AJỤJỤ ỌNỤ | PAOLA CHIOZZI
Ihe Onye Mụrụ Banyere Ihe Ndị Dị Ndụ Kwuru Gbasara Chineke
Paola Chiozzi bụ ọkà mmụta n’ihe gbasara ihe ndị dị ndụ. Ọ na-arụ na mahadum Ferara dị n’Ịtali, ọ karịakwala afọ iri abụọ ọ rụwara ọrụ a. N’isiokwu a, ị ga-ahụ ihe ndị na-ede Teta! jụrụ ya gbasara sayensị na Chineke, hụkwa ihe ọ sara ha.
Gịnị ka ị ga-achọ ịgwa anyị gbasara onwe gị?
Papa m na mama m anwụọla. Ma, mgbe ha nọ ndụ, ọrụ papa m bụ imeziri ndị mmadụ akpụkpọ ụkwụ, nke mama m abụrụ ọrụ ugbo. N’oge ahụ, achọrọ m ịbụ ọkà mmụta sayensị. Mgbe ọ bụla m hụrụ okooko osisi, obi ana-atọ m ụtọ. Otú ahụkwa ka ọ na-adị m ma m hụ ụmụ nnụnụ na ụmụ ahụhụ. O doro m anya na ọ bụghị mmadụ kere ha.
Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na i kweere na Chineke kemgbe ị dị obere?
Mba. Ọ bụdị mgbe ahụ m dị obere ka m bidoro nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị. Papa m nọkatara otu ụbọchị obi akụchie ya, ya anwụọ. Ihe a mere ya mere ka m chewe ihe mere Onye a kere ọmarịcha ihe a niile ji gba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, na-anwụsị.
Sayensị ò merenụ ka ị mata ihe kpatara ya?
O meghị. Mgbe m malitere ịmụ gbasara mkpụrụ ndụ, achọpụtara m na mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ na-eme nke oge ya ruru, ya anwụọ, nke ọhụrụ anọchie ya. Ya nwee onye nke ya nwụrụ mgbe oge ya erubeghị, ya akpatara ya etuto ma ọ bụkwanụ ahụ́ ya ana-aba ọnyá. O tebeghị anya ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara ihe a. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịma gbasara ya dị ezigbote mkpa.
Olee ihe mere i ji sị na ọ dị ezigbote mkpa?
Mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ anyị dị nde kwuru nde, o nweghịkwa nke n’ime ha anyị na-ahụ anya. Mee elu mee ala, ha niile ga-anwụcha, ndị ọzọ anọchie ha. Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla nwere mgbe ọ ga-anọru, ya anwụọ. O nwere ndị nke na-anọ izu ole na ole, nwekwa ndị nke na-anọ afọ ole na ole. Ọ bụrụ na ahụ́ anyị anaghị arụ ọrụ nke ọma otú o kwesịrị, mkpụrụ ndụ ndị dị anyị n’ahụ́ nwere ike nwụsịchaa mgbe oge ha erubeghị. O nwekwara ike mee ka a ghara inwe mkpụrụ
ndụ ọhụrụ ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ.Ya dị otú ahụ, gịnị nwere ike ime?
Ndị ọkachamara achọpụtala na ọ bụrụ na mkpụrụ ndụ ndị dị mmadụ n’ahụ́ anọfee mgbe ha kwesịrị ịnwụ, ọrịa kansa ma ọ bụ ogbu na nkwonkwo nwere ike malite inye onye ahụ nsogbu. Ha chọpụtakwara na ọ bụrụ na ha anọrughị mgbe ha kwesịrị ịnwụ, ụkwụ na aka nwere ike malite ịna-ama onye ahụ jijiji ma ọ bụkwanụ ụbụrụ agaghịzi na-akpakọ ya ọnụ. Ọrụ m bụ ịchọpụta otú e nwere ike isi gwọọ onye na-arịa ọrịa ndị a.
Ihe ị chọpụtara gbasara mkpụrụ ndụ ò nwere ihe ọ kụziiri gị?
Ịgwa gị eziokwu, ọ gbagwojuru m anya. I lee otú ihe niile dị n’ahụ́ mmadụ sị na-arụ ọrụ nke ọma, ị ga-achọpụta na onye kere anyị chọrọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike mgbe niile. Ma, ihe m na-amaghịzi bụ ihe mere mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-anwụ ka ọkụkọ.
Ma obi siri gị ike mgbe ahụ na e nwerịrị onye kere mkpụrụ ndụ ma hazie otú ha si na-arụ ọrụ, ọ̀ kwa ya?
Ee. Otú o si arụ ọrụ dị egwu, o gosikwara na onye kere ha karịrị mmadụ. Ekwetasiri m ike na ọ bụ Chineke kere ha ma hazie otú ha si arụ ọrụ. Mgbe m ji ọkpọka onyokomita nyoo otú mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ si arụ ọrụ, achọpụtara m na ha na-eji aka ha egbu onwe ha ma oge ha ruo. Otú ihe niile a si aga n’anya ha n’anya ha dị nnọọ egwu.
Ebe ọ bụ na ahụ́ anyị na-eji aka ya ewepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ndị ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ, mmadụ kwesịrị ịna-adị ndụ ebighị ebi
I kwuburu na ị maghị ihe mere Chineke ji hapụ ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ma na-anwụ. Olee otú i si mechaa mata ihe kpatara ya?
N’afọ 1991, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ m, mụ ajụọ ha ihe mere mmadụ ji na-anwụ anwụ. Ha emepee Baịbụl, gụọrọ m Ndị Rom 5:12, bụ́ ebe sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.” A sị na Adam enupụrụghị Chineke isi, ọ garaghị anwụ. Ihe a Baịbụl kwuru mere mụ aghọtakwuo ihe m chọpụtara gbasara mkpụrụ ndụ. Ịgwa gị eziokwu, Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. Ebe ọ bụ na ahụ́ anyị na-eji aka ya ewepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ndị ga-anọchi ndị nke nwụrụ anwụ, ị́ hụghị na mmadụ kwesịrị ịna-adị ndụ ebighị ebi?
Gịnị mere i ji kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke?
O nwere ihe Abụ Ọma 139:16 kwuru gbasara Chineke. Ebe ahụ sịrị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” Achọpụtara m na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu n’ihi na ọ bụ ná mkpụrụ ndụ dị anyị n’ahụ́ ka Chineke deturu otú akụkụ ahụ́ anyị niile ga-esi na-arụ ọrụ. Ma, ihe juziri m anya bụ otú onye dere Abụ Ọma 139:16 si mara ihe a. Ihe a na ihe ndị ọzọ m gụtara na Baịbụl mere ka m kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke.
Olee otú i si mechaa matakwuo ihe Baịbụl na-akụzi?
Otu Onyeàmà Jehova gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl, mụ ekweta. Ka anyị na-amụ ihe, achọpụtara m ihe mere Chineke ji gba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Amụtakwara m na Chineke ga-emecha mee “ka ọnwụ ghara ịdịkwa ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 25:8, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Onye kere anyị ga-eme ka ahụ́ anyị bidoghachi ịrụ ọrụ otú o kwesịrị ịrụ. Mgbe ahụzi ka anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu.
Ò nweela mgbe i ji ihe ndị a ị mụtara na Baịbụl nyere ndị ọzọ aka?
N’afọ 1995, aghọrọ m Onyeàmà Jehova. Kemgbe ahụ, ana m agbalị iji ohere ọ bụla dapụtaranụ gosi ndị mmadụ ihe ndị m mụtara na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwaanyị mụ na ya na-arụ otu ebe. Nwanne ya nwoke gburu onwe ya. Ndị chọọchị nwaanyị a gwara ya na Chineke emekataghị gbaghara onye gburu onwe ya. M sapetara Baịbụl gụọrọ ya nkwa Chineke kwere na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) Ihe ahụ m gụụrụ ya medara ya obi, meekwa ka ọ ghọta na ihe banyere anyị na-emetụ onye kere anyị n’obi. Mgbe ọ bụla m kọọrọ mmadụ ihe Baịbụl kwuru, obi na-atọ m ezigbo ụtọ karịa otú ọ na-atọ m ma ọ bụrụ ihe gbasara sayensị ka m kọọrọ onye ahụ.