe ọchịchị mmadụ na-enweghị ike imere anyị? *

Ị chọọ ịmatakwu otú gị na Ndịàmà Jehova ga-esi malite ịmụ Baịbụl, jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’obodo unu ma ọ bụkwanụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com. I nwekwara ike iji otu n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke ise na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ebe e si nweta ihe ndị ahụ e dere n’elu bụ n’akwụkwọ Aịzaya 2:4; Aịzaya 33:24; nakwa ná Mkpughe 21:4.

^ par. 18 Gụọkwa isiokwu bụ́ “Echiche Baịbụl: Ònye Ga-emeli Ka Ihe Dị Mma n’Ụwa A?” nke dị na peeji nke 26 na nke 27 na magazin a.